Ozi Ọma Mak Dere 8:1-38

  • Jizọs nyere puku ụmụ nwoke anọ nri (1-9)

  • A gwara Jizọs ka o gosi ihe àmà (10-13)

  • Ihe iko achịcha nke ndị Farisii na nke Herọd (14-21)

  • Jizọs gwọrọ onye ìsì na Betsaịda (22-26)

  • Pita kwuru na Jizọs bụ Kraịst (27-30)

  • Jizọs kwuru banyere ọnwụ ya (31-33)

  • Ihe iso ụzọ Jizọs pụtara (34-38)

8  N’ụbọchị ndị ahụ, ìgwè mmadụ gbakọtara ọzọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri. O wee kpọọ ndị na-eso ụzọ ya, sị ha:  “Ana m emetere ìgwè mmadụ a ebere+ n’ihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri.+  Ọ bụrụ na mụ asị ha buru ọnụ lawa n’ụlọ ha, ha ga-atụbọ n’ụzọ. Ụfọdụ n’ime ha sikwa ebe dị anya.”  Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Ebee ka mmadụ ga-esi nweta achịcha ga-eju ndị a afọ n’ebe a dịpụrụ adịpụ?”  O wee jụọ ha, sị: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya: “Asaa.”+  Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ n’ala. O wee buru ogbe achịcha asaa ahụ, kelee Chineke, nyawaa ha ma malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kesaa. Ha wee kesaara ha ìgwè mmadụ ahụ.+  Ha nwekwara obere azụ̀ ole na ole. Ọ gọziri azụ̀ ndị ahụ, gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ha.  Ha wee rie, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara ihe ha rifọrọ, ya eju nkata asaa.+  Ụmụ nwoke riri ihe ahụ dị ihe dị ka puku anọ (4,000). O wee sị ha lawa. 10  Ozugbo ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọ wee bata n’ógbè Dalmanuta.+ 11  N’ebe a, ndị Farisii bịara malite ịrụ ya ụka. Iji nwaa ya, ha gwara ya ka o gosi ha ihe àmà si n’eluigwe.+ 12  O wutere ya nke ukwuu,* ya asị: “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe àmà?+ N’eziokwu, ana m asị na a gaghị egosi ọgbọ a ihe àmà ọ bụla.”+ 13  O wee hapụ ha, banyeghachi n’ụgbọ, ma gaa n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri ahụ. 14  Ma, ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Naanị ihe ha nwere n’ụgbọ ahụ bụ otu ogbe achịcha.+ 15  Jizọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya. Kpacharanụ anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii na ihe iko achịcha Herọd.”+ 16  Ha wee malite ịrụrịta ụka maka na ha ejighị achịcha. 17  Mgbe ọ hụrụ na ha na-arụrịta ụka, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji arụrịta ụka maka na unu ejighị achịcha? Ọ̀ bụ na unu aghọtabeghị ihe m na-ekwu? Ọ̀ ka na-esiri obi unu ike ịghọta ihe? 18  ‘Ọ̀ bụ na unu anaghị ahụ ụzọ n’agbanyeghị na unu nwere anya? Ọ̀ bụ na unu anaghị anụ ihe n’agbanyeghị na unu nwere ntị?’ Ọ̀ bụ na unu echetaghị 19  mgbe m nyawaara puku ụmụ nwoke ise (5,000) ogbe achịcha ise?+ Nkata ole ka unu tụtụjuru ibé achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha sịrị ya: “Iri na abụọ.”+ 20  “Mgbe m nyawaara puku ụmụ nwoke anọ (4,000) ogbe achịcha asaa, nkata ole ka unu tụtụjuru ibé achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha asị ya: “Asaa.”+ 21  O wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu aghọtabeghị ihe m na-ekwu?” 22  Ha wee banye Betsaịda. N’ebe a, ndị mmadụ kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì. Ha rịọkwara ya arịrịọ ka ọ gwọọ ya.+ 23  O wee sere nwoke ahụ kpuru ìsì n’aka, kpọrọ ya pụọ n’obodo nta ahụ. O tere ya asọ mmiri n’anya+ ma bikwasị ya aka, jụọ ya, sị: “Ò nwere ihe ị na-ahụ?” 24  Nwoke ahụ leliri anya ma sị: “Ana m ahụ ndị mmadụ. Ma, ha yiri osisi na-ejegharị ejegharị.” 25  O bikwasịrị nwoke ahụ aka n’anya ọzọ, nwoke ahụ ahụwa ụzọ nke ọma, hụwa ihe niile. 26  O wee gwa ya ka ọ lawa, sị ya: “Abanyela n’obodo nta a.” 27  Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gawaziri n’obodo nta ndị dị na Sizaria Filipaị. Mgbe ha nọ n’ụzọ, ọ malitere ịjụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”+ 28  Ha sịrị ya: “Jọn Onye Na-eme Baptizim.+ Ma ndị ọzọ na-asị na ị bụ Ịlaịja.+ Ndị ọzọ na-asịkwa, otu n’ime ndị amụma.” 29  O wee jụọ ha, sị: “Ma ònye ka ununwa chere na m bụ?” Pita zara ya, sị: “Ị bụ Kraịst.”+ 30  Ọ gwasiri ha ike ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla onye ọ bụ.+ 31  Ọ malitekwara ịkụziri ha na Nwa nke mmadụ ga-ata nnukwu ahụhụ, na ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ajụ ya, na a ga-egbu ya,+ nakwa na ọ ga-ebili ma ụbọchị atọ gachaa.+ 32  N’eziokwu, ọ nọ na-ekwu ya n’ezoghị ọnụ. Ma, Pita kpọpụrụ ya n’akụkụ bido ịbara ya mba.+ 33  O wee tụgharịa, lee ndị na-eso ụzọ ya anya ma baara Pita mba, sị: “Gaa m n’azụ, Setan, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama ọ bụ nke mmadụ.”+ 34  Ọ kpọziri ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya. O wee sị ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya ma buru osisi ịta ahụhụ* ya na-eso m mgbe niile.+ 35  N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta ndụ* ya ga-atụfu ya. Ma, onye ọ bụla nke tụfuru ndụ* ya n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma Chineke ga-azọpụta ya.+ 36  N’eziokwu, olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ* ya?+ 37  Ma ọ bụ, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ* ya?+ 38  N’ihi na onye ọ bụla ihere ịbụ onye na-eso ụzọ m na ihere okwu m na-eme n’ọgbọ a hapụrụ Chineke,* nke na-emekwa mmehie, ihere onye ahụ ga-eme Nwa nke mmadụ+ mgbe ọ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “Ọ sụrụ ude na mmụọ ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Grik, “ọgbọ a na-akwa iko.”