Abụ nke 108
Toonu Jehova Maka Alaeze Ya
1. Jaa ter’Ọkpara ya ’manụ
K’ọ chị’ụmụ ’madụ niile.
Och’eze ya bụ ikpe zir’ezi,
K’e me’uche Chineke n’ụwa.
(KORỌS)
Toonụ Jaa n’ihi Onye Nsọ ya.
Toonụ Kraịst, unu atụrụ ya,
Ndị niile n’eso ya kw’ụbọchị,
n’erub’isi n’iwu ya.
Toonụ Jaa n’ihi Onye Nsọ ya,
2nke n’achị ugbu a n’el’igwe,
E ji aṅụrị n’ike tee ya ’manụ
ịsọpụr’aha nsọ Jaa.
2. A họọr’ụmụnna Jizọs Kraịst.
Chineke mụrụ h’ọzọ.
Ha bụ nwunye Kraịst g’eso ya chịa,
Meekwa k’ụwa ghọọ Paradaịs.
(KORỌS)
Toonụ Jaa n’ihi Onye Nsọ ya.
Toonụ Kraịst, unu atụrụ ya,
Ndị niile n’eso ya kw’ụbọchị,
n’erub’isi n’iwu ya.
Toonụ Jaa n’ihi Onye Nsọ ya,
nke n’achị ugbu a n’el’igwe,
E ji aṅụrị n’ike tee ya ’manụ
ịsọpụr’aha nsọ Jaa.
(Gụọkwa Ilu 29:4; Aịza. 66:7, 8; Jọn 10:4; Mkpu. 5:9, 10.)