Jeremaya 5:1-31
5 Gagharịanụ n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem.
Legharịakwanụ anya nke ọma.
Chọọkwanụ n’ámá ya dị iche icheMa è nwere onye na-eme ihe dị mma+Nakwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
E nwee, m ga-agbaghara obodo a.
2 Ọ bụrụgodị na ha asị: “Anyị ji Jehova bụ́ Chineke dị ndụ na-aṅụ iyi!”
Ha ka ga na-aṅụ iyi ụgha.+
3 Jehova, ọ́ bụghị ndị na-erubere gị isi ka anya gị na-achọ ịhụ?+
I tiri ha ihe, ma o metụghị ha n’ahụ́.*
I bibiri ọtụtụ n’ime ha, ma ha anabataghị aka ná ntị ị dọrọ ha.+
Ha mere ka ihu ha sie ike karịa oké nkume.+
Ha jụrụ ịlọghachikwute gị.+
4 Ma m gwara onwe m, sị: “N’eziokwu, ndị a amaghị nke a na-akọ.
Ha zuzuru nzuzu, n’ihi na ha amaghị uche* Jehova,Ya bụ, ihe Chineke ha chọrọ ka ha mee.
5 M ga-agakwuru ndị a ma ama ma gwa ha okwu,N’ihi na hanwa amarala uche Jehova,Ya bụ, ihe Chineke ha chọrọ ka ha mee.+
Ma, ha niile agbajiela yok ha,*Dọbichaakwa agbụ e kere ha.”
6 Ọ bụ ya mere ọdụm ji esi n’oké ọhịa apụta na-adọri ha.
Anụ ọhịa wolf esikwa n’ọzara na-emebisị ihe ha nwere.
Agụ owuru mụkwa anya makpuru n’obodo ha dị iche iche.
Ọ na-adọgbu onye ọ bụla si n’ime ha na-apụta.
N’ihi na mmehie ha dị ọtụtụ.
Ha enupụkwala isi ọtụtụ ugboro.+
7 Olee otú m ga-esi gbaghara gị ihe a?
Ụmụ gị ahapụla m.
Ha na-ejikwa chi ndị na-abụghị Chineke aṅụ iyi.+
M na-enye ha ihe ọ bụla dị ha mkpa,Ma ha nọ na-akwa iko.
N’ụlọ nwaanyị akwụna ka ha na-ekworo aga.
8 Ha dị ka oké ịnyịnya ọ dị ọkụ n’ahụ́ ịgba nne ịnyịnya.
Onye nke ọ bụla na-ebe ubé ka ịnyịnya wee na-achụ nwunye onye ọzọ.+
9 Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ime ka ha zaa ajụjụ maka ihe ndị a?
Ka ọ̀ bụ na mụ* ekwesịghị ịta mba dị otú a ahụhụ maka ihe ha na-eme?”+
10 “Gaanụ Jeruselem bibie osisi vaịn ndị dị na ya,Ma unu alala ihe niile n’iyi.+
Gbupụnụ alaka ya ndị pulitere ọhụrụ,N’ihi na ọ bụghị Jehova nwe ha.
11 N’ihi na ndị Izrel na ndị JudaEgosila m na ha na-aghọ ncha n’aghụghọ.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.+
12 “Ha agọnahụla Jehova, na-asịkwa:
‘O nweghị ihe ọ ga-eme.*+
Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.
Anyị agaghị ahụ agha ma ọ bụ ụnwụ.’+
13 Ndị amụma ha dị ka ifufe.
Okwu Chineke adịghịkwa n’obi ha.
Ka ha laakwa n’iyi.”
14 Ọ bụ ya mere Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, ji kwuo, sị:
“Ebe ọ bụ na ndị a na-ekwu ihe a,M ga-eme ka okwu m ghọọ ọkụ n’ọnụ gị.+
Ndị a ga-abụkwa nkụ.
Ọkụ ahụ ga-eregbukwa ha.”+
15 Jehova kwuru, sị, “Ndị Izrel, m ga-eme ka mba si ebe dị anya bịa lụso unu agha.+
Ọ bụ mba dịterela aka,Mba dịwara kemgbe oge ochie,Mba unu na-amaghị asụsụ ha,Mba unu na-enweghịkwa ike ịghọta ihe ha na-ekwu.+
16 Akpa akụ́ ha dị ka ili ghere oghe.
Ha niile bụ ndị dike n’agha.
17 Ha ga-erichapụ ihe unu wetara n’ubi na ihe oriri unu.+
Ha ga-egbu ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị.
Ha ga-erichapụ ìgwè ewu na atụrụ unu na ìgwè ehi unu.
Ha ga-erichapụ osisi vaịn unu na osisi fig unu.
Ha ga-eji mma agha bibie obodo unu dị iche iche a rụsiri ike, bụ́ ndị kara unu obi.”
18 Jehova kwukwara, sị, “N’agbanyeghị ihe ndị a niile ga-eme unu n’oge ahụ, agaghị m ebibi unu kpamkpam.+
19 Ọ bụrụkwa na ha ajụọ, sị, ‘Gịnị mere Jehova bụ́ Chineke anyị ji mee anyị ihe a niile?’ ị ga-asị ha, ‘Otú ahụ unu hapụrụ m gaa na-efe chi ndị mba ọzọ n’ala unu, otú ahụ ka unu ga na-ejere ndị mba ọzọ ozi ná mba na-abụghị nke unu.’”+
20 Kọọnụ ihe a n’ezinụlọ Jekọb,Kọsaakwanụ na Juda, sị:
21 “Ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche, nụrụnụ ihe a:+
Unu nwere anya ma unu anaghị ahụ ụzọ.+
Unu nwere ntị ma unu anaghị anụ ihe.+
22 Jehova kwuru, sị, ‘Gịnị mere na unu anaghị asọpụrụ m?
Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịma jijiji n’ihi m?
Ọ bụ mụnwa ji ájá kpaara oké osimiri ókè.
Ọ ga-adịgidekwa otú ahụ. Ọ gaghị asọfeli ókè ya.
Ọ bụ eziokwu na mmiri ya ga na-amali elu, ma ọ gaghị asọfeli ókè ya.
Ọ bụ eziokwu na ọ na-eme mkpọtụ, ma ọ gaghị asọfeli ókè ya.+
23 Ma obi ndị a kpọchiri akpọchi. Ha na-enupụkwa isi.
Ha ahapụla m, na-eme ihe ọ bụla masịrị ha.+
24 Ha anaghịkwa ekwu n’obi ha, sị:
“Ka anyị tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị,Onye na-eme ka mmiri zoo n’oge ya,Ma n’ụbịa mmiri ma n’ụla mmiri.
Ọ bụkwa ya na-ahụ na anyị nwere izu a kapịrị ọnụ anyị ga-eji wee ihe ubi anyị.”+
25 Omume ọjọọ unu emeela ka unu ghara inweta ezigbo ihe ndị a.
Mmehie unu emeela ka ihe ọma ghara iru unu aka.+
26 N’ihi na e nwere ụfọdụ n’ime ndị m bụ́ ndị ajọ omume.
Ha na-enyogharị anya, dị ka mgbe ndị na-achụ nta nnụnụ hulatara ala.
Ha na-esi ọnyà nwere ike igbu mmadụ.
Ọ bụ ndị mmadụ ka ha na-amata n’ọnyà.
27 Dị ka nnụnụ si eju ná ngịga,Otú ahụ ka ihe ndị ha gwutere na wayo si eju n’ụlọ ha.+
Ọ bụ ya mere ha ji bụrụ ndị ukwu ma baa ọgaranya.
28 Ha ebuola ibu, ahụ́ ha ana-akwọkwa mụrụmụrụ.
Ihe ọjọọ ha na-eme karịrị akarị.
Ha anaghị ekpechite ọnụ nwa na-enweghị nna,+Maka na ha na-achọ ka ihe na-agaziri hanwa.
Ha na-ekpekwa ndị ogbenye ikpe mkpegbu.’”+
29 Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ime ka ha zaa ajụjụ maka ihe ndị a?
Ka ọ̀ bụ na mụ* ekwesịghị ịta mba dị otú a ahụhụ maka ihe ha na-eme?
30 A kpaala arụ n’ala a, meekwa ihe jọgburu onwe ya na ya:
31 Ndị amụma na-ebu amụma ụgha.+
Ndị nchụàjà na-ejikwa ikike ha nwere emegbu ndị mmadụ.
Ọ dịkwa ndị m mma otú ahụ.+
Ma, gịnị ka unu ga-eme mgbe ihe ndị a niile ga-ebi?”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “ike agwụghị ha.”
^ Na Hibru, “ụzọ.”
^ Yok a pụtara ịnọ n’okpuru Chineke.
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ọ dịghị adị.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”