Ezikiel 28:1-26
28 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:
2 “Nwa nke mmadụ, gwa onye ndú Taya, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị:
“Mpako ị dị+ mere ka ị na-asị, ‘Abụ m chi.
M nọ ọdụ n’ocheeze chi, n’etiti oké osimiri.’+
Ọ bụ eziokwu na i chere n’obi gị na ị bụ chi,Ị bụ mmadụ. Ị bụghị chi.
3 I chere na ị ma ihe karịa Daniel.+
I chekwara na e nweghị ihe zoro ezo ị na-amaghị.
4 Ị baala ọgaranya n’ihi amamihe gị na otú i si aghọta ihe.
Ị na-ebubatakwa ọlaedo na ọlaọcha n’ụlọ ị na-akwasa akụ̀ gị.+
5 I nweela ezigbo akụ̀ n’ihi na ahịa ị na-ere doro gị anya.+
Akụ̀ i nwere emeekwala ka ị dị mpako.”’
6 “‘N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“Ebe ọ bụ na i chere n’obi gị na ị bụ chi,
7 M ga-akpọta ndị mba ọzọ, ndị obi kacha fee azụ ná mba niile, ka ha mee gị ihe.+
Ha ga-amịpụtakwa mma agha ha bibie ọmarịcha ihe niile i ji amamihe gị nweta.
Ha ga-emerụkwa mma gị dị ebube.+
8 Ha ga-atụba gị n’olulu.*
Ị ga-anwụkwa ọnwụ ike n’etiti oké osimiri.+
9 Ị̀ ka ga-asị onye na-egbu gị, ‘Abụ m chi’?
Ndị na-emerụ gị kpara gị aka, ọ ga-edo anya na ị bụ mmadụ nkịtị, na ị bụghị chi.”’
10 ‘Ndị mba ọzọ ga-eme ka ị nwụọ ọnwụ ihere otú ndị a na-ebighị úgwù si anwụ,N’ihi na ọ bụ mụnwa kwuru ya.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”
11 Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị:
12 “Nwa nke mmadụ, bụọ abụ iru uju banyere eze Taya. Sị ya, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị:
“I zuru okè na mbụ, bụrụ onye e ji ama atụ,Nwee ezigbo amamihe,+ mma gị abụrụkwa ebe mma ruru gwụ.+
13 Ị nọbu n’Iden, bụ́ ubi Chineke.
E ji nkume niile dị oké ọnụ* chọọ uwe gị mma.
Ha bụ: rubi, topaz, jaspa, krisolaịt, ọnịks, jed, safaya, tọkwọiz,+ na emerad.
Ebe a kwụnyere nkume ndị a nakwa oghere ndị ha dị na ha bụ ọlaedo.
M mere ha n’ụbọchị m kere gị.
14 Ị bụbu cherob e tere mmanụ, onye m họpụtara ka ọ na-ekpuchi ihe.
Ị nọbu n’ugwu nsọ Chineke.+ Ị nọbu na-ejegharị n’ebe nkume ndị na-acha ọkụ ọkụ dị.
15 Ị na-akpa ezigbo àgwà mgbe niile malite n’ụbọchị e kere gị
Ruo mgbe i bidoro kpawa àgwà ọjọọ.+
16 Nnukwu ngwá ahịa i nwere+Mere ka tigbuo zọgbuo ju n’ime gị, gị ebido mewe mmehie.+
N’ihi ya, m ga-esi n’ugwu Chineke chụpụ gị ka onye rụrụ arụ.
M ga-ebibikwa gịnwa+ bụ́ cherob nke na-ekpuchi ihe, ka ị gharazie ịnọ ebe nkume ndị ahụ na-acha ọkụ ọkụ dị.
17 Mma ị mara emeela ka ị dị mpako.+
Mma gị dị ebube emeela ka amamihe gị laa n’iyi.+
M ga-atụda gị n’ala.+
M ga-eme ka ndị eze na-agba gị nkiri.
18 I jirila ọtụtụ mmehie gị na aghụghọ ị na-aghọ mgbe ị na-ere ahịa gị merụọ ebe nsọ gị.
M ga-eme ka ọkụ bido ịgba gị. Ọ ga-erepịakwa gị.+
M ga-agba gị ọkụ, gị aghọọ ntụ n’elu ala n’ihu ndị niile na-ekiri gị.
19 Ndị niile ma gị ná mba dị iche iche ga-ekporopụ anya na-ele gị.+
A ga-ebibi gị na mberede. Mbibi gị ga-adịkwa egwu.
Ị gaghịzi adị ruo mgbe ebighị ebi.”’”+
20 Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị:
21 “Nwa nke mmadụ, chee ihu na Saịdọn+ ma buo amụma ihe a ga-eme ya.
22 Sị ya, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“Saịdọn, m ga-eme gị ihe. A ga-anọkwa n’ime gị too m.
Mgbe m ga-ata gị ahụhụ, e dookwa m nsọ n’ime gị, ndị mmadụ ga-amara na m bụ Jehova.
23 M ga-eme ka ndị gị rịawa ọrịa na-efe efe, meekwa ka ọbara ndị mmadụ na-asọ n’okporo ámá gị.
A ga-esi ná mpaghara niile jiri mma agha lụso ndị gị agha, gbuokwa ha.
Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.+
24 “‘“Ogwu na uke na-emerụ ndị Izrel ahụ́ agaghịzi adị gburugburu ha,+ ya bụ, mba ndị na-akwa ha emo. Ndị mmadụ ga-amarakwa na m bụ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova.”’
25 “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Mgbe m ga-esi ebe dị iche iche a chụsasịrị ndị Izrel kpọkọta ha,+ m ga-esi n’aka ha mee ka mba dị iche iche mara na m dị nsọ.+ Ndị Izrel ga-ebikwa n’ala ha+ m nyere Jekọb ohu m.+
26 Obi ga-eru ha ala n’ebe ahụ ha ga-ebi.+ Ha ga-arụ ụlọ, kụọkwa ubi vaịn.+ Mgbe m ga-ata ndị niile na-akwa ha emo ahụhụ, obi ga-eru ha ala.+ Ndị Izrel ga-amarakwa na m bụ Jehova Chineke ha.”’”