Levitikọs 10:1-20

  • Jehova zitere ọkụ, ya eregbuo Nedab na Abaịhu (1-7)

  • Iwu e nyere ndị nchụàjà gbasara ịṅụ mmanya na iri ihe (8-20)

10  Mgbe e mechara, ụmụ Erọn bụ́ Nedab na Abaịhu+ weere ihe ha ji amụ insens, gụnye ọkụ na ha ma tinye insens*+ na ha. Ha wee malite ịchụ àjà* iwu na-akwadoghị+ n’ihu Jehova, nke ọ na-enyeghị ha iwu ka ha chụọ.  Jehova wee zite ọkụ, ya eregbuo ha,+ ha anwụọ n’ihu Jehova.+  Mosis wee sị Erọn: “Jehova kwuru, sị, ‘Ndị na-abịa m nso+ kwesịrị icheta na m dị nsọ. A ga-enyekwa m otuto n’ihu mmadụ niile.’” Ma Erọn gbara nkịtị.  Mosis kpọziri Mishel na Elzefan, bụ́ ụmụ Ọziel,+ nwanne nna Erọn, sị ha: “Bịanụ ebe a. Sinụ n’ihu ebe nsọ buru ozu ụmụnne unu pụọ n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.”  Ha wee bịa buru ozu ha mgbe ha ka yi uwe mwụda ha ma bupụ ha n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, otú Mosis gwara ha.  Mosis wee gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ndị nke ọzọ, bụ́ Elieza na Ịtama, sị: “Unu ahapụla isi unu n’edozighị ya edozi, unu adọwakwala uwe unu,+ ka unu ghara ịnwụ, ka Chineke gharakwa iwesa nzukọ a niile iwe. Ụmụnne unu, bụ́ ezinụlọ Izrel niile, ga-ebere ndị a Jehova ji ọkụ gbuo ákwá.  Unu esila n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute pụọ, ma ọ́ bụghị ya unu ga-anwụ, n’ihi na Jehova tere unu mmanụ.”+ Ha wee mee ihe Mosis kwuru.  Jehova gwaziri Erọn, sị:  “Aṅụla mmanya ma ọ bụ ihe ọzọ na-aba n’anya, gị na ụmụ gị ndị nwoke, mgbe unu na-abata n’ụlọikwuu nzute,+ ka unu ghara ịnwụ. Ọ bụ iwu na-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. 10  Ọ ga-eme ka a mata ihe dị iche n’ihe dị nsọ na ihe rụrụ arụ nakwa ihe dị iche n’ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha,+ 11  meekwa ka a kụziere ndị Izrel iwu niile Jehova si n’ọnụ Mosis nye ha.”+ 12  Mosis wee gwa Erọn na Elieza na Ịtama, bụ́ ụmụ Erọn ndị nwoke fọrọnụ, sị: “Werenụ ihe fọrọ n’àjà ọka e suru ọkụ a chụụrụ Jehova mee achịcha na-ekoghị eko, nọrọkwanụ n’ebe dị nso n’ebe ịchụàjà rie ya,+ n’ihi na ọ bụ ihe kacha nsọ.+ 13  Unu ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya+ maka na ọ bụ òkè unu nakwa òkè ụmụ unu ndị nwoke n’àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova, n’ihi na ọ bụ ihe e nyere m n’iwu. 14  Unu ga-anọkwa n’ebe dị ọcha rie okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị nakwa ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+ n’ihi na e nyela unu ihe ndị a ka ha bụrụ òkè unu nakwa òkè ụmụ unu ndị nwoke n’àjà udo ndị Izrel na-eweta. 15  Ha ga na-eweta ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ na okpuru afọ* anụ e ji achụ àjà a na-efegharị efegharị nakwa abụba nke àjà e suru ọkụ, ka e wee fegharịa àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. Ọ ga-abụ òkè unu na ụmụ unu ga na-eketa mgbe niile,+ otú Jehova nyere n’iwu.” 16  Mosis chọsiri anụ fọrọ n’ewu ahụ e ji chụọ àjà mmehie+ ike. O wee chọpụta na e suola ya ọkụ. O wee wesa Elieza na Ịtama, bụ́ ụmụ Erọn ndị fọrọnụ, ezigbo iwe. Ọ sịrị: 17  “Gịnị mere na unu erighị anụ ahụ e ji chụọ àjà mmehie n’ebe dị nsọ+ ebe ọ bụ ihe kacha nsọ, Chineke enyekwala ya unu ka unu wee na-aza ajụjụ maka mmehie nzukọ a ma na-ekpuchiri ha mmehie n’ihu Jehova? 18  Lee, e webataghị ọbara ya n’ime ebe nsọ. Unu kwesịrị iri ya n’ebe dị nsọ,+ otú e nyere m n’iwu.” 19  Erọn zara Mosis, sị: “Lee, taa ha chụụrụ Jehova àjà mmehie ha na àjà ha a na-esu ọkụ.+ N’agbanyeghị ya, ihe ndị a mere m. A sị na m riri anụ àjà mmehie ahụ taa, ọ̀ gaara adị Jehova mma?” 20  Mgbe Mosis nụrụ ihe o kwuru, ọ dị ya mma.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Na Hibru, “iche ọkụ.”
Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”
Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”