Zekaraya 9:1-17
9 Ihe Chineke kpebiri ime:
“Jehova ekwuola ihe ọ ga-eme ala Hedrak.
Ọ bụ Damaskọs ka ọ ga-eme ya,+N’ihi na anya Jehova na-ahụ ụmụ mmadụ+Nakwa ebo niile e nwere n’Izrel.
2 Ọ ga-emekwa ya Hemat,+ nke ya na ya gbara ókè,Meekwa ya Taya+ na Saịdọn+ n’ihi na ha ma ihe nke ukwuu.+
3 Taya rụụrụ onwe ya mgbidi siri ike.
O kpokọtara ọlaọcha ka ájá,Kpokọtakwa ọlaedo ka apịtị dị n’okporo ámá.+
4 Lee, Jehova ga-anapụ ya ihe ndị o nwere.
Ọ ga-ebibi ndị agha ya n’oké osimiri,+Ọkụ ga-erepịakwa ya.+
5 Ashkelọn ga-ahụ ya ma tụọ egwu.
Ọ ga-ewute Gaza nke ukwuu,Wutekwa Ekrọn maka na e menyela ihe ọ tụkwasịrị obi ihere.
Eze Gaza ga-anwụ,E nweghịkwa onye ga-ebi n’Ashkelọn.+
6 Onye mba ọzọ ga-ebi n’Ashdọd,M ga-ebibikwa ihe onye Filistia ji anya isi.+
7 M ga-ewepụ ihe ndị dị ya n’ọnụ ọbara tetọrọ,Wepụkwa ihe ndị na-asọ oyi dị ya n’ezé.
A ga-ahapụ ya ka ọ fọdụrụ Chineke anyị.
Ọ ga-adị ka onyeisi na Juda,+Onye Ekrọn ga-adịkwa ka onye Jebus.+
8 M ga-eguzoro n’ihu ụlọ m na-eche ya nche,+Ka a ghara inwe onye ga-esi na ya na-apụ apụ ma ọ bụ na-abata abata.
E nweghị onyeisi ọrụ* ga-esi na ya gafere ọzọ,+N’ihi na m jirila anya m hụ ya* ugbu a.
9 Zayọn,* ṅụrịa nnukwu ọṅụ.
Jeruselem,* tie mkpu mmeri.
Lee! Eze gị na-abịakwute gị.+
Ọ bụ onye ezi omume. Ọ na-eweta nzọpụta.*
Ọ dị umeala n’obi,+ ọ nọkwa n’elu jakị,N’elu nwa jakị,* nwa nne jakị mụrụ.+
10 M ga-ewepụ ụgbọ ịnyịnya agha n’Ifrem,Wepụkwa ịnyịnya na Jeruselem.
A ga-ewepụ ụta agha.
Ọ ga-agwakwa mba dị iche iche na udo ga-adịrị ha.+
Ọchịchị ya ga-amalite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri,Malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo n’ebe niile ụwa sọtụrụ.+
11 Ma gị, nwaanyị,* n’ihi ọbara ọgbụgba ndụ mụ na gị,M ga-akpọpụta ndị gị a tụrụ mkpọrọ n’olulu nke mmiri na-adịghị.+
12 Unu ndị mkpọrọ ndị nwere olileanya, laghachinụ n’ebe a rụsiri ike.+
Taa, ana m asị gị,‘Nwaanyị, m ga-akwụ gị ụgwọ okpukpu abụọ.+
13 M ga-ekwe Juda* ka ụta m.
M ga-eji Ifrem mere akụ́ ụta m.
Zayọn, m ga-akpọte ụmụ gị
Ka ha megide ụmụ Gris,M ga-emekwa ka ị dị ka mma agha onye agha.’
14 Jehova ga-eme ka a mara na ya nọnyeere ha,Akụ́ ọ ga-agba ga-apụ ngwa ngwa ka àmụ̀mà.
Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-afụ opi,+Ọ ga-esorokwa ifufe nke si n’ebe ndịda gawa.
15 Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-echebe ha.
Ha ga-emeri ndị iro ha ndị ji èbè* na-agba ha nkume.+
Ha ga-aṅụrị ọṅụ ma na-eti mkpu ka à ga-asị na ha ṅụrụ mmanya.
Ha ga-adị ka efere mmanya juru,Dịkwa ka akụkụ ebe ịchụàjà nke ọbara juru na ya.+
16 Jehova bụ́ Chineke ha ga-azọpụta ha n’ụbọchị ahụOtú onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta atụrụ ya;+N’ihi na ha ga na-egbuke egbuke n’ala ya ka ọmarịcha nkume ndị na-adị n’okpueze.+
17 N’ihi na otú o si dị mma enweghị atụ,+Ọ makwara ezigbo mma.
Nri ga-eme ka ụmụ okorobịa na-eme nke ọma,Mmanya ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ* na-eme nke ọma.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “onye mmegide.”
^ O nwere ike ịbụ ahụhụ ndị ya na-ata.
^ Ma ọ bụ “oké jakị.”
^ Ma ọ bụ “Ọ na-emeri emeri.”
^ Na Hibru, “Ada bụ́ Jeruselem.”
^ Na Hibru, “Ada bụ́ Zayọn.”
^ Ya bụ, Zayọn, ma ọ bụ Jeruselem.
^ Na Hibru, “ga-azọ Juda ụkwụ.”
^ Èbè bụ ihe yiri katapọt.
^ Na Hibru, “ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke.”