Diuterọnọmi 34:1-12
34 Mosis wee si n’ọzara Moab gbagoo n’Ugwu Nibo,+ n’elu Pisga,+ nke chere Jeriko ihu.+ Jehova gosiri ya ala ahụ niile, malite na Gilied ruo Dan,+
2 na Naftalaị niile na ala Ifrem na Manase, nakwa ala Juda niile ruo n’oké osimiri nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ,*+
3 nakwa Negeb*+ ná mpaghara Osimiri Jọdan,+ ya bu, ndagwurugwu Jeriko, bụ́ obodo nkwụ, ruo Zoa.+
4 Jehova gwaziri ya, sị: “Ọ bụ ala a ka m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb iyi banyere ya, sị, ‘M ga-enye ya ụmụ* gị.’+ Ekwela m ka i jiri anya gị hụ ya, ma ị gaghị agafe banye na ya.”+
5 Mgbe e mechara, Mosis ohu Jehova nwụrụ n’ebe ahụ n’ala Moab otú Jehova kwuru.+
6 O liri ya na ndagwurugwu dị n’ala Moab, n’ebe chere Bet-piọ ihu. E nweghịkwa onye ma ebe e liri ya ruo taa.+
7 Mosis dị otu narị afọ na iri abụọ (120) mgbe ọ nwụrụ.+ Anya ya ka na-ahụ ụzọ nke ọma, ahụ́ ka sikwara ya ike.
8 Ndị Izrel beere Mosis ákwá ụbọchị iri atọ+ n’ọzara Moab. Ụbọchị niile ha ji beere Mosis ákwá ma ruoro ya uju wee gwụ.
9 Joshụa nwa Nọn nwere amamihe nke ukwuu* n’ihi na Mosis bikwasịrị ya aka n’isi.+ Ndị Izrel malitere ige ya ntị. Ha mekwara nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.+
10 Ma e nwebeghị onye amụma ọzọ n’Izrel nke dị ka Mosis,+ onye Jehova ma ihu na ihu.+
11 O mere ihe àmà niile, rụọkwa ọrụ ebube niile Jehova dunyere ya ka ọ rụọ n’Ijipt, n’ihu Fero nakwa n’ihu ndị niile na-ejere ya ozi nakwa n’ala ya niile.+
12 Mosis kpakwara nnukwu ike ma jiri aka dị ike rụọ ọrụ n’ihu ndị Izrel niile.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian.
^ Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
^ Na Hibru, “mkpụrụ.”
^ Ma ọ bụ “amamihe mmụọ Chineke nyere ya.”