GOSI M NKE Akwụkwọ Baịbụl Jenesis Ọpụpụ Levitikọs Ọnụ Ọgụgụ Diuterọnọmi Joshụa Ndị Ikpe Rut 1 Samuel 2 Samuel 1 Ndị Eze 2 Ndị Eze 1 Ihe E Mere 2 Ihe E Mere Ezra Nehemaya Esta Job Abụ Ọma Ilu Ekliziastis Abụ Solomọn Aịzaya Jeremaya Abụ Ákwá Ezikiel Daniel Hosia Joel Emọs Obedaya Jona Maịka Nehọm Habakọk Zefanaya Hagaị Zekaraya Malakaị Matiu Mak Luk Jọn Ọrụ Ndịozi Ndị Rom 1 Ndị Kọrịnt 2 Ndị Kọrịnt Ndị Galeshia Ndị Efesọs Ndị Filipaị Ndị Kọlọsi 1 Ndị Tesalonaịka 2 Ndị Tesalonaịka 1 Timoti 2 Timoti Taịtọs Faịlimọn Ndị Hibru Jems 1 Pita 2 Pita 1 Jọn 2 Jọn 3 Jọn Jud Mkpughe Isiokwu 1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 Akwụkwọ Ilu Isi 1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 Ihe Ndị Dị na Ya 1 Ihe mere e ji dee ilu (1-7) Nsogbu iso ndị enyi ọjọọ na-akpata (8-19) Ezigbo amamihe na-eti mkpu n’ámá obodo (20-33) 2 Uru amamihe bara (1-22) Chọọ amamihe otú e si achọ akụ̀ zoro ezo (4) Ichebara ihe echiche nke ọma na-echebe mmadụ (11) Ịkwa iko na-akpata nsogbu (16-19) 3 Mara ihe ma tụkwasị Jehova obi (1-12) Jiri ihe ndị kacha mma na-efe Jehova (9) Amamihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ (13-18) Amamihe na-echebe mmadụ (19-26) Na-emeso ndị ọzọ ihe otú dị mma (27-35) Meere ndị ọzọ ihe ọma ma ọ bụrụ na ị ga-emeli ya (27) 4 Ezigbo ntụziaka nna nyere nwa ya (1-27) Ka amamihe soro n’ihe ndị ị ga-enweta (7) Zere ụzọ ọjọọ (14, 15) Ìhè na-enwusikwu ike n’ụzọ ndị ezi omume (18) “Chebe obi gị” (23) 5 Aka ná ntị a dọrọ banyere nwaanyị na-akwa iko (1-14) Ka gị na nwunye gị na-aṅụrị ọṅụ (15-23) 6 Kpachara anya otú i si ana ndị mmadụ n’ibé (1-5) “Gị onye umengwụ, gakwuru ndanda” (6-11) Onye nzuzu nke bụ́kwa onye ajọ omume (12-15) Ihe asaa Jehova kpọrọ asị (16-19) Kpachara anya maka nwaanyị ọjọọ (20-35) 7 Na-edebe iwu Chineke ka i wee dị ndụ (1-5) A ratara nwa okorobịa na-amaghị ihe (6-27) “Ka oké ehi nke na-aga n’ebe a ga-egbu ya” (22) 8 Ihe amamihe kwuru (1-36) ‘Abụ m nke mbụ n’ime ihe niile Chineke kere’ (22) ‘M nọ n’akụkụ Chineke na-arụ ọrụ’ (30) ‘Ihe gbasara ụmụ mmadụ na-eme m obi ụtọ’ (31) 9 Ezigbo amamihe na-akpọ òkù (1-12) “M ga-eme ka ị dịtee ndụ aka” (11) Nwaanyị nzuzu na-akpọ òkù (13-18) “Mmiri e zutere ezute na-atọ ụtọ” 17) ILU SOLOMỌN (10:1–24:34) 10 Nwa ma ihe na-eme nna ya obi ụtọ (1) Onye na-arụsi ọrụ ike ga-aba ọgaranya (4) Ọtụtụ okwu na-akpata mmehie (19) Ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya (22) Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ogologo ndụ (27) 11 Ndị dị umeala n’obi na-ama ihe (2) Onye kwụsịrị ife Chineke na-ala ndị ọzọ n’iyi (9) “Ihe na-aga nke ọma ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ” (14) Ihe ga-agaziri onye na-emesapụ aka (25) Ihe agaghị agaziri onye tụkwasịrị obi n’akụnụba ya (28) 12 Onye na-ejighị mba a na-abara ya kpọrọ ihe enweghị uche (1) ‘Okwu e kwuru n’echeghị echiche dị ka ịma mmadụ mma’ (18) Ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ (20) Jehova kpọrọ ndị na-agha ụgha asị (22) Nchegbu na-eme ka ike gwụ mmadụ (25) 13 Ndị na-achọ ka a dụọ ha ọdụ ma ihe (10) Ike na-agwụ mmadụ ma ihe ọ na-atụ anya ya emezubeghị (12) Onye ozi a tụkwasịrị obi na-eweta ozi bara uru (17) Onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe (20) Onye hụrụ nwa ya n’anya na-adọ ya aka ná ntị (24) 14 Onye ọ bụla ma ihe na-ewute ya n’obi (10) Ihe dị mma n’anya mmadụ nwere ike ibute ọnwụ (12) Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile (15) Ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi (20) Ahụ́ na-adị mmadụ mma ma obi ruo ya ala (30) 15 Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi zaa ya okwu (1) Anya Jehova na-ahụ ihe niile (3) Ekpere ndị ezi omume na-eme Chineke obi ụtọ (8) Atụmatụ na-aghasasị ma a gbaghị izu (22) Na-atụgharị uche tupu ị zaghachi 16 Jehova na-enyocha ihe mmadụ bu n’obi (2) Tinye ihe ọ bụla ị na-eme n’aka Jehova (3) Ọ bụ Jehova nwe ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe (11) Nganga na-ala mmadụ n’iyi (18) Isi awọ́ bụ okpueze mara mma (31) 17 Ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọma (13) Tupu esemokwu amalite, pụọ (14) Ezigbo enyi hụrụ enyi ya n’anya mgbe niile (17) “Obi ụtọ bụ ezigbo ọgwụ” (22) Onye ma ihe anaghị ekwu ọtụtụ okwu (27) 18 Onye na-anọ iche na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru (1) Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike (10) Ọgaranya na-ewere akụ̀ ya ka ihe na-echebe ya (11) Ọ dị mma igecha mmadụ abụọ na-ese okwu ntị (17) E nwere enyi hụrụ enyi ya n’anya karịa nwanne ya (24) 19 Mmadụ ghọta ihe, ọ gaghị ewe iwe ọsọ ọsọ (11) Nwaanyị na-esekarị okwu yiri elu ụlọ na-ehi mmiri (13) Jehova na-enye mmadụ nwaanyị nwere uche (14) Dọọ nwata aka ná ntị mgbe olileanya ka dị (18) Ịnụrụ ndụmọdụ bara uru (20) 20 Mmanya na-eme ka a chịwa mmadụ ọchị (1) Onye umengwụ anaghị akọ ihe n’oge oyi (4) Ihe mmadụ na-eche n’obi ya dị ka mmiri miri emi (5) Ikwe nkwa n’echeghị echiche adịghị mma (25) Mma ụmụ okorobịa bụ ike ha (29) 21 Jehova na-eme ka obi eze gaa ebe ọ chọrọ (1) Ime ihe ziri ezi dị mma karịa ịchụ àjà (3) Ịrụsi ọrụ ike na-eme ka ihe gaziere mmadụ (5) A gaghị aza onye na-anaghị ege onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ntị (13) E nweghị amamihe ga-aghasali nzube Jehova (30) 22 Inwe ezigbo aha ka inweju akụnụba mma (1) E bido n’oge zụwa nwata, ọ gaghị ahapụ ihe ọ mụtara (6) Onye umengwụ na-atụ ụjọ na ọdụm nọ n’èzí (13) Ịdọ aka ná ntị na-eme ka nzuzu kwụsị (15) Onye ma ọrụ ya nke ọma na-eguzo n’ihu ndị eze (29) 23 Kpachara anya ma a kpọọ gị oriri (2) Achụla akụnụba (4) Akụ̀ ị kpatara nwere ike ipu nku fepụ (5) Esola ná ndị na-aṅụ oké mmanya (20) Mmanya na-ata ka agwọ (32) 24 Enwerela ndị ọjọọ anyaụfụ (1) A na-eji amamihe arụ ụlọ (3) Onye ezi omume nwere ike ịda, ma ọ ga-ebili (16) Emegwarala ihe e mere gị (29) Ihi ụra na-eme ka mmadụ daa ogbenye (33, 34) ILU SOLOMỌN NKE NDỊ NA-EJERE EZE HEZEKAYA OZI DERE (25:1–29:27) 25 Akọsala ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ nụ (9) Okwu e kwuru n’oge kwesịrị ekwesị (11) Agala n’ụlọ mmadụ mgbe niile (17) Kpokwasị icheku ọkụ n’isi onye iro gị (21, 22) Akụkọ ọma dị ka mmiri jụrụ oyi (25) 26 Ihe onye umengwụ na-eme (13-16) Etinyela ọnụ n’esemokwu na-agbasaghị gị (17) Zere egwuregwu na-enweghị isi (18, 19) Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ (20, 21) Okwu onye na-ekwutọ mmadụ dị ka nri na-atọ ụtọ (22) 27 Mba mmadụ baara enyi ya bara uru (5, 6) Nwa m, mee m obi ụtọ (11) A na-eji ígwè amụcha ígwè (17) Mara ìgwè atụrụ gị (23) Akụnụba anaghị adịru ebighị ebi (24) 28 Ekpere onye na-anaghị eme ihe iwu kwuru bụ ihe arụ (9) A na-emere onye kwupụtara mmehie ya ebere (13) Onye chọrọ ịba ọgaranya ọsọ ọsọ ga-etinye aka n’ihe ọjọọ (20) Ịbara mmadụ mba dị mma karịa ito ya otuto elu ọnụ (23) nweghị ihe ga-akọ onye na-enye ogbenye ihe (27) 29 Nwa na-eme otú masịrị ya na-emenye nne ya ihere (15) N’ebe a na-enweghị ọhụụ, ndị mmadụ na-eme ihe masịrị ha (18) Onye na-ewe iwe na-eme ka e sewe okwu (22) A na-akwanyere onye dị umeala n’obi ùgwù (23) Ịtụ mmadụ egwu na-eme ka mmadụ ma n’ọnyà (25) 30 OKWU EGỌ KWURU (1-33) Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba (8) Ihe ndị afọ na-anaghị eju eju (15, 16) Ihe ndị na-agba mmadụ gharịị (18, 19) Nwaanyị na-akwa iko (20) Ihe ndị ma nnọọ ihe (24) 31 OKWU EZE LEMUEL (1-31) Ònye ga-achọtali ezigbo nwaanyị? (10) Ọ na-arụsi ọrụ ike (17) Obiọma na-achị ire ya (26) Ụmụ ya na di ya na-aja ya mma (28) Mma na-ala ala (30) Laghachi Gaa n'Ọzọ Bipụta Ya Zigara Ya Onye Ọzọ Zigara Ya Onye Ọzọ Ilu—Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ A BAỊBỤL NSỌ NKE NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ (NKE E DEGHARỊRỊ N'AFỌ 2021) Ilu—Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ A Igbo Ilu—Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ A https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1001061100/univ/wpub/1001061100_univ_sqr_xl.jpg nwt Ilu p. 949-950