Abụ Ọma 89:1-52
Maskil.* Abụ Itan+ onye Zira.
89 M ga-abụ abụ banyere otú Jehova si egosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi.
M ga-eji ọnụ m kọsaara ọgbọ niile na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
2 N’ihi na m sịrị: “Ịhụnanya gị* ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.+
I meekwala ka o doo anya n’eluigwe na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.”
3 Ị sịrị: “Mụ na onye m họọrọ agbaala ndụ.+
M ṅụọrọla ohu m Devid iyi,+ sị:
4 ‘M ga-eme ka nwa* gị+ nọruo mgbe ebighị ebi,M ga-emekwa ka ocheeze gị dịrị n’ọgbọ niile.’”+ (Sila)
5 Jehova, eluigwe na-eto gị maka ọrụ ndị dị ịtụnanya ị na-arụ.
N’eziokwu, ha na-eto gị n’ọgbakọ ndị nsọ maka na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
6 N’ihi na ònye ka a ga-eji tụnyere Jehova n’eluigwe?+
N’ime ụmụ Chineke,+ è nwere onye dị ka Jehova?
7 Ìgwè* ndị nsọ na-atụ egwu Chineke.+
Ọ dị ukwuu, ndị niile gbara ya gburugburu na-atụkwa egwu ya.+
8 Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha,Ònye dị ike ka gị, Jaa?+
Ị na-egosi n’ihe niile na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+
9 Ị na-achị oké osimiri nke na-enugharị n’ike n’ike.+
Mgbe ebili mmiri ya na-amali elu, ị na-eme ka ọ dajụọ.+
10 I meriela Rehab+ ma gbuo ya.+
I jirila nnukwu ike* gị chụsasịa ndị iro gị.+
11 Ọ bụ gị nwe eluigwe, ụwa bụkwa nke gị.+
Ọ bụ gị kere ala na ihe niile juru na ya.+
12 Ọ bụ gị kere ebe ugwu na ebe ndịda.
Ugwu Tebọ+ na Ugwu Hemọn+ ji ọṅụ na-eto aha gị.
13 Ike gị dị ukwuu.+
Aka gị siri ike.+
Aka nri gị dị elu.+
14 I ji ezi omume na ikpe ziri ezi tọọ ntọala ocheeze gị.+
Ịhụnanya* na eziokwu dị n’ihu gị.+
15 Ndị na-eji ọṅụ eto gị na-enwe obi ụtọ.+
Jehova, ị na-emere ha amara.*
16 Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi aha gị malite n’ụtụtụ ruo n’abalị,Ezi omume gị na-emekwa ka e bulie ha elu.
17 N’ihi na ọ bụ gị bụ ebube ha na ike ha,+Ọ bụkwa amara gị na-eme ka anyị sikwuo ike.*+
18 N’ihi na ọ bụ Jehova nwe ọta anyị.
Ọ bụ Onye Nsọ Izrel nwe eze anyị.+
19 N’oge ahụ, ị gwara ndị jisiri gị aka ike okwu n’ọhụụ, sị:
“Emeela m ka dike sie ike.+
Emeela m ka onye m si n’etiti ndị mmadụ họrọ dị elu.+
20 Ahọrọla m Devid ohu m.+
Ejirila m mmanụ m dị nsọ tee ya mmanụ.+
21 M ga-eji aka m kwado ya,+M ga-ejikwa ike* m mee ka o sie ike.
22 E nweghị onye iro ọ bụla ga-ana ya ụtụ,E nweghịkwa onye ajọ omume ga-emegbu ya.+
23 M ga-egweri ndị iro ya n’ihu ya,+M ga-etigbukwa ndị kpọrọ ya asị.+
24 M ga-egosi ya na m bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi, gosikwa ya na m hụrụ ya n’anya,+A ga-emekwa ka o nwekwuo ike* n’ihi aha m.
25 M ga-eme ka ọ chịwa oké osimiri,Meekwa ka ọ chịwa osimiri dị iche iche.+
26 Ọ ga-agwa m, sị: ‘Ị bụ Nna m,Chineke m, na Oké Nkume na-azọpụta m.’+
27 M ga-eme ka ọ bụrụ ọkpara,+Ka ọ bụrụ onye kacha ná ndị eze niile e nwere n’ụwa.+
28 Agaghị m akwụsị ịhụ ya n’anya ruo mgbe ebighị ebi,+E nweghịkwa ihe ga-emebi ọgbụgba ndụ mụ na ya.+
29 M ga-eme ka nwa* ya nọruo mgbe ebighị ebi,Meekwa ka ocheeze ya dịruo mgbe ebighị ebi ka eluigwe.+
30 Ọ bụrụ na ụmụ ya ahapụ iwu m,Ọ bụrụkwa na ha esoghị ndụmọdụ m,*
31 Ọ bụrụ na ha eleghara ntụziaka m anya,Gharakwa idebe iwu m,
32 M ga-apịa ha ụtarị iji taa ha ahụhụ maka na ha nupụrụ isi,+M ga-apịakwa ha ihe maka mmehie ha.
33 Ma e nweghị mgbe m ga-akwụsị ịhụ ya n’anya,+Agaghịkwa m ahapụ imezu nkwa m kwere.
34 Agaghị m emebi ọgbụgba ndụ m+Ma ọ bụ gbanwee ihe m ji ọnụ m kwuo.+
35 Ebe ọ bụ na m dị nsọ, e nwere otu ihe m ṅụrụ n’iyi.
Agaghị m aghara Devid ụgha.+
36 Nwa* ya ga-anọru mgbe ebighị ebi.+
Ocheeze ya ga-adị n’ihu m ruo mgbe ebighị ebi ka anyanwụ.+
37 A ga-eme ka ocheeze ya dịruo mgbe ebighị ebiOtú ọnwa si apụta mgbe niile na mbara igwe ka onye akaebe a tụkwasịrị obi.” (Sila)
38 Ma, ị chụpụla onye i tere mmanụ, jụkwa ya.+
I wesala ya oké iwe.
39 E nweghịzi ihe i ji ndụ gị na ohu gị gbara kpọrọ.
I merụọla okpueze ya maka na ị tụrụ ya n’ala.
40 Ị kwatuola mgbidi ya niile e ji nkume rụọ.*
I bibisịala ebe niile ọ rụsiri ike.
41 Ndị niile na-agafe agafe akwakọrọla ihe ya.
Ndị agbata obi ya na-akparị ya.+
42 I meela ka ndị kpọrọ ya asị merie ya.*+
I meela ka ndị iro ya niile ṅụrịa ọṅụ.
43 I meela ka mma agha ya ghara ịba uru ọ bụla,I meekwala ka ọ ghara imeri n’agha.
44 I meela ka a gharazie ịna-akwanyere ya ùgwù.
Ị kwatuola ocheeze ya.
45 I meela ka ọ kaa nká ngwa ngwa.
I meela ka ihere ju ya ihu. (Sila)
46 Jehova, olee mgbe ị ga-akwụsị izoro anyị onwe gị? Ị̀ ga na-ezo onwe gị ruo mgbe ebighị ebi?+
Ị̀ ka ga na-ewesa anyị iwe gị nke na-ere ka ọkụ?
47 Cheta na mmadụ anaghị adịte ndụ aka.+
Ọ̀ bụ n’efu ka i kere mmadụ niile?
48 È nwere mmadụ dị ndụ nke na-agaghị anwụ anwụ?+
Ọ̀ ga-azọpụtali onwe ya* ka ọ ghara ịbanye n’ili?* (Sila)
49 Jehova, olee ebe ọrụ ịhụnanya gị ndị ị rụrụ n’oge gara aga dị,Nke ị ṅụụrụ Devid n’iyi maka na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi?+
50 Jehova, biko, cheta mkparị a na-akparị ndị ohu gị.
Cheta otú m si na-edi mkparị mmadụ niile na-akparị m.
51 Jehova, biko, cheta otú ndị iro gị si na-ekwutọ onye i tere mmanụ,Otú ha si na-akatọ ihe ọ bụla o mere.
52 Ka e too Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Amen na Amen.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “Ịhụnanya gị pụrụ iche.”
^ Na Hibru, “mkpụrụ.”
^ Ma ọ bụ “Ọgbakọ.”
^ Na Hibru, “ogwe aka.”
^ Ma ọ bụ “Ịhụnanya pụrụ iche.”
^ Na Hibru, “ha na-eje ije n’ìhè si n’ihu gị.”
^ Na Hibru, “na-eme ka mpi anyị dị elu.”
^ Na Hibru, “ogwe aka.”
^ Na Hibru, “ga-ebuli mpi ya elu.”
^ Na Hibru, “mkpụrụ.”
^ Ma ọ bụ “ihe m kpebiri.”
^ Na Hibru, “Mkpụrụ.”
^ Ma ọ bụ “ụlọ ya ndị e ji nkume rụọ.”
^ Na Hibru, “weliela aka nri ndị iro ya.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
^ Na Hibru, “n’aka Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.