Jenesis 49:1-33

  • Amụma Jekọb buru mgbe ọ na-anwụ (1-28)

    • Shaịlo ga-esi n’agbụrụ Juda (10)

  • Jekọb kwuru ebe ọ chọrọ ka e lie ya (29-32)

  • Jekọb nwụrụ (33)

49  Jekọb kpọrọ ụmụ ya ndị nwoke, sị ha: “Zukọtanụ ka m gwa unu ihe ga-eme ná ndụ unu n’ọdịnihu.*  Unu ụmụ Jekọb, zukọtanụ gee ntị. Geenụ Izrel nna unu ntị.  “Ruben,+ ọ bụ gị bụ ọkpara m,+ ike m na onye m bu ụzọ mụọ.* Ọ bụ gị ka a kacha akwanyere ùgwù, ọ bụkwa gị kacha dị ike.  Ma, ị gaghị akarị ụmụnne gị ebe ọ bụ na i mere ka idei mmiri na-ekwo ekwo wee ghara ijide onwe gị, n’ihi na i dinara nwunye* nna gị.+ N’eziokwu, i dinara nwunye m. Ọ bụ ihe i mere.  “Simiọn na Livaị bụ ụmụnne.+ Ha ji mma agha ha gbuo ndị mmadụ.+  Mkpụrụ obi m,* gị na ha akpala. Obi m,* esonyela n’òtù ha, n’ihi na ha ji iwe gbuo ụmụ nwoke,+ ha sekwara ehi akwara iji mee onwe ha obi ụtọ.  Ana m abụ iwe ha na ọnụma ha ọnụ n’ihi na o mere ka ha mee ihe jọgburu onwe ya na ihe na-agbawa obi.+ Ka m kesaa ha n’ebe dị iche iche n’ala Jekọb, ka m meekwa ka ha gbasasịa n’ala Izrel.+  “Ma Juda,+ ụmụnne gị ga-eto gị.+ Ị ga-emeri ndị iro gị.*+ Ndị nna gị mụrụ ga-akpọrọ gị isiala.+  Juda bụ nwa ọdụm.+ Nwa m, ị ga-ebili ma i richaa anụ i gburu. Ọ makpurula, ọ gbatịakwala onwe ya ka ọdụm. Ebe ọ dị ka ọdụm, ònye ga-anwa anwa chọọ ya okwu? 10  Mkpanaka eze agaghị apụ apụ na Juda,+ mkpara onye na-achị achị agaghịkwa apụ n’agbata ụkwụ ya, ruo mgbe Shaịlo* ga-abịa.+* bụ ya ka mba dị iche iche ga-erubere isi.+ 11  Ọ ga-eliwe jakị ya n’osisi vaịn, liwekwa nwa jakị ya n’ezigbo osisi vaịn. Ọ ga-eji mmanya saa ákwà ya, jirikwa mmanya a zọchapụtara ná mkpụrụ vaịn saa uwe ya. 12  Anya ya na-acha ọbara ọbara n’ihi mmanya, ezé ya na-achakwa ọcha n’ihi mmiri ara ehi.* 13  “Zebulọn+ ga-ebi n’ụsọ oké osimiri, n’ikpere mmiri ebe a na-adọsa ụgbọ mmiri.+ Ngwụcha ngwụcha ókè ya ga-abụ n’ebe gawara Saịdọn.+ 14  “Ịsaka+ bụ jakị ọkpụkpụ ya siri ike, nke bu ibu abụọ e bukwasịrị ya makpuru ala. 15  Ọ ga-achọpụta na ebe ọ na-ezu ike dị mma nakwa na ala ahụ mara mma. Ọ ga-ehulata ubu ya buru ibu na-anyị arọ, ọ ga-arụkwa ọrụ a manyere ya ịrụ. 16  “Dan+ ga-ekpe ndị ya ikpe. Ọ bụ otu n’ime ebo e nwere n’Izrel.+ 17  Ka Dan bụrụ agwọ nọ n’akụkụ ụzọ, agwọ nwere mpi nke nọ n’akụkụ ụzọ, nke na-ata ịnyịnya arụ n’ikiri ụkwụ, onye na-agba ya ejiri azụ daa.+ 18  Jehova, m ga-echere ruo mgbe ị ga-azọpụta anyị. 19  “Gad,+ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ga-alụso gị ọgụ, ma ị ga-achụrụ ha n’azụ lụso ha ọgụ.+ 20  “Asha+ ga-enweju nri* enweju, ọ ga na-emepụtakwa ụdị nri ndị eze na-eri.+ 21  “Naftalaị+ bụ nne ele dị garagara. Ọ na-ekwu okwu na-atọ ụtọ.+ 22  “Josef+ bụ alaka nke osisi na-amị mkpụrụ. Ọ bụ alaka nke osisi dị n’akụkụ isi mmiri. Alaka osisi ahụ na-awasa gafere mgbidi. 23  Ma ndị na-agba ụta kpọrọ ya asị. Ha nọ na-enye ya nsogbu, ha gbakwara ya ụta.+ 24  Ma ọ mịpụtaghị ụta ya,+ aka ya sikwara ike ma dị garagara.+ Onye mere ka ọ dị otú ahụ bụ dike na-enyere Jekọb aka, ya bụ, onye na-azụ ya ka atụrụ, onye bụ́kwa nkume Izrel. 25  O* si n’aka Chineke nke nna ya, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nọnyekwaara ya. Ọ ga-enyere gị aka ma gọzie gị. Ọ ga-enye gị mmiri si n’eluigwe na mmiri dị n’osimiri,+ nyekwa gị ọtụtụ ụmụ na ọtụtụ anụ ụlọ. 26  Ngọzi nna gị gọziri gị ga-akarị ihe ọma ndị a na-enweta ná nnukwu ugwu ndị na-adịru mgbe ebighị ebi, karịakwa ihe ndị bara ezigbo uru a na-enweta n’obere ugwu ndị na-adịte aka.+ Ọ bụ Josef, onye a họpụtara n’ime ụmụnne ya, ga na-enweta ngọzi ndị a.*+ 27  “Benjamin+ ga na-adọri ndị iro ya otú anụ ọhịa wolf si adọri anụ.+ N’ụtụtụ, ọ ga-eri ndị iro ya ka anụ. Ná mgbede, ọ ga-eke ihe ndị ọ kwatara.”+ 28  Ọ bụ ná ndị a niile ka e si nweta ebo iri na abụọ nke Izrel. Ọ bụ ihe ndị a ka nna ha gwara ha mgbe ọ na-agọzi ha. Ọ gọziri onye nke ọ bụla n’ime ha otú kwesịrị ekwesị.+ 29  Mgbe ọ gọzichara ha, o nyere ha iwu, sị: “M na-aga ịnwụ otú nna m hà nwụrụ.+ Lienụ m n’ebe e liri nna m hà, n’ọgba dị n’ala Ifrọn onye Het.+ 30  Ọgba ahụ dị n’ala dị na Mak-pila, n’ihu Mamri nke dị na Kenan. Ala ahụ bụ ala Ebreham zụrụ Ifrọn onye Het ka ọ bụrụ ebe ọ ga na-eli ozu. 31  Ọ bụ n’ebe ahụ ka e liri Ebreham na Sera nwunye ya.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka e liri Aịzik+ na Ribeka nwunye ya, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m liri Lia. 32  Ọ bụ ụmụ Het ka a zụrụ ala ahụ na ọgba dị na ya.”+ 33  Otú a ka Jekọb si nyechaa ụmụ ya ndị nwoke ntụziaka. Ọ chịgoziri ụkwụ ya n’àkwà* ya, dinara ala ma kubie ume. O wee nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ná ngwụcha ụbọchị ndị ahụ.”
Ma ọ bụ “onye mbụ m ji ike m ji amụ nwa mụọ.”
Na Hibru, “ị rịgooro n’àkwà.”
Ma ọ bụ “Ùgwù m.”
Na Hibru, “Aka gị ga-adị n’olu ndị iro gị.”
Shaịlo pụtara “Onye Ọ Bụ nke Ya.”
Ọ ga-abụ Shaịlo ka a na-ekwu.
Ihe a pụtara na Juda ga-enweju mmanya na mmiri ara ehi enweju.
Na Hibru, “achịcha.”
Ya bụ, Josef.
Na Hibru, “Ha ga na-adị n’isi Josef.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”