Job 20:1-29
20 Zofa+ onye Neama kwuru, sị:
2 “Obi ezughị m ike, obi erughịkwa m ala.
Ọ bụ ya mere m ji chọọ ikwu okwu.
3 Anụla m mba a baara m, nke e ji kparịa m.
Ihe m ghọtara na-emekwa ka m saa gị okwu.
4 O doro anya na ị ma ihe a kemgbe,N’ihi na ọ dị otú a kemgbe e kere mmadụ,*+
5 Na mkpu ọṅụ ndị ajọ omume na-eti anaghị adịte aka,Nakwa na ọ bụ naanị obere oge ka onye na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-aṅụrị ọṅụ.+
6 Ọ bụrụgodị na mpako ya ruru n’eluigwe,Isi ya ana-emetụkwa n’ígwé ojii,
7 Ọ ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi otú nsị ya si ala n’iyi.
Ndị na-ahụbu ya ga-asị, ‘Olee ebe ọ nọ?’
8 A ga-echefu ya otú e si echefu nrọ.
A ga-echefu ya otú e si echefu ọhụụ a hụrụ n’abalị.
9 Anya hụburu ya agaghị ahụ ya ọzọ,A gaghịkwa ahụ ya ọzọ n’ụlọ ya.+
10 Ụmụ ya ga-arịọ ndị ogbenye ka ha meere ha amara,Ọ ga-ejikwa aka ya nyeghachi ndị ọzọ akụ̀ ọ naara ha.+
11 Ike okorobịa juru ya ahụ́,Ma ike ka ga-eju ya n’ahụ́ ya anwụọ.
12 Ọ bụrụ na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ n’ọnụ,Ọ bụrụ na o zoo ya n’okpuru ire ya,
13 Ọ bụrụ na ọ kpụrụ ya n’ọnụ ya,Ya ana-atọ ya ụtọ, ọ chọghịkwa ilo ya ngwa ngwa,
14 Nri ahụ ga-agba ụka n’ime afọ ya.
Ọ ga-adị ka elò agwọ ubí n’ime ahụ́ ya.
15 O loola akụnụba, ma ọ ga-agbọpụta ya.
Chineke ga-eme ka o si n’afọ ya pụta.
16 Ọ ga-amịrị elò agwọ ubí.
Ajụala ga-eji ezé ya tagbuo ya.*
17 Ọ gaghị ahụ mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi,Bụ́ ndị na-asọ ka iyi.
18 Ọ ga-eweghachi akụ̀ ọ kpatara, n’erighị ya eri.
Ọ gaghị eri akụ̀ ọ na-akpata n’ahịa ọ na-azụ.+
19 N’ihi na o chiela ndị ogbenye ọnụ n’ala, gbahapụkwa ha.
O werela ụlọ ọ na-abụghị ya rụrụ.
20 Ma obi agaghị ezu ya ike.
Akụnụba ya agaghị azọpụta ya.
21 E nweghị ihe ọ ga-anapụ mmadụ.
Ọ bụ ya mere na ihe agaghị anọ na-agara ya nke ọma.
22 Mgbe akụnụba ya ga-eju ebe niile, ọ ga-echegbuwe onwe ya.
Ihe ọjọọ niile ga-abịara ya.
23 Mgbe ọ na-eri ihe ka o rijuo afọ,Chineke* ga-ewesa ya ezigbo iwe,Mee ka iwe ya zuo ya ahụ́ ka ebe mmiri mazuru mmadụ ahụ́.
24 Mgbe ọ na-agbapụ ka ngwá agha ndị e ji ígwè rụọ ghara imerụ ya ahụ́,Ụta e ji ọla kọpa rụọ ga-agbapu ya ahụ́.
25 Ọ na-efopụ ụta a gbara ya n’azụ,Ụta na-egbu maramara a gbara ya n’elo* ya.
Ụjọ na-ejide ya.+
26 A ga-awụfu akụnụba ya niile n’ebe gbara oké ọchịchịrị.
Ọkụ a na-enweghị onye fụnwuru ya ga-eregbu ya.
Ọdachi ga-abịara onye ọ bụla fọrọ ndụ n’ụlọikwuu ya.
27 Eluigwe ga-ekpughe mmehie ya.
Ụwa ga-emegide ya.
28 Idei mmiri ga-ebupụ ụlọ ya.
Mmiri ga-ezosi ike n’ụbọchị iwe Chineke.*
29 Ọ bụ ihe a ka onye ajọ omume ga-eketa n’aka Chineke.
Ọ bụ ihe Chineke kwuru na a ga-ekenye ya.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ụmụ mmadụ; Adam.”
^ Ma ọ bụ “onye kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ.”
^ Na Hibru, “ire ya gbuo ya.”
^ Na Hibru, “Ọ.”
^ Ma ọ bụ “n’akpa ilu.”
^ Na Hibru, “ya.”