Julaị 16-22
LUK 10-11
Abụ nke 100 na Ekpere
Okwu mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ihe Atụ Onye Sameria Bụ́ Ezigbo Onye Agbata Obi”: (Nkeji 10)
Luk 10:29-32—Onye nchụàjà bu ụzọ gafere, onye Livaị emechaakwa gafere, ma ha enyereghị onye Juu ibe ha ndị omekome merụrụ ahụ́ aka [Kpọnye vidio e ji kọwaa ihe dị na Luk 10:30.] (w02 9/1 16-17 ¶14-15)
Luk 10:33-35—Onye Sameria gosiri onye ahụ e merụrụ ahụ́ ịhụnanya pụrụ iche (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 10:33, 34)
Luk 10:36, 37—Anyị kwesịrị ịhụ mmadụ niile n’anya, ọ bụghị naanị ndị anyị na ha hà, ndị agbụrụ anyị, ma ọ bụ ndị obodo anyị (w98 7/1 31 ¶2)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Luk 10:18—Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ gwara mmadụ iri asaa na-eso ụzọ ya, sị: “Amalitewo m ịhụ Setan ka ọ dara dị ka àmụ̀mà nke si n’eluigwe”? (nwtsty ihe a kọwara n’amaokwu a; w08 3/15 31 ¶11)
Luk 11:5-9—Gịnị ka ihe atụ nwoke ahụ nọgidere na-arịọ enyi ya arịrịọ na-akụziri anyị banyere ekpere? (nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara n’amaokwu a)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Luk 10:1-16
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Onye ahụ ekwuo ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị n’ókèala unu.
Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Onye ahụ agwa gị na ya na-eri nri.
Vidio Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 5) Kpọnye vidio ahụ. Kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Gịnị Mere Ịnọpụ Iche Ji Dị Ezigbo Mkpa? (Maị. 4:2)”: (Nkeji 15) Kpọnye vidio ahụ, kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 29
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 146 na Ekpere