“Onyeikpe nke Ụwa Dum” Bibiri Sọdọm na Gọmọra
Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Jehova mere Sọdọm na Gọmọra?
-
Jehova agaghị agbachi nkịtị ka ihe ọjọọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi
-
Ndị ga-alanahụ ikpe na-abịanụ ga-abụ ndị na-ege Chineke ntị ma na-eme uche ya.—Luk 17:28-30
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Omume rụrụ arụ ndị mmadụ na-eme taa ọ̀ na-ewute m?’ (2 Pita 2:7) ‘Ihe ndị m na-eme kwa ụbọchị hà na-egosi na ihe kacha m mkpa bụ ime uche Jehova?’