Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị

To provide you with the best possible experience, we use cookies and similar technologies. Some cookies are necessary to make our website work and cannot be refused. You can accept or decline the use of additional cookies, which we use only to improve your experience. None of this data will ever be sold or used for marketing. To learn more, read the Global Policy on Use of Cookies and Similar Technologies. You can customize your settings at any time by going to Privacy Settings.

Foto dị iche iche na-egosi ihe mkpamkpa dị iche iche kpatara. 1. Otu ụgbọala bọmbụ gbakasịrị n’otu okporo ụzọ a gbahapụrụ agbahapụ n’obodo a na-alụ agha. 2. Otu nwa agbọghọ obi na-ajọ njọ. 3. Ebe otu nwaanyị na nwa ya guzo n’okporo ụzọ mmiri tojuru. 4. Ihe ndị si n’otu ụlọ dakasịrị adakasị. 5. Ebe otu nwaanyị kpuchiri ihe n’imi ya ma si na windo na-elepụ anya.

Top left: Marek M. Berezowski/​Anadolu Agency via Getty Images; bottom left: Halfpoint Images/​Moment via Getty Images; center: Zhai Yujia/​China News Service/​VCG via Getty Images; top right: Ismail Sen/​Anadolu Agency via Getty Images; bottom right: E+/​taseffski/​via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Afọ 2023 Kpataara Ọtụtụ Ndị Nchekasị​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Afọ 2023 Kpataara Ọtụtụ Ndị Nchekasị​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’afọ 2023, ihe ndị mere n’ebe dị iche iche n’ụwa gosiri n’eziokwu na anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Chọpụta otu ihe ndị na-eme n’ụwa si bụrụ nnọọ ihe ndị Baịbụl kwuru na ha ga na-eme n’oge anyị a.

Ihe Baịbụl kwuru na ihe na-eme n’ụwa

 “Agha na akụkọ agha.”​—Matiu 24:6.

  •   “A na-alụzi agha ọtụtụ ebe n’ụwa.” a

 “Ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.”​—Mak 13:8.

  •   “Malite na mbido afọ 2023 ruo ugbu a, ala ọma jijiji iri na atọ jọgburu onwe ha emeela n’ụwa. O so n’afọ ala ọma jijiji kacha mee n’ụwa kemgbe anyị bidoro idekọ ugboro ole ala ọma jijiji mere n’afọ.” b

 “Ihe ndị na-atụ egwu.”​—Luk 21:11.

  •   Odeakwụkwọ ukwu Òtù Mba Ụwa bụ́ António Guterres kwuru na e nwere ike ikwu na ụwa anaghịzi ekpo ọkụ, kama na ihe ọ na-emezi bụ ire ọkụ. c

 “Ụkọ nri.”​—Matiu 24:7.

  •   “Afọ 2023 bụ afọ ọzọ tara ezigbo akpụ maka ndị ọ na-esiri ike ilekọta ezinụlọ ha.” d

 ‘Oge ga-adị oké egwu, taakwa akpụ.’​—2 Timoti 3:1.

  •   “N’ụwa niile, isi agbakọchaghị otu onye n’ime mmadụ asatọ ọ bụla ọnụ.” e

Gịnị ka anyị ga-atụ anya ya n’afọ 2024?

 E nweghị onye ga-ekwuli kpọmkwem ihe ndị ga-eme n’afọ 2024. Ma, ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosi na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ma ọ bụ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị, ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ ma mee ka ihe niile na-akpatara anyị ahụhụ na nchekasị laa.​—Daniel 2:44; Mkpughe 21:4.

 Ka ọ dịgodị, ọ bụrụ na anyị echegbuwe onwe anyị, anyị nwere ike ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka. Baịbụl kwuru, sị:

 “Ụjọ tụwa m, m na-atụkwasị gị obi.”​—Abụ Ọma 56:3.

 Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị tụkwasịrị Chineke obi? Anyị na-agba gị ume ka ị matakwuo ihe Baịbụl kwuru gbasara mgbe ahụhụ na-agaghịzi adị n’ọdịnihu. Ị chọọ ịmata otú nkwa ndị Baịbụl kwere ga-esi abara gị na ezinụlọ gị uru, gwa anyị ka anyị na gị mụwa Baịbụl n’anaghị gị ego.

a E kwuru ihe a n’akwụkwọ a na-akpọ Foreign Affairs, n’isiokwu bụ́, “A World at War: What Is Behind the Global Explosion of Violent Conflict?” Ọ bụ Emma Beals na Peter Salisbury bipụtara ya n’Ọktoba 30, 2023.

b E kwuru ihe a n’akwụkwọ a na-akpọ Earthquake News, n’isiokwu bụ́, “Year 2023: Number of Major Earthquakes on Course for Record.” E bipụtara ya n’ọnwa Mee afọ 2023.

c O kwuru ihe a n’okwu mmeghe ya n’otu nnọkọ e nwere gbasara ihu ígwé n’ọnwa Julaị afọ 2023.

d Ọ bụ òtù World Food Programme kwuru ihe a n’otu isiokwu ha bipụtara bụ́, “A Global Food Crisis.”

e Ọ bụ Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru ihe a ná nnọkọ ha nwere n’abalị iri n’ọnwa Ọktoba afọ 2023. Isiokwu nnọkọ ahụ bụ, “World Mental Health Day 2023.”