Mee 6-12
ABỤ ỌMA 36-37
Abụ nke 87 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. “Ewerela Ndị Na-eme Ihe Ọjọọ Iwe”
(Nkeji 10)
Ndị ajọ omume na-eme ihe na-agbawa anyị obi, na-emekwa ka anyị na-ahụsi anya (Ọma 36:1-4; w17.04 10 ¶4)
Iburu “ndị na-eme ihe ọjọọ” iwe n’obi nwekwara ike ịkpatara anyị nsogbu (Ọma 37:1, 7, 8; w22.06 10 ¶10)
Ịtụkwasị nkwa ndị Jehova kwere obi na-eme ka obi ruo anyị ala (Ọma 37:10, 11; w03 12/1 14 ¶20)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘M̀ na-elekarị tigbuo zọgbuo ndị a na-egosi n’akụkọ ụwa?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Ọma 36:6—Ọ̀ ga-abụ gịnị ka ọbụ abụ a bu n’obi mgbe o kwuru na ezi omume Jehova dị ka “nnukwu ugwu”? (it-2 445)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 37:1-26 (th ihe ọmụmụ nke 10)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa onye na-ekwebughị ka a mụwara ya Baịbụl ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 9 nọmba nke 4)
6. Okwu
(Nkeji 5) ijwbv 45—Isiokwu: Gịnị Ka Ihe E Dere n’Abụ Ọma 37:4 pụtara? (th ihe ọmụmụ nke 13)
Abụ nke 33
7. Ị̀ Kwadebela Maka Oge “Nsogbu”?
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ngwongwo ụmụnna anyị n’ụwa niile na-efunahụ ha, ndị ha hụrụ n’anya na-anwụnahụkwa ha n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha nakwa ọdachi ndị mmadụ na-akpata. (Ọma 9:9, 10) Ọ dị mwute na “nsogbu” nwere ike ịbịara anyị mgbe ọ bụla. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkwadebe maka ọnwụnwa ndị ahụ.
Ịkwadebe ihe ndị anyị ga-eji nyere onwe anyị aka n’oge ọdachi dị mma. a Ma, gịnị ga-enyere anyị aka idi nsogbu ma e nwee ọdachi?
-
Kwadebe obi gị: Kweta na ọdachi nwere ike ịdakwasị onye ọ bụla. N’ihi ya, chebara ihe ị ga-eme ma e nwee ọdachi echiche. Ekwela ka obi gị na-adịkarị n’ihe ndị i nwere. Ọ ga-enyere gị aka ịkpa àgwà ka onye ma ihe, ime ihe ngwa ngwa, nakwa ichebe onwe gị kama ịgbawa mbọ ka i chekwaa ihe ndị i nwere. (Jen. 19:16; Ọma 36:9) Ọ ga-enyekwara gị aka mgbe e nwechara ọdachi ka ị ghara ịtụ anya na ihe ga-adị otú ọ dịbu. O nwekwara ike ime ka obi ghara ịda gị mbà ma ọ bụrụ na ihe ndị i nwere lara n’iyi.—Ọma 37:19
-
Mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma: Ka obi sie gị ike na Jehova ga-elekọtali gị nakwa na ọ na-agụ ya agụụ ime otú ahụ. (Ọma 37:18) Tupu e nwee ọdachi, na-echetara onwe gị mgbe niile na Jehova ga na-eduzi ndị na-efe ya ma na-akwado ha ọ bụrụgodị na ihe niile anyị nwere funahụrụ anyị, naanị “ụgwọ ọrụ” anyị ji n’aka abụrụ ndụ anyị.—Jere. 45:5; Ọma 37:23, 24
Ọ bụrụ na obi siri anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere anyị, ọ pụtara na anyị ji ya mere ‘ebe a rụsiri ike nke anyị na-agbaba n’oge ahụhụ.’—Ọma 37:39.
Kpọnye VIDIO bụ́ Ì Jikerela Maka Ọdachi? Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
-
Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ma e nwee ọdachi?
-
Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji kwadebe maka ọdachi?
-
Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ma e nwee ọdachi?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr isi nke 9 ¶10-17