Ozi Ọma Matiu Dere 14:1-36

  • E gbupụrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim isi (1-12)

  • Jizọs nyere puku ụmụ nwoke ise nri (13-21)

  • Jizọs jere ije n’elu mmiri (22-33)

  • Jizọs gwọrọ ndị ọrịa na Genesaret (34-36)

14  N’oge ahụ, Herọd, onye na-achị ógbè ahụ, nụrụ akụkọ banyere Jizọs+  wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Onye a bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. A kpọlitela ya n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ebube ndị a.”+  Herọd* jidere Jọn, kee ya agbụ, tụọ ya mkpọrọ n’ihi Herodias nwunye Filip nwanne ya.+  N’ihi na Jọn nọ na-asị ya: “Ọ dịghị mma na ị kpọọrọ ya lụwa.”+  Ma, ọ bụ eziokwu na ọ chọrọ igbu ya, ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, n’ihi na ha weere na Jọn bụ onye amụma.+  Ma mgbe a na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ Herọd,+ ada Herodias gbara egwú n’ememme ahụ, wee mee Herọd ezigbo obi ụtọ+  nke na ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-enye ya ihe ọ bụla ọ rịọrọ.  Nwa agbọghọ ahụ kwuziri ihe mama ya sị ya kwuo. Ọ sịrị: “Bunye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim n’efere mbadamba.”+  Ọ bụ eziokwu na ihe a ọ rịọrọ wutere eze, o nyere iwu ka e bunye ya isi Jọn, n’ihi iyi ahụ ọ ṅụrụ n’ihu ndị ha na ya nọ na-eri ihe. 10  O wee ziga ndị gara n’ụlọ mkpọrọ gbupụ Jọn isi. 11  E butere isi ya n’efere mbadamba bunye nwa agbọghọ ahụ, o wee butere ya nne ya. 12  E mechaa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara buru ozu ya gaa lie, bịakwa kọọrọ Jizọs. 13  Mgbe Jizọs nụrụ ihe a, o ji ụgbọ mmiri si ebe ahụ pụọ gaa n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị, ka ọ nọrọ naanị ya. Ma mgbe ìgwè mmadụ matara, ha si obodo dị iche iche jiri ụkwụ sochie ya azụ.+ 14  Mgbe o si n’ụgbọ mmiri pụta, ọ hụrụ ìgwè mmadụ wee metere ha ebere,+ gwọọkwa ndị nke na-arịa ọrịa.+ 15  Ma mgbe o ruru uhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya wee sị: “Ebe a dịpụrụ adịpụ, chi ejiwekwala. Gwa ìgwè mmadụ a ka ha lawa gaa n’obodo ndị dị nso zụrụ nri ha ga-eri.”+ 16  Ma, Jizọs sịrị ha: “Ha ekwesịghị ịla. Nyenụ ha nri ka ha rie.” 17  Ha asị ya: “Ọ dịghị ihe anyị nwere ebe a, ma e wezụga ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ.” 18  Ya asị ha: “Wetaranụ m ha ebe a.” 19  O wee gwa ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala n’ahịhịa. Ya ewerezie ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe kpee ekpere.*+ Mgbe ọ nyawachara achịcha ndị ahụ, o nyere ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya enyewezie ha ìgwè mmadụ ahụ. 20  Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nkata iri na abụọ.+ 21  Ma ndị riri ya dị ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise (5,000), ma e wezụga ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị.+ 22  Ọ gwaziri ndị na-eso ụzọ ya ozugbo ka ha banye n’ụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee osimiri ahụ. Ma, ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa.+ 23  Mgbe ọ gwachara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa, naanị ya gbagoro n’elu ugwu ikpe ekpere.+ Ọ nọkwa ebe ahụ naanị ya ruo mgbede. 24  Ka ọ dịgodị, ụgbọ mmiri ahụ esila n’akụkụ osimiri ahụ gaa ọtụtụ narị mita,* ebili mmiri mekwara ka o sie ike ịkwọ ya, n’ihi na ifufe na-efesi ike. 25  Ma n’oge nche nke anọ nke abalị,* o jeere ije n’elu oké osimiri ahụ na-abịakwute ha. 26  Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri ahụ, obi mapụrụ ha, ha asị: “Ọ bụ mmụọ!” Ha wee tie mkpu n’ihi egwu ha na-atụ. 27  Ma, Jizọs gwara ha ozugbo, sị: “Nweenụ obi ike. Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”+ 28  Pita gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri.” 29  O wee sị: “Bịa.” Pita esizie n’ụgbọ ahụ pụta, jere ije n’elu mmiri ahụ gakwuruwe Jizọs. 30  Ma mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya. Mgbe ọ malitekwara imikpu, o tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta m!” 31  Jizọs matịrị aka ozugbo, jide ya wee sị ya: “Onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”+ 32  Mgbe ha banyere n’ụgbọ ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị. 33  N’ihi ya, ndị nọ n’ụgbọ ahụ kpọọrọ ya isiala, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’eziokwu.” 34  Ha gafere osimiri ahụ pụta n’elu ala na Genesaret.+ 35  Mgbe ndị ebe ahụ matara na ọ bụ Jizọs, ha gwara ndị bi gburugburu obodo ahụ na ọ bịala. Ndị mmadụ wee kpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa. 36  Ha wee na-arịọ ya ka ha bitụ naanị ọnụ ọnụ uwe elu ya aka.+ E mekwara ka ahụ́ dịchaa ndị niile bitụrụ ya aka mma.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ bụ Herọd Antipas. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “gọzie ha.”
Na Grik, “ọtụtụ stediọm.” Otu stediọm bụ mita 185 (amaụkwụ 606.95). Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.
Ya bụ, malite n’ihe dị ka elekere atọ n’ime abalị ruo n’ihe dị ka elekere isii nke ụtụtụ.