Levitikọs 16:1-34

  • Ụbọchị Ikpuchi Mmehie (1-34)

16  Jehova gwara Mosis okwu mgbe ụmụ Erọn abụọ nwụchara maka na ha bịara n’ihu Jehova otú na-ekwesịghị ekwesị.+  Jehova gwara Mosis, sị: “Gwa Erọn nwanne gị nwoke na ọ bụghị mgbe ọ bụla ka ọ ga na-abata n’ebe nsọ,+ n’ime ebe ahụ e gechiri ákwà mgbochi,+ n’ihu okwuchi Igbe ahụ, ka ọ ghara ịnwụ,+ n’ihi na m ga na-apụta n’ígwé ojii+ n’elu okwuchi+ Igbe ahụ.  “Erọn ga-eji ihe ndị a mgbe ọ na-abata n’ebe nsọ: oké ehi ọ ga-eji chụọ àjà mmehie+ na ebule ọ ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ.+  Ọ ga-eyiri uwe mwụda dị nsọ e ji eri linin kpaa,+ yirikwa uwe úkwù*+ e ji eri linin kpaa nke ga-ekpuchi ahụ́* ya. Ọ ga-ekekwa onwe ya ákwà a na-eke n’úkwù e ji eri linin kpaa,+ keekwa ákwà isi e ji eri linin kpaa.+ Ha bụ uwe dị nsọ.+ Ọ ga-eji mmiri saa ahụ́,+ yirizie ha.  “Ọ ga-anata nzukọ ndị Izrel+ mkpi abụọ ọ ga-eji chụọ àjà mmehie nakwa otu ebule ọ ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ.  “Erọn ga-achụzi oké ehi ahụ bụ́ maka àjà mmehie n’àjà, ya bụ, nke ahụ bụ́ maka onwe ya. Ọ ga-ekpuchiri onwe ya mmehie ya,+ kpuchiekwara ezinụlọ* ya.  “Ọ ga-akpụrụ mkpi abụọ ahụ mee ka ha guzo n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.  Erọn ga-efe nza n’isi mkpi abụọ ahụ ka ọ mara nke ga-abụ nke Jehova na nke ga-abụ maka Azazel.*  Erọn ga-achụ mkpi nza mara+ ka ọ bụrụ nke Jehova n’àjà. Ọ ga-eji ya chụọ àjà mmehie. 10  Ma, a ga-akpụta mkpi nza mara maka Azazel ná ndụ ka o guzo n’ihu Jehova ka e jiri ya kpuchie mmehie, ka e wee kpụga ya n’ala ịkpa maka Azazel.+ 11  “Erọn ga-eweta oké ehi ahụ bụ́ maka àjà mmehie, ya bụ, nke ahụ bụ́ maka onwe ya, jiri ya kpuchiere onwe ya na ezinụlọ* ya mmehie ha. E mechaa, ọ ga-egbu oké ehi ahụ bụ́ maka àjà mmehie, nke bụ́ maka onwe ya.+ 12  “Ọ ga-ewere ihe e ji amụ insens+ a gụjuru icheku ọkụ nke si n’ebe ịchụàjà+ dị n’ihu Jehova nakwa insens na-esi ísì ọma+ juru ọbụ aka abụọ. Ọ ga-ewere ha bata n’ime ebe ahụ e gechiri ákwà mgbochi.+ 13  Ọ ga-awụsakwa insens* ahụ n’elu ọkụ ahụ n’ihu Jehova.+ Anwụrụ ọkụ si n’insens ahụ ga-ekpuchi okwuchi igbe ọgbụgba ndụ*+ ahụ ka ọ ghara ịnwụ. 14  “Ọ ga-eweretụ ọbara+ oké ehi ahụ ma jiri mkpịsị aka ya fesa ya n’ihu okwuchi Igbe ahụ n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ ga-ejikwa mkpịsị aka ya fesa ọbara ahụ ugboro asaa n’ihu okwuchi Igbe ahụ.+ 15  “Ọ ga-egbu mkpi ahụ bụ́ maka àjà mmehie, nke bụ́ maka ndị Izrel.+ Ọ ga-ewebata ọbara ya n’ime ebe ahụ e gechiri ákwà mgbochi+ ma were ọbara ya+ mee ihe o ji ọbara oké ehi ahụ mee. Ọ ga-efesa ya n’ihu okwuchi Igbe ahụ. 16  “Ọ ga-ekpuchiri ebe nsọ ahụ mmehie n’ihi ihe ndị Izrel, bụ́ ndị na-adịghị ọcha, mere nakwa n’ihi nnupụisi ha na mmehie ha.+ Ọ ga-emekwa otu ihe ahụ maka ụlọikwuu nzute, nke dị n’etiti ndị Izrel, bụ́ ndị na-adịghị ọcha. 17  “E nweghị onye ọzọ ga-anọ n’ụlọikwuu nzute malite mgbe ọ banyere n’ebe nsọ ka o kpuchie mmehie ruo mgbe ọ pụtara. Ọ ga-ekpuchiri onwe ya na ezinụlọ* ya mmehie ha,+ kpuchiekwara ọgbakọ Izrel niile mmehie ha.+ 18  “Ọ ga-apụta gaa n’ebe ịchụàjà+ nke dị n’ihu Jehova ma kpuchiere ebe ịchụàjà ahụ mmehie. Ọ ga-eweretụ ọbara oké ehi ahụ, weretụkwa ọbara mkpi ahụ ma tee ha na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ, n’akụkụ ya niile. 19  Ọ ga-ejikwa mkpịsị aka ya fesa ọbara ahụ n’elu ya ugboro asaa wee mee ka ọ dị ọcha, dookwa ya nsọ n’ihi ihe ndị Izrel, bụ́ ndị na-adịghị ọcha, mere. 20  “Mgbe o kpuchichaara+ ebe nsọ na ụlọikwuu nzute nakwa ebe ịchụàjà+ mmehie, ọ ga-akpụtakwa mkpi ahụ dị ndụ.+ 21  Erọn ga-ebikwasị aka ya abụọ n’isi mkpi ahụ dị ndụ ma kwupụta ihe ọjọọ niile ndị Izrel mere na nnupụisi ha niile na mmehie ha niile n’isi mkpi ahụ. Ọ ga-eme ka ha dịrị n’isi mkpi ahụ.+ Ọ ga-edunyezi otu nwoke a họpụtara* ka ọ kpụrụ mkpi ahụ kpụga ya n’ala ịkpa. 22  Mkpi ahụ ga-eburu mmehie ha niile+ banye n’ọzara.+ Ọ ga-akpụga mkpi ahụ n’ala ịkpa.+ 23  “Erọn ga-abanye n’ụlọikwuu nzute yipụ uwe ndị ahụ e ji eri linin kpaa o yiiri mgbe ọ banyere n’ebe nsọ ahụ. Ọ ga-awụsa ha n’ebe ahụ. 24  Ọ ga-eji mmiri saa ahụ́+ n’ebe dị nsọ ma yiri uwe ya.+ Ọ ga-apụtazi chụọ àjà a na-esu ọkụ nke ya+ nakwa àjà a na-esu ọkụ nke ndị Izrel.+ Ọ ga-ekpuchiri onwe ya mmehie ya, kpuchiekwara ndị Izrel mmehie ha.+ 25  Ọ ga-esu abụba anụ e ji chụọ àjà mmehie ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. 26  “Nwoke ahụ nke kpụpụrụ mkpi ahụ bụ́ maka Azazel+ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. O mechaa, o nweziri ike ịbata n’ebe unu mara ụlọikwuu. 27  “A ga-eburu ozu oké ehi ahụ e ji chụọ àjà mmehie na ozu mkpi ahụ e ji chụọ àjà mmehie, bụ́ ndị e bubatara ọbara ha n’ebe nsọ ka e jiri kpuchie mmehie, pụọ n’ebe unu mara ụlọikwuu. A ga-akpọ akpụkpọ ha na anụ ha na nsị ha ọkụ.+ 28  Onye kpọrọ ha ọkụ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. O mechaa, o nweziri ike ịbata n’ebe unu mara ụlọikwuu. 29  “Ihe a ga-abụrụ unu iwu na-adịgide adịgide: N’abalị iri n’ọnwa nke asaa, unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́.* Unu agaghịkwa arụ ọrụ ọ bụla,+ ma nwa afọ ma onye mbịarambịa binyeere unu. 30  N’ụbọchị a, a ga-ekpuchiri unu mmehie,+ ka e wee kwuo na unu adịla ọcha. N’anya Jehova, unu ga-abụzi ndị a sachapụrụ mmehie ha niile.+ 31  Ọ bụ ụbọchị izu ike nke unu ga-ezu naanị ike na ya. Unu ga-emekpakwa onwe* unu ahụ́.+ Ọ bụ iwu na-adịgide adịgide. 32  “Ọ bụ onye nchụàjà e tere mmanụ,+ onye a họpụtara ka ọ bụrụ onye nchụàjà+ nke ga-anọchi nna ya,+ ga na-ekpuchi mmehie. Ọ bụkwa ya ga-eyiri uwe ndị ahụ e ji linin kpaa,+ ya bụ, uwe ndị ahụ dị nsọ.+ 33  Ọ bụ ya ga na-ekpuchi mmehie maka ebe kacha nsọ,+ ụlọikwuu nzute,+ nakwa ebe ịchụàjà.+ Ọ bụkwa ya ga-ekpuchiri ndị nchụàjà mmehie ha, kpuchiekwara mmadụ niile n’ọgbakọ Izrel.+ 34  Ihe a ga-abụrụ unu iwu na-adịgide adịgide,+ ka e wee na-ekpuchiri ndị Izrel mmehie ha niile otu ugboro n’afọ.”+ O* mere nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “uwe ime.”
Ma ọ bụ “ọtọ.”
Ma ọ bụ “ebo.”
O nwere ike ịbụ na Azazel pụtara “Ewu Na-agbafu Agbafu.”
Ma ọ bụ “ebo.”
Na Hibru, “okwuchi Igbe, nke dị n’elu Ihe Àmà.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “ebo.”
Ma ọ bụ “nwoke kwụ na-eche eche.”
“Mmadụ imekpa onwe ya ahụ́” pụtara na onye ahụ agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya. Ibu ọnụ so na ya.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ya bụ, Erọn.