Bụkuo Jehova Abụ—Abụ Ọhụrụ

Soro bụọ abụ ọhụrụ ndị a e ji eto Jehova Chineke ma na-efe ya ofufe. Danloduo ha na mkpụrụ okwu ha ma mụọ ha ka ị mụta ịbụ ha ọfụma.

ABỤ 136

Alaeze Chineke Na-achị​—⁠Ya Bịawa!

Ọmarịcha abụ Alaeze e ji eto Jehova Chineke iji gosi na Kraịst Jizọs achịwala n’Alaeze Chineke.

ABỤ 137

Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu

Soro bụọ abụ a e ji arịọ Jehova Chineke ka o nye anyị obi ike ịgbara aha ya àmà n’atụghị egwu.

ABỤ 138

Jehova Bụ Aha Gị

Too aha Jehova dị́ ebube, meekwa ka mmadụ niile mara na ọ bụ ya bụ Ọkaakaa.

ABỤ 139

Na-ezi Ha Ka Ha Guzosie Ike

Arịrịọ a na-arịọ Jehova Chineke ka o chebe ndị ya ma nyere ha aka ịtachi obi n’ọsọ ndụ ha na-agba.

ABỤ 140

Ndụ Onye Ọsụ Ụzọ

Bụọ abụ ga-egosi na ị hụrụ Jehova n’anya, na i nwere ọṅụ n’ọrụ obi ụtọ ị na-arụ nakwa na ị bụ ọsụ ụzọ.

ABỤ 141

Na-achọ Ndị Udo

Abụ a dị ụtọ. Ọ na-ekwu gbasara otú anyị si hụ ndị mmadụ n’anya na otú anyị si agbasi mbọ ike na-achọ atụrụ Chineke.

ABỤ 142

Ikwusara Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma

Bụọ abụ banyere ịdị mma Jehova na ihe anyị ga-eme iji nabata ụdị mmadụ niile ka ha bụrụ ndị enyi Chineke.

ABỤ 143

Ìhè Na-enwu n’Ụwa A Gbara Ọchịchịrị

Ọchịchịrị gbara n’ụwa, ma ozi anyị na-enye ìhè.

ABỤ 144

Ọ Ga-eme Ka Ha Dị́ Ndụ

Anyị kwesịrị ikwusa ozi ọma ugbu a oge ka dị.

ABỤ 145

Ịkwadebe Maka Ozi Ọma

O nwere ike ịdị anyị ka anyị nọrọ n’ụlọ, ma anyị ga-enwetali ike anyị ga-eji gaa kwusaa ozi ọma.

ABỤ 146

Unu Meere M Ya

Jizọs weere na ọ bụ ya ka e meere ihe ọ bụla e meere ụmụnna ya e tere mmanụ.

ABỤ 147

Ndị Pụrụ Iche nke Chineke

Jehova ejighị ụmụ ya o ji mmụọ nsọ tee mmanụ egwuri egwu. Ọ na-agụkwa ha agụụ ime uche ya.

ABỤ 148

I Nyere Anyị Ọkpara Gị

Na-ekele Jehova maka onyinye kachanụ o nyere anyị. O mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.

ABỤ 149

Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta

Àjà Jizọs ji obi ya niile chụọ bụ onyinye kachanụ Jehova nyere anyị nke gosiri na ha hụrụ anyị n’anya. Anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova maka ya ruo ebighị ebi.

ABỤ 150

Na-enyekwu Aka n’Ozi Chineke

Bụọ abụ na-egosi na i ji obi ụtọ na-achọ ijere Jehova ozi otú ọ bụla ọ chọrọ.

ABỤ NKE 151

Ikpughe Ụmụ Chineke

Anyị na-atụsi anya ike mgbe Jehova ga-akpọlite ụmụnna Kraịst ka ha gaa eluigwe, soro ya nwee mmeri ma nweta ụgwọ ọrụ.

ABỤ NKE 152

Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

Nsogbu ụwa mee ka ụjọ jide anyị, Chineke ga-enyeli anyị ike, olileanya, na obi ike.

ABỤ NKE 153

Olee Otú Ọ Na-adị Gị?

Olee otú ọ na-adị gị ma ị gbalịa chọta ndị nwere ezi obi?

ABỤ NKE 154

Anyị Ga Na-atachi Obi

Abụ a ga-enyere anyị aka idi nsogbu ma nọgide na-efe Jehova ruo ọgwụgwụ.