Ezikiel 44:1-31

  • Ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-emechi emechi mgbe niile (1-3)

  • Ntụziaka gbasara ndị mba ọzọ (4-9)

  • Ntụziaka gbasara ndị Livaị na ndị nchụàjà (10-31)

44  O mechara kpọghachi m n’ọnụ ụzọ ámá chere ebe ọwụwa anyanwụ ihu,+ nke dị ná mpụta ụlọ nsọ ahụ. Ma, o mechiri emechi.+  Jehova gwakwara m, sị: “Ọnụ ụzọ ámá a ga-emechi emechi mgbe niile. A gaghị emeghe ya emeghe. Mmadụ ọ bụla agaghịkwa esi na ya abata n’ụlọ nsọ a, n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke Izrel, si na ya bata.+ Ọ ga-emechi emechi mgbe niile.  Ma, onyeisi ga na-anọdụ ọdụ n’ime ya ka ọ taa achịcha n’ihu Jehova,+ n’ihi na ọ bụ onyeisi. Ọ ga na-esi n’ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ọnụ ụzọ ámá na-abata. Ebe ahụkwa ka ọ ga-esi na-apụ.”+  O mechara si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ugwu kpọta m n’ihu ụlọ nsọ ahụ. Mgbe m lere anya n’ụlọ Jehova, m hụrụ na ebube Jehova ejupụtala na ya.+ N’ihi ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.+  Jehova gwaziri m, sị: “Nwa nke mmadụ, anya ruo gị ala, na-ele anya, geekwa ntị nke ọma nụrụ ihe niile m na-agwa gị banyere iwu na ntụziaka ndị gbasara ụlọ Jehova. Ebe ị ga-aka eleru anya ala bụ n’ọnụ ụzọ e si abanye n’ụlọ nsọ nakwa n’ọnụ ụzọ niile e si apụ na ya.+  Gwakwa ndị Izrel, bụ́ ndị na-enupụ isi, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ndị Izrel, o zuolara unu. Arụ niile unu na-akpa akarịala.  Mgbe unu na-akpọbata ndị mba ọzọ a na-ebighị úgwù ma n’obi ma n’anụ ahụ́ n’ụlọ nsọ m, ha na-emerụ ụlọ nsọ m. Ọ bụ eziokwu na unu ji nri, abụba na ọbara na-achụrụ m àjà, ma, unu ji arụ niile unu na-akpa na-emebi ọgbụgba ndụ mụ na unu.  Unu anaghị elekọta ihe ndị dị nsọ dị n’ụlọ nsọ m.+ Kama, unu họpụtara ndị ọzọ ka ha na-arụ ọrụ ndị e kwesịrị ịrụ n’ụlọ nsọ m.”’  “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “E nweghị onye mba ọzọ bi n’Izrel, onye a na-ebighị úgwù ma n’obi ma n’anụ ahụ́, ga-abata n’ụlọ nsọ m.”’ 10  “‘Mgbe ndị Izrel kwụsịrị ife m, fewe arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi,* e nwere ndị Livaị sooro ha kwụsị ife m.+ Ha ga-eji isi ha buru ihe ha metara. 11  Ha ga na-ahụ maka ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ nsọ,+ na-ejekwa ozi n’ụlọ nsọ. Ọ bụ ha ga na-egbu anụ a ga-eji na-achụ àjà a na-esucha ọkụ nakwa àjà ndị ọzọ a ga na-achụ maka ndị Izrel. Ha ga na-eguzokwa n’ihu ndị ahụ ma na-ejere ha ozi. 12  Ebe ọ bụ na ha nọ n’ihu arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi na-ejere ha ozi ma mee ka ndị Izrel mehie,+ m weliela aka m ṅụọ iyi na ha ga-eji isi ha buru mmehie ha.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 13  ‘Ha agaghị abịakwute m ka ha bụrụ ndị nchụàjà m. Ha agaghịkwa abịa nso n’ihe m ọ bụla dị nsọ ma ọ bụ nke kacha nsọ. Ihere ga-eme ha n’ihi arụ niile ha kpara. 14  Ma, m ga-ahọpụta ha ka ha na-elekọta ọrụ ndị e kwesịrị ịrụ n’ụlọ nsọ, na-ahụkwa maka ozi niile a ga na-eje na ya nakwa ihe niile a ga na-eme na ya.’+ 15  “‘Ma, ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị, ụmụ Zedọk,+ ndị nọ na-arụ ọrụ e kwesịrị ịrụ n’ụlọ nsọ m mgbe ndị Izrel kwụsịrị ife m,+ ga-abịa na-ejere m ozi. Ha ga-eguzokwa n’ihu m jiri abụba+ na ọbara+ na-achụrụ m àjà.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 16  ‘Ọ bụ ha ga na-abata n’ụlọ nsọ m. Ọ bụkwa ha ga na-abịa n’ebe tebụl m dị na-ejere m ozi.+ Ha ga na-arụkwa ọrụ e kwesịrị ịrụrụ m.+ 17  “‘Ọ bụrụ na ha abanye n’ọnụ ụzọ ámá nke ogige dị n’ime, ha ga-eyi ákwà linin.+ Ha agaghị eyi ákwà ajị anụ mgbe ha na-eje ozi n’ọnụ ụzọ ámá nke ogige dị n’ime ma ọ bụkwanụ n’ime ogige ahụ. 18  Ákwà ha ga-eke n’isi ga-abụ ákwà linin. Ihe ha ga-eyi n’úkwù ga-abụkwa ákwà linin.+ Ha agaghị eyi ihe ọ bụla ga-agba ha ọsụsọ. 19  Ha chọọ ịga n’ogige dị ná mpụta, ya bụ, ogige dị ná mpụta ebe ndị ọzọ na-anọ, ha ga-eyipụ uwe ha na-eyi eje ozi,+ chịsa ha n’ọnụ ụlọ ndị dị nsọ a na-anọ eri ihe.*+ Ha ga-eyirizi uwe ọzọ, ka uwe ha ghara ime ka ndị ọzọ dị nsọ. 20  Ha agaghị akpụchapụ ntutu dị n’isi ha.+ Ha agaghịkwa ahapụ ya ka o too ogologo. Ha ga na-akpụtulata ntutu isi ha. 21  Ndị nchụàjà agaghị aṅụ mmanya ọ bụla mgbe ha batara n’ogige dị n’ime.+ 22  Ha agaghị alụ nwaanyị isi mkpe ma ọ bụ nwaanyị a gbara alụkwaghịm.+ Ma, ha nwere ike ịlụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke a mụrụ n’Izrel ma ọ bụ nwaanyị isi mkpe bụ́bu nwunye onye nchụàjà.’+ 23  “‘Ha ga na-akụziri ndị m ihe dị iche n’ihe dị nsọ na ihe nkịtị. Ha ga-emekwa ka ha mara ihe dị iche n’ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha.+ 24  Ọ bụ ha ga na-ekpe ikpe ọ bụla e nwere.+ Ha ga-eji iwu ndị m nyere na-ekpe ya.+ Ha ga na-edebe iwu m, na-esokwa ntụziaka m niile gbasara ememme m niile.+ Ha ga-edokwa ụbọchị izu ike m nsọ. 25  Ha agaghị na-aga ozu mmadụ nso n’ihi na ọ ga-eme ka ha ghara ịdị ọcha. Ma, ọ bụrụ ozu nna ha, ozu nne ha, ozu nwa ha nwoke, ozu nwa ha nwaanyị, ozu nwanne ha nwoke, ma ọ bụ ozu nwanne ha nwaanyị na-alụbeghị di, ha nwere ike iji maka ha ghara ịdị ọcha.+ 26  Ma, e mechaa mee ka onye nchụàjà dị ọcha, ọ ga-echere ka ụbọchị asaa gafee tupu ya amalite ọrụ. 27  Ụbọchị ọ ga-abata n’ebe nsọ ahụ, n’ogige dị n’ime, iji jee ozi n’ebe nsọ ahụ, ọ ga-achụ àjà maka mmehie ya.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 28  “‘A bịa n’ihe ha ga-eketa: Ọ bụ m ka ha ketara.+ Unu ekenyekwala ha ihe ọ bụla n’Izrel, n’ihi na ọ bụ m ka ha ketara. 29  Ọ bụ ha ga na-eri ihe ndị e ji chụọ àjà ọka+ na àjà mmehie na àjà ikpe ọmụma.+ Ihe ọ bụla e nyere Chineke n’Izrel ga-abụ nke ha.+ 30  Nke kacha mma n’ime mkpụrụ mbụ niile chara acha nakwa ụdị onyinye ọ bụla unu na-enye ga-abụ nke ndị nchụàjà.+ Unu ga na-enyekwa onye nchụàjà ntụ ọka nke si ná mkpụrụ mbụ unu.+ Unu na-eme otú a, m ga na-agọzi ezinụlọ unu.+ 31  Ndị nchụàjà agaghị eri anụ ọ bụla nwụrụ anwụ ma ọ bụ nnụnụ ọ bụla nwụrụ anwụ. Ha agaghịkwa eri ndị nke a dọgburu adọgbu.’+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “ọnụ ụlọ ndị dị nsọ.”