Job 6:1-30
6 Job wee sị:
2 “Ọ dị m ka ya bụrụ na e nwere ike ịtụ nsogbu m+ niile atụ̀,Jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ha na ahụhụ m na-ata.
3 N’ihi na ọ dị arọ karịa ájá dị n’oké osimiri.
Ọ bụ ya mere m ji ekwu okwu n’echeghị echiche.+
4 N’ihi na akụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile agbatala m,Nsí si n’akụ́ ndị ahụ na-abanyekwa m n’ime ahụ́.+
Ọgụ Chineke na-alụso m emeela ka ụjọ zuo m ahụ́.
5 Jakị ọhịa+ ọ̀ ga na-eti mkpu mgbe o nwere ahịhịa ọ ga-ata,Ka ehi ọ̀ ga na-eti mkpu mgbe o nwere ihe ọ ga-eri?
6 À na-eri nri na-anaghị atọ ụtọ n’etinyeghị ya nnu,
Ka mmiri si n’ahịhịa malo ọ̀ na-atọ ụtọ?
7 Ekweghị m* emetụ ụdị ihe ndị ahụ aka.
Ha dị ka nri mebiri emebi.
8 Ọ dị m ka ya bụrụ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,Na Chineke ga-emere m ihe m chọrọ,
9 Na Chineke ga-ekwe zọpịa m,Nakwa na ọ ga-esetị aka ya bibie m.+
10 N’ihi na nke ahụ ga-akasidị m obi.
M ga-amali elu ṅụrịa ọṅụ n’agbanyeghị na ahụ́ na-egbusi m mgbu ike,N’ihi na eledatụbeghị m ihe Onye Nsọ kwuru anya.+
11 Ike ịnọ na-echere ọ̀ dị m?+
Gịnị ka m ga-enweta n’ikpeazụ mere m ka ga-eji dịrị ndụ?
12 M̀ siri ike ka nkume?
Ka ọ̀ bụ ọla kọpa ka e ji mee ahụ́ m?
13 È nwere otú m nwere ike isi nyere onwe m aka
Mgbe a napụrụla m ihe niile na-enyere m aka?
14 Onye ọ bụla na-anaghị ahụ mmadụ ibe ya n’anya*+
Anaghịzi atụ egwu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+
15 Ụmụnne m na-aghọ m aghụghọ+ ka ngele,*Ka ngele ndị na-ata ata.
16 Mmiri kpụkọrọ akpụkọ na-eme ka ha na-eji oji,Snoo na-agbaze agbaze na-ezo n’ime ha.
17 Ma mgbe oge ruru, mmiri anaghịzi adị na ha.
Mgbe okpomọkụ bịara, ha na-ata.
18 Ha na-asọrọ gaa ebe ọzọ.
Ha na-asọba n’ọzara wee taa.
19 Ndị si Tima aga njem+ na-achọ mmiri ndị ahụ.
Ndị si Siba aga njem+ na-ele anya ha.
20 Ihere na-eme ha n’ihi na ha cheburu na ha ga-ahụ mmiri.
Ha bịarutere ebe ahụ ma ha ahụghị ihe ha tụrụ anya ya.
21 Ọ bụ otú a ka unu dị n’ebe m nọ.+
Unu ahụla ahụhụ dị egwu m na-ata, ụjọ abịa unu.+
22 M̀ sịrị unu nye m ihe,
Ka m̀ rịọrọ unu ka unu si n’akụnụba unu nye m onyinye?
23 M̀ rịọrọ unu ka unu napụta m n’aka onye iroMa ọ bụ ka unu zọpụta m n’aka ndị na-emesi mmadụ ike?
24 Kụzierenụ m ihe m ga-eme. M ga-agba nkịtị gee ntị.+
Meenụ ka m ghọta ihe m mejọrọ.
25 Eziokwu anaghị afụ ụfụ.+
Ma olee uru mba unu na-abara m bara?+
26 Ùnu na-achọ otú unu ga-esi tụchasịa ihe m kwuru,Bụ́ okwu onye ike ụwa gwụrụ,+ nke ifufe na-efesasị?
27 Unu ga-efekwa nza n’isi nwa na-enweghị nne na nna,+Reekwa enyi unu.*+
28 Ngwa, tụgharịanụ lee m anya,N’ihi na agaghị m aghara unu ụgha.
29 Biko, cheenụ echiche, unu aghọtahiela m.
Cheenụ echiche ọzọ, n’ihi na m ka bụ onye ezi omume.
30 Ire m ọ̀ na-ekwu ihe na-adịghị mma?
Ọ̀ bụ na enweghị m ike ịmata na ihe adịghị mma?
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m ekweghị.”
^ Ma ọ bụ “egosi mmadụ ibe ya ịhụnanya pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “obere iyi.”
^ Ma ọ bụ “Jirikwa enyi unu gbanweta ihe.”