Ezikiel 47:1-23

  • Mmiri si n’ụlọ nsọ sọrọ na-aga (1-12)

    • Mmiri ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-eto (2-5)

    • E mere ka Osimiri Nnu dị mma (8-10)

    • A gaghị eme ka ebe dị apịtị apịtị dị mma (11)

    • Osisi ndị na-amị mkpụrụ a na-ata ata, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa (12)

  • Ebe ókè dịgasị n’ala ndị Izrel (13-23)

47  O mechara kpọghachite m n’ọnụ ụzọ ụlọ nsọ.+ M nọkwa ebe ahụ hụ mmiri si n’okpuru ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ahụ sọrọ na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ n’ihi na ụlọ nsọ ahụ chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ. Mmiri ahụ si n’akụkụ aka nri ụlọ nsọ ahụ, n’ebe ndịda nke ebe ịchụàjà, sọrọ na-agbada.  O mechara si n’ọnụ ụzọ ámá nke dị n’ebe ugwu+ kpọpụta m n’èzí, kpọgharịakwa m n’ọnụ ụzọ ámá dị ná mpụta, nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ.+ M nọkwa ebe ahụ hụ ka mmiri si n’akụkụ aka nri ọnụ ụzọ ámá ahụ na-agbapụta.  Mgbe nwoke ahụ ji eriri e ji atụ̀ ihe gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ tụọ mmiri dị ebe ahụ, ọ tụtara otu puku (1,000) kubit.* Ọ gwakwara m ka m gafee mmiri ahụ. Mmiri ahụ rukwara m n’ikiri ụkwụ.  Ọ tụtakwara otu puku (1,000) kubit ọzọ, sịkwa m gafee mmiri ahụ, mmiri ahụ eruzie m n’ikpere. Ọ tụtakwara otu puku (1,000) kubit ọzọ, sịkwa m gafee mmiri ahụ, ya eruzie m n’úkwù.  Ọ tụtakwara otu puku (1,000) kubit ọzọ. Ma, mmiri ahụ bụzi iyi, nke na enweghịzi m ike isi na ya gafere, n’ihi na o toola otú mmadụ nwere ike igwu ya egwu. Ọ bụzi iyi a na-enweghị ike iji ụkwụ si na ya gafere.  Ọ jụziri m, sị: “Nwa nke mmadụ, ị̀ hụrụ ihe a?” Ọ gwakwara m ka m gara ije gaghachi n’akụkụ mmiri ahụ.  Mgbe m gaghachiri, m hụrụ ọtụtụ osisi n’akụkụ abụọ nke mmiri ahụ.+  Ọ gwaziri m, sị: “Mmiri a na-asọga n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ ga-esikwa n’Araba*+ sọrọ gbadaa, sọba n’oké osimiri. Ya sọba n’oké osimiri,+ ọ ga-eme ka mmiri ya dị mma.  Ọtụtụ ihe e kere eke* dị ndụ ga-adịrị ndụ na-aga n’ebe ọ bụla mmiri ahụ sọrutere. Ọtụtụ azụ̀ ga-adị, n’ihi na mmiri ahụ ga-asọrute ebe ahụ. A ga-emekwa ka mmiri oké osimiri ahụ dị mma. Ihe ọ bụla nke dị n’ebe iyi ahụ sọrutere ga-adị ndụ. 10  “Ndị na-akụ azụ̀ ga-eguzo n’akụkụ ya malite n’En-gedi+ ruo En-egleyim, bụ́ ebe ndị a na-agbasa ụgbụ ka ọ kọọ. Ụdị azụ̀ dị iche iche na-adị n’Oké Osimiri Mediterenian* ga-ejukwa na ya.+ 11  “E nwere ebe dị iche iche mmiri na-adọ na ya nakwa ebe ndị dị apịtị apịtị. A gaghị eme ka ebe ndị ahụ dị mma. Ha ga-abụ nnu nnu.+ 12  “Ụdị osisi niile na-amị mkpụrụ a na-eri eri ga-eto n’akụkụ abụọ n’iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ. Ha agaghịkwa akwụsị ịmị mkpụrụ. Ha ga na-amị mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa, n’ihi na ha na-amịrị mmiri si n’ụlọ nsọ ahụ na-asọpụta.+ A ga na-eri mkpụrụ ha eri, jirikwa akwụkwọ ha na-agwọ ọrịa.”+ 13  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ala a ka unu ga-ekere onwe unu ka ọ bụrụ ihe ebo iri na abụọ nke Izrel ketara. A ga-ekenye ndị si n’ezinụlọ Josef ibé ala abụọ.+ 14  Ala a ga-abụ nke unu. Ihe otu onye ga-eketa ka ibe ya ga-eketa. Aṅụrụ m iyi na m ga-enye nna nna unu hà ala a.+ Ugbu a, a na-ekere unu ya ka ọ bụrụ ala unu ketara. 15  “Ókè ya n’ebe ugwu bụ: Malite n’Oké Osimiri Mediterenian* gawa n’ụzọ e si aga Hetlọn,+ gawakwa n’ebe e si aga Zidad,+ 16  Hemat,+ Berota,+ Sibreyim, nke dị n’agbata ala Damaskọs na ala Hemat, ruo Heza-hatikọn, nke dị n’ókè Haụran.+ 17  Otú a ka o si bụrụ na ókè ya malitere n’oké osimiri ruo Heza-inọn,+ n’ókè Damaskọs n’ebe ugwu, ruokwa n’ókè Hemat.+ Ebe ndị a bụ ókè ya n’ebe ugwu. 18  “N’ebe ọwụwa anyanwụ, ókè ya dị malite n’agbata Haụran na Damaskọs gawa n’Osimiri Jọdan, n’agbata Gilied+ na ala Izrel. Unu ga-atụ̀ ala ahụ malite n’ókè ya n’ebe ugwu gawa n’oké osimiri* dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ebe ndị a bụ ókè ya n’ebe ọwụwa anyanwụ. 19  “Ókè ya n’ebe ndịda dị malite na Tema ruo na mmiri Meribat-kedesh,+ ruo na Ndagwurugwu,*+ ruokwa n’Oké Osimiri Mediterenian.* Ebe ndị a bụ ókè ya n’ebe ndịda. 20  “Ókè ya n’ebe ọdịda anyanwụ bidoro n’Oké Osimiri Mediterenian,* malite n’ókè ya n’ebe ndịda ruo ebe chere Libo-hemat ihu.*+ Ebe ndị a bụ ókè ya n’ebe ọdịda anyanwụ.” 21  “Keerenụ onwe unu ala a. Kenyenụ ebo nke ọ bụla n’ebo iri na abụọ n’Izrel nke ha. 22  Unu ga-ekere ya onwe unu ka ọ bụrụ ihe unu ketara. Unu ga-ekenyekwa ndị mbịarambịa bi n’ala unu, ndị mụrụ ụmụ n’ala unu. Unu ga-ewerekwa ha ka ụmụ amaala Izrel. Ha ga-eso unu keta ala otú ebo niile n’Izrel ketara. 23  N’ebo ọ bụla onye mbịarambịa bi ka unu ga-enye ya ala.” Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu kubit nke a na-adị ogologo karịa otú otu kubit na-aha. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “n’ọzara.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “n’Oké Osimiri ahụ.”
Na Hibru, “n’Oké Osimiri ahụ.”
Ya bụ, Oké Osimiri Nnu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “n’Oké Osimiri ahụ.”
Na Hibru, “n’Oké Osimiri ahụ.”
Ma ọ bụ “ebe e si abanye Hemat.”