ABỤ NKE 16
Toonụ Jaa n’Ihi Ọkpara Ya O Tere Mmanụ
-
1. Jizọs n’achịu-gbua n’el’igwe.
Ka ’madụ niile too ya.
Jizọs n’achịkwa n’ezio-mume,
K’uche Chineke mee n’ụwa.
(UKWE)
Toonụ Jehova n’ihi Jizọs.
Ndị Jehova, toonụ Kraịst.
Unu niile n’eso ya kw’ụbọchị,
n’erubekwara y’isi.
Toonụ Jehova n’ihi Jizọs,
Onye n’achịu-gbua n’el’igwe.
E nyere y’ike, teekwa ya ’manụ
ịsọpụrụ Jehova.
-
2. Ndị g’eso ya bụr’eze,
Ha niile bụ nwunye ya.
Ha g’eso Jizọs chịa n’el’igwe
Ma mee k’ụwa ghọọ Paradaịs.
(UKWE)
Toonụ Jehova n’ihi Jizọs.
Ndị Jehova, toonụ Kraịst.
Unu niile n’eso ya kw’ụbọchị,
n’erubekwara y’isi.
Toonụ Jehova n’ihi Jizọs,
Onye n’achịu-gbua n’el’igwe.
E nyere y’ike, teekwa ya ’manụ
ịsọpụrụ Jehova.
(Gụọkwa Ilu 29:4; Aịza. 66:7, 8; Jọn 10:4; Mkpu. 5:9, 10.)