OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Olee Ihe Ị Ga-amụta n’Aka Ha?
À họpụtara gị na nso nso a ka ị bụrụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye? O nwere ike ịbụ na ị gụrụ akwụkwọ karịa ndị okenye ndị nke ọzọ, nwee nkà ndị ha na-enweghị, ma ọ bụkwanụ nwee ihe ị ma eme ha na-amaghị eme. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta n’aka ha nakwa n’aka ụmụnna nwoke ndị ọzọ na-abụghịzi ndị okenye n’ihi nká, ọrịa, ma ọ bụ ibu ọrụ ezinụlọ.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-AKWANYERE ỤMỤNNA MA NKE A NA-AKỌ ÙGWÙ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
1. Olee otú Nwanna Richards si kwanyere Nwanna Bello ùgwù?
-
2. Olee ihe Ben mehiere, gịnịkwa mere o ji mee ihe ahụ?
-
3. Olee ihe Ben mụtara n’aka Ịlaịsha?
-
4. Ma ị̀ bụ nwanna nwoke ma ị̀ bụ nwanna nwaanyị, olee otú ị ga-esi na-akwanyere ụmụnna ma nke a na-akọ ùgwù ma si n’aka ha mụta ihe?