Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 8-9

Olee Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Na-eso Ụzọ Jizọs?

Olee Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Na-eso Ụzọ Jizọs?

9:62

Onye na-akọ ugbo agaghị elewe anya n’azụ ma ọ chọọ ka ihe ọ na-akọ ghara ịgbagọ agbagọ. Onye Kraịst ekwesịghịkwa ikwe ka ihe ndị ọ hapụrụ n’ụwa dọpụ ya uche.—Fil. 3:13.

Anyị nọrọ ná nsogbu, anyị nwere ike chọwa ịlaghachi n’oge anyị chere na ihe dị mma, eleghị anya, tupu anyị abata n’ọgbakọ. Anyị chewe ụdị ihe ahụ, anyị ga na-ekwukarị gbasara otú ihe si dịrị anyị ná mma mgbe ahụ, mezie ka o yie ka anyị enweghị nsogbu ọ bụla n’oge ahụ. Ihe a ka ndị Izrel mere mgbe ha si n’Ijipt pụọ. (Ọnụ Ọgụ. 11:5, 6) Anyị nọgide na-eche ụdị ihe a, o nwere ike gụwa anyị agụụ ịlaghachi n’ụwa. Ọ ga-akara anyị mma ịna-eche gbasara ihe ọma ndị Chineke na-emere anyị ugbu a na ndị nke ọ ga-emere anyị n’Alaeze ya.—2 Kọr. 4:16-18.