Abụ nke 131
Jehova Na-emere Anyị Ụzọ Mgbapụ
1. Chinek’anyị, i gosila n’ị dị ndụ;
Anyị n’ahụ ọrụ gị n’el’igwe na n’ụwa.
Ọ dịghị chi ọzọ pụr’ime ihe i meworo.
Ị g’egbu nd’iro anyị.
(KORỌS)
Jehova n’emer’anyị ụzọ mgbapụ.
Ndị ya g’ahụ na ọ bụ Oké Nkume.
A’yị ji ob’ike n’akọ ịdị ukwuu Jaa,
bụ́ Onye n’eme Ụzọ mgbapụ, tụkwasị y’obi, ma to’aha ya.
2. Ụd’ọnwụ agbaala m gburugburu, biko,
“Jehova, nye m ume, biko, nye m ob’ike.”
Ị nọ n’ụlọ nsọ gị nụ ihe m rịọrọ gị, “Chebe m;
Chineke m, napụta m.”
(KORỌS)
Jehova n’emer’anyị ụzọ mgbapụ.
Ndị ya g’ahụ na ọ bụ Oké Nkume.
A’yị ji ob’ike n’akọ ịdị ukwuu Jaa,
bụ́ Onye n’eme Ụzọ mgbapụ, tụkwasị y’obi, ma to’aha ya.
3. Ị g’esi n’elu kwu’okwu, mee k’a nụ olu gị.
Nd’iro g’at’ụjọ; ndị gị g’enw’ọṅụ.
Ị n’aghọ ih’ọ bụla dị mkpa k’ị ghọọ; a’yị g’ahụ
N’ị bụ Onye Nzọpụta.
(KORỌS)
Jehova n’emer’anyị ụzọ mgbapụ.
Ndị ya g’ahụ na ọ bụ Oké Nkume.
A’yị ji ob’ike n’akọ ịdị ukwuu Jaa,
bụ́ Onye n’eme Ụzọ mgbapụ, tụkwasị y’obi, ma to’aha ya.
(Gụọkwa Ọma 18:1, 2; 144:1, 2.)