Mee 6-12
2 Ndị Kọrịnt 4-6
Abụ nke 128 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Anyị Adịghị Ada Mbà”: (Nkeji 10)
2 Kọr. 4:16—Jehova na-eme ka anyị dị ọhụrụ “kwa ụbọchị” (w04 8/15 25 ¶16-17)
2 Kọr. 4:17—Ahụhụ ndị anyị na-ata ugbu a “na-adịru nwa oge, dịkwa mfe” (it-1 724-725)
2 Kọr. 4:18—Anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
2 Kọr. 4:7—Gịnị bụ ‘akụ̀ a dị n’arịa e ji ụrọ kpụọ’? (w12 2/1 28-29)
2 Kọr. 6:13—Olee otú anyị ga-esi ‘meghee obi anyị’ dị ka a gwara anyị mee n’amaokwu a? (w09 11/15 21 ¶7)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) 2 Kọr. 4:1-15 (th ihe ọmụmụ nke 12)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Ịgụzi Ihe Agụzi, tụleekwanụ ihe ọmụmụ nke 5 na broshọ Izi Ihe.
Okwu: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) w04 7/1 30-31—Isiokwu: Onye Kraịst E Mere Baptizim na Onye Nkwusa A Na-emebeghị Baptizim Hà Kwesịrị Ịkpa Maka Ọlụlụ? (th ihe ọmụmụ nke 7)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
M Na-eme Otú Ike Kwere M: (Nkeji 8) Kpọnye vidio ahụ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee otú Nwanna Foster si nye Jehova ihe niile o nwere mgbe ọ ka na-eto eto, ahụ́ gbasiri ya ike? Olee otú ọnọdụ ya si gbanwee? Olee otú o si na-enye Jehova ihe niile o nwere ugbu a ihe gbanwere? Olee ihe ndị ị mụtara n’akụkọ ya?
Mkpa Ọgbakọ: (Nkeji 7)
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 65
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 65 na Ekpere