Abụ nke 37
Akwụkwọ Nsọ Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke
1. Okwu Chineke bụ ìhè
N’edu anyị n’ọchịchịrị.
Anyị soro ya mgbe niile,
Ọ g’atọpụ anyị n’agbụ.
2. O si n’ike ’mụọ nsọ,
Ọ n’ezi anyị uche Jaa.
Ọ n’eme k’ihe guzozie,
Chineke ji ya n’azụ anyị.
3. A’yị si na Baịbụl mata
Ịhụnanya Chineke.
Anyị n’agụ ya kw’ụbọchị,
A’yị g’am’ihe, nweta ndụ.
(Gụọkwa Ọma 119:105; Ilu 4:13.)