Abụ nke 134
Hụ Onwe Gị Mgbe Ihe Niile Dị Ọhụrụ
1. Hụ onwe gị na mụ onwe m,
K’anyị niile nọ n’ụwa ọhụrụ.
Chee otú obi g’adịkwa gị
Ibi n’udo ma nwer’onwe gị.
Onye ọjọọ agagh’anọ;
Ọchịchị Jaa agaghị ada.
Mgbe ụwa ọhụrụ g’amalite,
Anyị g’eji obi anyị niile bụ’abụ, sị:
(KORỌS)
“Jehova Chinek’anyị, i meela!
Nwa gị mere k’ihe dị ọhụrụ.
Anyị ji obi anyị dum n’abụ abụ; ọ bụ gị
Nw’ebube, nsọpụrụ, n’otuto niile.”
2. Hụ onwe gị na mụ onwe m;
Lepụ anya, hụ ụw’ọhụrụ n’abịa.
A gagh’ahụ ma ọ bụ nụ
Ihe g’eme k’anyị tụọ ụjọ.
Ihe niile emezuola
Dị k’o kwuru; ụlọikwuu ya
Ekpuchiela ụmụ ’madụ; ọ kpọtee
Ndị nwụr’anwụ, ha g’eso kelee ya, sị:
(KORỌS)
“Jehova Chinek’anyị, i meela!
Nwa gị mere k’ihe dị ọhụrụ.
Anyị ji obi anyị dum n’abụ abụ; ọ bụ gị
Nw’ebube, nsọpụrụ, n’otuto niile.”
(Gụọkwa Ọma 37:10, 11; Aịza. 65:17; Jọn 5:28; 2 Pita 3:13.)