Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eziokwu Ọ̀ Ka Dị Mkpa?

Eziokwu Ọ̀ Ka Dị Mkpa?

 È nwere mgbe ọ na-adị gị ka ọ̀ na-esizi ezigbo ike ịmata ihe bụ́ eziokwu na ihe na-abụghị eziokwu? Ọ dịzị ka ndị mmadụ anaghịzi esi n’ihe e ji n’aka amata ihe bụ́ eziokwu, kama, ha na-ejizi otú obi dị ha na ihe ha chere ekpebi ihe bụ́ eziokwu na ihe na-abụghị eziokwu. Ọtụtụ ndị n’ụwa taa ekwetaghịzi na e nwere ihe bụ́ eziokwu.

 Ọ bụghị taa ka ndị mmadụ malitere iche na e nweghị ihe bụ́ eziokwu. Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Gọvanọ ndị Rom aha ya bụ Pọntiọs Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” (Jọn 18:38) Ajụjụ a Paịlet jụrụ Jizọs dị ezigbo mkpa n’agbanyeghị na o cheghị ka Jizọs zaa ya. Baịbụl zara ya otú ga-eju gị afọ, kwuokwa ihe ga-enyere gị aka ịmata ihe bụ́ eziokwu na ihe na-abụghị eziokwu n’ụwa a ọ na-esizi ike ịmata ihe bụ́ eziokwu.

È nwedịrị ihe bụ́ eziokwu?

 Eenụ, e nwere. Na Baịbụl, “eziokwu” pụtara ihe e ji n’aka na o mere eme nakwa ihe dị mma. Baịbụl na-akụzi na ihe niile bụ́ eziokwu si n’aka Jehova a Chineke. Ọ kpọrọ ya “Chineke, onye eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Ihe dị na Baịbụl bụ eziokwu si n’aka Chineke. Baịbụl jikwa eziokwu ahụ tụnyere ìhè maka na o nwere ike inyere anyị aka izere nsogbu n’ụwa a ọgba aghara juru.​—Abụ Ọma 43:3; Jọn 17:17.

Olee otú i nwere ike isi mata nke bụ́ eziokwu?

 Chineke achọghị ka anyị kweta eziokwu ndị dị na Baịbụl n’echebaraghị ha echiche. Ọ chọghịkwa ka anyị kweta ha n’ihi otú obi dị anyị, kama ọ chọrọ ka anyị jiri ike iche echiche anyị leruo ha anya iji chọpụta ma hà bụ eziokwu. (Ndị Rom 12:1) Ọ chọrọ ka anyị jiri ‘uche anyị niile’ mara ya ma hụ ya n’anya, chọọkwa ka anyị na-enyocha ihe anyị na-amụ na Baịbụl iji jide n’aka na ha bụ eziokwu.​—Matiu 22:37, 38; Ọrụ Ndịozi 17:11.

Olee onye ụgha si n’aka ya malite?

 Baịbụl kwuru na ụgha si n’aka onye iro Chineke malite, ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu. Baịbụl kpọkwara ya “nna ụgha.” (Jọn 8:44) Ọ ghaara Adam na Iv ụgha gbasara Chineke. (Jenesis 3:​1-6, 13, 17-19; 5:5) Kemgbe ahụ, ọ na-ezochi ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara Chineke ma na-agbasa ụgha ebe niile.​—Mkpughe 12:9.

Gịnị mere ọtụtụ ndị jizi agha ụgha taa?

 N’oge anyị a, bụ́ oge Baịbụl kpọrọ “oge ikpeazụ,” Setan na-eduhie ndị mmadụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ndị mmadụ na-aghakarị ụgha iji duhie ndị ọzọ ma ọ bụ iji rigbuo ha. (2 Timoti 3:1, 13) A na-aṅụkwa ụgha ka mmiri n’ọtụtụ okpukpe taa. Amụma Baịbụl buru gbasara oge anyị a na-emezu. O kwuru na ndị mmadụ ‘ga-akpọkọtara onwe ha ndị ga na-akụziri ha ihe ha chọrọ ịnụ’ nakwa na ‘ha ga-akwụsị ige eziokwu.’​—2 Timoti 4:​3, 4.

Gịnị mere eziokwu ji dị mkpa?

 Ndị mmadụ na-atụkwasị ndị na-ekwu eziokwu obi. Ndị na-atụkwasịghị ibe ha obi na-akwụsị ịbụ enyi. Ọgba aghara na-adịkwa n’obodo ma ọ bụrụ na ndị mmadụ atụkwasịghị ibe ha obi. Baịbụl kwuru na Chineke chọrọ ka anyị na-efe ya maka na anyị ma eziokwu gbasara ya. O kwuru, sị: “Ndị na-efe [Chineke] ofufe ga-efe ya n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Ị chọọ ịmụta otú eziokwu dị na Baịbụl ga-esi nyere gị aka ịchọpụta ụgha ndị okpukpe na-akụzi nakwa otú ị ga-esi nwere onwe gị na ha, gụọ isiokwu ndị dị n’okpuru isiokwu bụ́ “Gịnị Mere O Ji Esiri Ụfọdụ Ndị Ike Ịhụ Chineke n’Anya?

Gịnị mere Chineke ji chọọ ka m mara nke bụ́ eziokwu?

 Chineke chọrọ ka a zọpụta gị, i kwesịkwara ịmụta eziokwu gbasara ya ka e wee zọpụta gị. (1 Timoti 2:4) Ọ bụrụ na ị mụta ihe ndị dị Chineke mma ma na-eme ha, mụtakwa ihe ndị na-adịghị ya mma ma na-ezere ha, gị na ya ga-abụ ezigbo enyi. (Abụ Ọma 15:​1, 2) Chineke zitere Jizọs n’ụwa ka o nyere ndị mmadụ aka ịmata nke bụ́ eziokwu. Chineke chọrọ ka anyị gee ntị n’ihe ndị Jizọs kụziri.​—Matiu 17:5; Jọn 18:37.

Chineke ọ̀ ga-emecha mee ka ụgha ghara ịdịzi?

 Ee. Ọ na-ewute Chineke ma ndị mmadụ ghaara ndị ọzọ ụgha iji ghọgbuo ha. O kwela nkwa na ya ga-ebibi ndị na-ekweghị akwụsị ịgha ụgha n’ụwa a. (Abụ Ọma 5:6) Mgbe Chineke ga-eme ihe a, ọ ga-emezukwa nkwa o kwere anyị na “Onye na-ekwu eziokwu ga-anọru mgbe ebighị ebi.”​—Ilu 12:19.

a Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?