Hosia 5:1-15
-
A mara Ifrem na Juda ikpe (1-15)
5 ““Ndị nchụàjà,+ nụrụnụ okwu a.
Ndị Izrel, ṅaakwanụ ntị.
Ndị si n’ezinụlọ eze, geekwanụ ntị,Maka na ọ bụ unu ka a ga-ekpe ikpe a,N’ihi na unu bụ ọnyà e siri na Mizpa,Bụrụkwa ụgbụ e ji sie ọnyà na Tebọ.+
2 Ndị nupụụrụ m isi* jizi oge ha niile na-egbu* anụ e ji achụ àjà.
M ga-adọkwa ha niile aka ná ntị.*
3 Ama m Ifrem,Izrel ezoghịkwa ezo n’anya m.
Ugbu a, Ifrem, gị na ọtụtụ ụmụ nwaanyị akwaala iko.*
Izrel emerụọla onwe ya.+
4 Omume ha ekweghị ha lọghachikwute Chineke ha,N’ihi na obi ha dị n’ịgba akwụna.*+
Ha amaghịkwa Jehova.
5 Ihe Izrel ji anya isi agbagidela ya akaebe.*+
Ma Izrel ma Ifrem adaala n’ihi mmehie ha.
Juda esorokwala ha daa.+
6 Ha chị ìgwè atụrụ ha na ìgwè ehi ha gaa ịchọ Jehova,Ma ha achọtaghị ya.
Ọ hapụla ha.+
7 Ha emechuola Jehova ihu,+N’ihi na ha amụọla ụmụ bụ́ ndị mba ọzọ.*
N’ime otu ọnwa, a ga-ebibi ha na ihe ndị ha ketara.*
8 Fụọnụ opi+ na Gibia, fụọkwanụ opi na Rema.+
Tienụ mkpu agha na Bet-even.+ Benjamin, anyị so gị n’azụ.
9 Ifrem, ihe a ga-eme gị n’ụbọchị a ga-ata gị ahụhụ ga-adị egwu.+
Emeela m ka ebo niile n’Izrel mata ihe ga-emerịrị.
10 Ndị isi Juda dị ka ndị na-ewela ihe e ji kpaa ókè ala azụ.+
M ga-awụsa ha iwe m dị ka mmiri.
11 E mekpaala Ifrem ahụ́. Ngwepịa e gwepịara ya kwesịrị ekwesị,N’ihi na o kpebisiri ike iso onye iro ya.+
12 M ga-eri Ifrem otú egu* si erichapụ osisi,M ga-emekwa ka Juda rekasịa otú osisi si erekasị.
13 Mgbe Ifrem hụrụ ọrịa ọ na-arịa, Juda ahụkwa ọnyá nke dị ya n’ahụ́,Ifrem gara Asiria+ zigara eze ukwu ndị ozi.
Ma ọ gwọlighị unu.
O melighịkwa ka ọnyá unu laa.
14 M ga-adị ka ọdụm n’anya Ifrem,M ga-adịkwa ka ọdụm siri ike n’anya ndị Juda.
M ga-adọrisị ha.+ M ga-agakwa buru ha.
O nweghịkwa onye ga-anapụta ha.+
15 M ga-alaghachi ebe m si ruo mgbe ha ji isi ha buru ihe ha metara.
Ha ga-achọkwa ka m meere ha amara.*+
Mgbe ihe siiri ha ike, ha ga-achọ m.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Ndị dapụrụ adapụ.”
^ Ma ọ bụ “emikpuola onwe ha n’igbu.”
^ Ma ọ bụ “M ga-atakwa ha niile ahụhụ.”
^ Ma ọ bụ “gị na ndị akwụna akwaala iko.”
^ Ma ọ bụ “n’ịkwa iko.”
^ Na Hibru, “agbagidela ya akaebe n’ihu ya.”
^ O nwere ike ịbụ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ mụtaara ha ụmụ ndị ahụ, nke mere ka ụmụ ahụ na Chineke ghara ịdị ná mma.
^ Ma ọ bụ “ala ha.”
^ N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.
^ Na Hibru, “Ha ga-achọkwa ihu m.”