Nehemaya 11:1-36
-
Ndị mmadụ birighachiri na Jeruselem (1-36)
11 Ọ bụ ndị isi ndị Izrel bi na Jeruselem.+ Ma ndị Izrel ndị ọzọ fere nza+ ka ha họpụta otu ezinụlọ n’ime ezinụlọ iri ọ bụla ga-ebi na Jeruselem bụ́ obodo nsọ, ezinụlọ itoolu ndị ọzọ ebiri n’obodo ndị ọzọ.
2 Ndị Izrel gọzikwara ndị niile wepụtara onwe ha ibi na Jeruselem.
3 Ndị a bụ ndị isi ógbè* Juda, bụ́ ndị bi na Jeruselem. (Ndị Izrel ndị ọzọ, ndị nchụàjà, ndị Livaị, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,*+ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi+ bi n’obodo ndị ọzọ dị na Juda. Onye nke ọ bụla bi n’ala ya nke dị n’obodo ya.+
4 E nwekwara ụfọdụ ndị ebo Juda na ụfọdụ ndị ebo Benjamin bi na Jeruselem.) Ndị Juda bi na ya bụ Ataya nwa Ọzaya nwa Zekaraya nwa Amaraya nwa Shefataya nwa Mahalalel onye si n’ezinụlọ Pirez,+
5 na Measaya nwa Barọk nwa Kọlhoze nwa Hazaya nwa Adaya nwa Joyarib nwa Zekaraya onye si n’ezinụlọ Shila.
6 Ụmụ nwoke niile Pirez mụrụ, bụ́ ndị bi na Jeruselem, dị narị anọ na iri isii na asatọ (468). Ha bụ ndị dike.
7 Ndị ebo Benjamin bụ: Salu+ nwa Meshọlam nwa Joed nwa Pedaya nwa Kolaya nwa Measaya nwa Itiel nwa Jesheya.
8 Ndị na-eso ya bụ Gabaị na Salaị. Ha dị narị ụmụ nwoke itoolu na iri abụọ na asatọ (928).
9 Joel nwa Zikraị bụ onye na-elekọta ha, Juda nwa Hasenua abụrụ onye nke abụọ na-elekọta obodo ahụ.
10 Ndị si n’ezinụlọ ndị nchụàjà bụ: Jedeya nwa Joyarib, Jekin,+
11 Seraya nwa Hilkaya nwa Meshọlam nwa Zedọk nwa Mereyọt nwa Ahaịtọb,+ onyeisi n’ụlọ* ezi Chineke,
12 na ụmụnne ha ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ahụ, narị asatọ na iri abụọ na abụọ (822); nakwa Adaya nwa Jeroham nwa Pelalaya nwa Amzaị nwa Zekaraya nwa Pash-họ+ nwa Malkaịja,
13 na ụmụnne ya, ndị isi ọnụmara dị iche iche, narị abụọ na iri anọ na abụọ (242); na Amashsaị nwa Azarel nwa Azaị nwa Meshilemọt nwa Ịma,
14 na ụmụnne ha bụ́ ndị dike obi siri ike, otu narị na iri abụọ na asatọ (128). Onye na-elekọta ha bụ Zabdiel, onye si n’ezinụlọ a ma ama.
15 Ndị si n’ezinụlọ ndị Livaị bụ: Shemaya+ nwa Hashọb nwa Azraịkam nwa Hashabaya nwa Bọnaị,
16 na Shabetaị+ na Jozabad,+ bụ́ ndị so ná ndị isi ndị Livaị, ndị na-elekọta ọrụ ndị ọzọ gbasara ụlọ ezi Chineke ndị a na-anaghị anọ n’ime ụlọ ahụ arụ;
17 na Matanaya,+ nwa Maịka nwa Zabdaị nwa Esaf,+ onye na-eduzi abụ ma na-edu ndị na-abụ abụ otuto ma e kpewe ekpere,+ na Bakbọkaya, onye nke abụọ n’ime ụmụnne ya, nakwa Abda nwa Shamua nwa Gelal nwa Jedutọn.+
18 Ndị Livaị niile ndị bi n’obodo nsọ ahụ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ (284).
19 Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá bụ Akọb, Talmọn,+ na ụmụnne ha ndị so ha eche nche. Ha dị otu narị na iri asaa na abụọ (172).
20 Ndị Izrel ndị ọzọ, ndị nchụàjà, na ndị Livaị bi n’obodo ndị ọzọ niile dị na Juda, onye nke ọ bụla n’ala o ketara.*
21 Ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ*+ bi n’Ofel.+ Ọ bụ Zaịha na Gishpa na-elekọta ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ.*
22 Onye na-elekọta ndị Livaị ndị bi na Jeruselem bụ Ọzaị nwa Benaị nwa Hashabaya nwa Matanaya+ nwa Maịka, onye si n’ezinụlọ Esaf, bụ́ ndị na-abụ abụ. Ọ bụ ya na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ ezi Chineke.
23 E nwere iwu eze nyere maka ha,+ nweekwa ihe e kpebiri a ga na-enye ndị na-abụ abụ nke ga na-ezuru ha kwa ụbọchị.
24 Ọ bụ Petahaya nwa Meshezabel nwa Zira nwa Juda na-enye eze ndụmọdụ* n’okwu ọ bụla gbasara ndị anyị.
25 Ógbè ndị a dị iche iche bụ ala ebe ha bi: Ụfọdụ n’ime ndị ebo Juda bi na Kiriat-aba+ na ime obodo ndị dị ya nso,* na Daịbọn na ime obodo ndị dị ya nso, na Jekabziel+ na ógbè ya niile,
26 na Jeshụa, na Moleda,+ na Bet-pelet,+
27 na Heza-shual,+ na Bia-shiba na ime obodo ndị dị ya nso,*
28 na Ziklag,+ na Mekona na ime obodo ndị dị ya nso,*
29 n’En-rimọn,+ na Zora,+ nakwa na Jamọt,
30 na Zanoa,+ n’Adọlam na ógbè ha niile, na Lekish+ na ala ndị dị na ya, nakwa n’Azika+ na ime obodo ndị dị ya nso.* Ha bi* malite na Bia-shiba ruo na Ndagwurugwu Hinọm.+
31 Ndị Benjamin bi na Giba,+ Mikmash, Aịja, Betel+ na ime obodo ndị dị ya nso,*
32 Anatọt,+ Nọb,+ Ananaya,
33 Hezọ, Rema,+ Giteyịm,
34 Hedid, Zeboyim, Nebalat,
35 Lọd, na Ono,+ ndagwurugwu ndị omenkà.
36 E kenyere ụfọdụ n’ime ndị Livaị bibu na Juda ka ha biri na Benjamin.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
^ Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”
^ Ma ọ bụ “n’ụlọ nsọ.”
^ Ma ọ bụ “n’ihe o ketara.”
^ Ma ọ bụ “Ndị Netinim.” Na Hibru, “Ndị e nyere n’onyinye.”
^ Ma ọ bụ “ndị Netinim.” Na Hibru, “ndị e nyere n’onyinye.”
^ Na Hibru, “na-anọ n’aka eze.”
^ Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
^ Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
^ Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
^ Ma ọ bụ “mara ụlọikwuu.”
^ Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
^ Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”