Ekliziastis 1:1-18
1 Okwu onye mkpọkọta,+ nwa Devid, kwuru. Ọ bụ eze na Jeruselem.+
2 Onye mkpọkọta kwuru, sị: “Ihe niile bụ nnọọ ihe efu!
Ihe niile bụ nnọọ ihe efu! E nweghị ihe nwere isi!”+
3 Olee uru mmadụ na-erite n’ọrụ niile ọ gbara mbọ rụọ,N’ọrụ niile ọ rụsiri ike n’ụwa?*+
4 Otu ọgbọ na-agafe, ọgbọ ọzọ na-abịakwa,Ma ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.+
5 Anyanwụ na-awa, anyanwụ na-adakwa;Ọ na-emekwa ngwa ngwa laghachi n’ebe o si awa.+
6 Ifufe na-efega n’ebe ndịda, ọ na-eferekwa gaa n’ebe ugwu;Ọ na-efegharị otú ahụ n’akwụsịghị akwụsị; ya fere gbadaa, ya efere gbagoo.
7 Iyi niile na-asọba n’oké osimiri, ma oké osimiri anaghị eju eju.+
Iyi ndị ahụ na-asọrọ laghachi n’ebe ha si ka ha wee sọpụta ọzọ.+
8 Ihe niile na-agwụ ike.
E nweghịdị onye nwere ike ịkọwa ha.
Ike anaghị agwụ anya ịhụ ihe;Ike anaghịkwa agwụ ntị ịnụ ihe.
9 Ihe ndị dịbu adị bụ ihe ndị ga-adị,Ihe ndị e meburu bụkwa ihe ndị a ga-eme ọzọ.
E nweghị ihe bụ́ ihe ọhụrụ n’ụwa.*+
10 È nwere ihe mmadụ ga-ekwu banyere ya, sị, “Lee ihe a, ọ bụ ihe ọhụrụ”?
Ihe ahụ dịbu adị kemgbe ogologo oge gara aga;Ọ dị adị tupu oge anyị.
11 E nweghị onye na-echeta ndị oge gboo.
E nweghịkwa onye ga-echeta ndị a ka ga-amụ amụ.
Ndị a ka ga-emecha mụọ agaghịkwa echeta ha.+
12 Mụnwa, bụ́ onye mkpọkọta, bụ eze Izrel nke na-achị na Jeruselem.+
13 M kpebiri iji amamihe mụọ ihe niile e merela n’ụwa*+ ma nyochaa ha,+ ya bụ, ọrụ ahụhụ Chineke nyere ndị mmadụ ka ha na-arụ.
14 M hụrụ ọrụ niile a na-arụ n’ụwa.*
Ma lee, ihe niile bụ ihe efu. Ha bụ ịchụ ifufe.+
15 A gaghị edozili ihe gbagọrọ agbagọ,A gaghịkwa agụli ihe na-adịghị adị ọnụ.
16 M kwuziri n’obi m, sị: “Amatala m ihe nke ukwuu karịa onye ọ bụla bu m ụzọ bie na Jeruselem.+ Enwetala m amamihe dị ukwuu. Ihe m mụtara karịkwara akarị.”+
17 M gbalịrị ka m ghọta ihe bụ́ mmadụ inwe amamihe, ihe bụ́ mmadụ izuzu nzuzu, na ihe bụ́ mmadụ ịdị iberiibe.+ Ma m chọpụtara na nke a bụkwa ịchụ ifufe.
18 N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ ma ihe nke ukwuu, ike ụwa ga-agwụ ya.
N’ihi ya, onye na-amụtakwu ihe na-akpatakwuru onwe ya obi ọjọọ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
^ Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
^ Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”
^ Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”