Ozi Ọma Matiu Dere 2:1-23

  • Ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu gara leta nwa a mụrụ ọhụrụ (1-12)

  • Josef kpọ ezinụlọ ya gbaga Ijipt (13-15)

  • Herọd gburu ụmụ nwoke a mụrụ ọhụrụ (16-18)

  • Josef kpọ ezinụlọ ya lọta Nazaret (19-23)

2  Mgbe a mụrụ Jizọs na Betlehem+ nke Judia n’oge Herọd*+ na-achị, ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ bịa Jeruselem.  Ha sịrị: “Olee ebe nwa ọhụrụ ahụ ga-abụ eze ndị Juu nọ?+ N’ihi na anyị hụrụ kpakpando ya mgbe anyị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Anyị bịara ịkpọrọ ya isiala.”  Mgbe Eze Herọd na ndị niile nọ na Jeruselem nụrụ ihe a, ahụ́ erughịzi ha ala.  Ọ kpọkọtaziri ndị isi nchụàjà niile na ndị odeakwụkwọ niile nke ndị Juu, jụọ ha ebe a ga-amụ Kraịst.*  Ha sịrị ya: “Ọ bụ na Betlehem+ nke Judia, n’ihi na otú a ka onye amụma si dee ya:  ‘Ma gịnwa, Betlehem nke dị na Juda, ndị ọzọ niile na-achị Juda ekwesịghị iwere na ị bụ obodo kacha obere, n’ihi na onye na-achị achị ga-esi n’ime gị pụta, onye ga-azụ ndị m, bụ́ Izrel, dị ka atụrụ.’”+  Herọd wee kpọọ ndị ahụ ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ma jụta ha nke ọma na nzuzo mgbe kpakpando ahụ pụtara.  Mgbe ọ na-eziga ha Betlehem, ọ sịrị: “Gaanụ chọọ nwatakịrị ahụ nke ọma. Unu chọta ya, bịanụ kọọrọ m ka mụnwa gaakwa kpọọrọ ya isiala.”  Mgbe eze gwachara ha ihe a, ha gawara, ma, kpakpando ahụ ha hụrụ mgbe ha nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ+ nọ na-aga ha n’ihu ruo mgbe ọ kwụsịrị n’elu ebe nwatakịrị ahụ nọ. 10  Mgbe ha hụrụ ka kpakpando ahụ kwụsịrị, aṅụrị juru ha obi. 11  Mgbe ha banyere n’ụlọ nwatakịrị ahụ na Meri nne ya nọ, ha hụrụ ha, ma daa n’ala kpọọrọ nwa ahụ isiala. Ha meghekwara igbe akụ̀ ha wee nye ya ọlaedo na frankinsens na mea. 12  Ma, ebe ọ bụ na Chineke dọrọ ha aka ná ntị ná nrọ+ ka ha ghara ịlaghachi na nke Herọd, ha si ụzọ ọzọ laa n’ala ha. 13  Mgbe ha lawara, mmụọ ozi Jehova* bịakwutere Josef ná nrọ,+ sị ya: “Bilie, kpọrọ nwatakịrị a na nne ya gbaga Ijipt, nọrọkwa ebe ahụ ruo mgbe m ga-agwa gị ka ị laghachi, n’ihi na Herọd ga-achọ nwatakịrị a ka o gbuo ya.” 14  Josef wee bilie n’abalị kpọrọ nwatakịrị ahụ na nne ya gawa Ijipt. 15  Ọ nọ ebe ahụ ruo mgbe Herọd nwụrụ. Ihe a mezuru ihe Jehova* si n’ọnụ onye amụma ya kwuo. Ọ sịrị: “N’Ijipt ka m si kpọpụta nwa m.”+ 16  Mgbe Herọd hụrụ na ndị ahụ ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu aghọgbuola ya, o were ezigbo iwe. O wee dunye ndị gara Betlehem na ógbè niile gbara ya gburugburu gbuo ụmụaka ndị nwoke niile, malite ná ndị gbara afọ abụọ gbadaa, nke dabara n’oge ahụ ọ jụtara ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ 17  E si otú a mezuo amụma Jeremaya onye amụma buru. Ọ sịrị: 18  “A nụrụ olu onye na-ebe ákwá na onye na-eti mkpu arịrị na Rema. Ọ bụ Rechel+ na-ebe ákwá maka ụmụ ya, o kweghịkwa ka a kasie ya obi, n’ihi na ha anọghịzi.”+ 19  Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Jehova* bịakwutere Josef ná nrọ+ n’Ijipt 20  wee sị ya: “Bilie, kpọrọ nwatakịrị a na nne ya lawa Izrel, n’ihi na ndị na-achọ ndụ* nwatakịrị a anwụọla.” 21  O wee bilie kpọrọ nwatakịrị ahụ na nne ya lọta n’Izrel. 22  Ma mgbe ọ nụrụ na Akeleyọs nọchiri Herọd nna ya wee na-achị Judia, ọ tụrụ egwu ịgawa ebe ahụ. Ebe ọ bụkwa na Chineke dọrọ ya aka ná ntị ná nrọ,+ ọ banyere na Galili.+ 23  O wee biri n’obodo a na-akpọ Nazaret,+ ka ihe ndị amụma kwuru wee mezuo. Ha sịrị: “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Mezaya; Onye E Tere Mmanụ.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ọ ga-abụ na e si n’okwu Hibru a sụgharịrị “ome” nweta okwu bụ́ “onye Nazaret.”