Zekaraya 4:1-14
4 Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu bịaghachiri kpọtee m otú e si akpọte onye nọ n’ụra.
2 O wee jụọ m, sị: “Gịnị ka ị na-ahụ?”
M wee sị ya: “M na-ahụ ihe e ji adọsa ọkụ.* Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji rụọ ya,+ otu efere dịkwa n’elu ya. Ọkụ* asaa dị na ya.+ N’eziokwu, ha dị asaa. Ọkụ ndị ahụ dị n’elu ya nwekwara okporo asaa mmanụ ọkụ si abanye na ha.
3 Osisi oliv abụọ dịkwa n’akụkụ ya.+ Otu dị n’aka nri efere ahụ, otu adịrị n’aka ekpe ya.”
4 M wee jụọ mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, sị: “Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a pụtara?”
5 Mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu wee jụọ m, sị: “Ọ̀ bụ na ị maghị ihe ihe ndị a pụtara?”
M zara ya, sị: “Mba, onyenwe m.”
6 Ọ sịziri m: “Jehova gwara Zerubabel, sị: ‘“Ọ bụghị ìgwè ndị agha ga-eme ihe ndị a, ọ bụghịkwa ike mmadụ,+ kama ọ bụ mmụọ m+ ga-eme ha.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
7 Nnukwu ugwu, ònye ka ị bụ? Ị ga-abụ ala dị larịị+ n’ihu Zerubabel.+ Ọ ga-ewepụtakwa nkume ga-adị n’elu elu mgbe a ga na-eti mkpu, sị: “Ọ mara ezigbo mma! Ọ mara ezigbo mma!”’”
8 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:
9 “Ọ bụ aka Zerubabel tọrọ ntọala ụlọ a,+ ọ bụkwa aka ya ga-arụcha ya.+ Unu ga-amarakwa na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m ka m bịakwute unu.
10 È nwere onye ledara ụbọchị ihe ji nke nta nke nta malite* anya?+ N’ihi na ha ga-aṅụrị ọṅụ, hụkwa eriri e ji atụ̀ ihe* n’aka Zerubabel. Ha* asaa bụ anya Jehova. Ha na-elezu ụwa* niile.”+
11 M wee jụọ ya, sị: “Gịnị ka osisi oliv abụọ a dị n’aka nri na n’aka ekpe ihe a e ji adọsa ọkụ* pụtara?”+
12 M jụkwara ya nke ugboro abụọ, sị: “Gịnị ka alaka* ndị dị n’osisi oliv abụọ a pụtara, bụ́ ndị na-agbapụta mmanụ na-acha ọlaedo ọlaedo ndị na-esi n’okporo abụọ e ji ọlaedo rụọ na-asọba n’efere?”
13 O wee jụọ m, sị: “Ọ̀ bụ na ị maghị ihe ihe ndị a pụtara?”
M zara ya, sị: “Mba, onyenwe m.”
14 Ọ sịrị: “Ha bụ ndị e tere mmanụ. Ha dị abụọ, ha guzokwa n’akụkụ Onyenwe elu ụwa niile.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
^ Ma ọ bụ “Oriọna.”
^ Ma ọ bụ “ụbọchị ihe nta.”
^ Na Hibru, “okwute,” ya bụ, okwute e kegidere eriri nke e ji amata ma ihe ọ̀ kwụkwa ọtọ.
^ “Ha” nwere ike ịbụ ọkụ asaa ahụ ma ọ bụkwanụ anya Jehova.
^ Na Hibru, “na-awagharị n’ụwa.”
^ Ma ọ bụ “oriọna.”
^ Ya bụ, alaka ndị mkpụrụ mịjuru na ha n’osisi ahụ.