Abụ Ọma 83:1-18

  • Ekpere ọbụ abụ kpere mgbe ndị iro bịara

    • “Chineke, biko, agbala nkịtị” (1)

    • Ndị iro dị ka ahịhịa ogwu ifufe na-ebu (13)

    • Aha Chineke bụ Jehova (18)

Abụ Esaf.+ Abụ ọma. 83  Chineke, biko, agbala nkịtị.+ Chineke, biko, anọla jụụ,* anọkwala na-ele n’anya n’anya.   Lee, ndị iro gị na-eme mkpọtụ.+ Ndị kpọrọ gị asị na-ama gị aka.*   Ha ji aghụghọ na-agbara ndị gị izu. Ha na-akpara ndị ị hụrụ n’anya* nkata ọjọọ.   Ha na-asị: “Bịanụ ka anyị kpochapụ ha ka ha ghara ịbụkwa mba,+Ka a gharazie icheta aha Izrel ọzọ.”   Ha na-eji otu obi agba izu ihe ha ga-eme. Ha agbakọọla aka* ka ha lụso gị ọgụ,+   Ndị Ịdọm na ndị Ishmel, ndị Moab+ na ndị Hega,+   Gibal na Amọn+ na Amalek,Filistia+ nakwa ndị bi na Taya.+   Asiria+ esorokwala ha. Ha na-akwado ụmụ Lọt.+ (Sila)   Mee ha ihe i mere Midian,+Ihe i mere Sisera na Jebin n’iyi* Kaịshọn.+ 10  A lara ha n’iyi n’En-dọọ.+ Ha ghọrọ nri ala. 11  Mee ndị a ma ama n’obodo ha ihe i mere Oreb na Zieb,+Meekwa ndị isi* ha ihe i mere Ziba na Zalmọna,+ 12  N’ihi na ha sịrị: “Ka anyị weghara ala ebe Chineke bi.” 13  Chineke m, biko, mee ka ha dị ka ahịhịa ogwu ifufe na-ebugharị,+Ka ha dị ka ahịhịa ọka ifufe na-ebugharị. 14  Otú ahụ ọkụ si agba oké ọhịa,Ire ọkụ ana-erekwa ugwu,+ 15  Si otú ahụ jiri oké ifufe gị chụọ ha ọsọ,+Jirikwa oké ifufe gị yie ha egwu.+ 16  Jehova, biko, mee ka ihere ju ha ihu,Ka ha wee chọọ aha gị. 17  Biko, ka e menye ha ihere, ka ụjọ na-atụkwa ha ruo mgbe ebighị ebi. Ka e mechuo ha ihu ma laa ha n’iyi. 18  Ka ndị mmadụ mara na aha gị bụ Jehova+Nakwa na ọ bụ naanị gị bụ Onye Kacha Elu n’ụwa niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “emechila ọnụ.”
Na Hibru, “na-eweli isi ha elu.”
Na Hibru, “ndị i zoro ezo.”
Ma ọ bụ “Ha agbaala ndụ.”
Ma ọ bụ “na ndagwurugwu.”
Ma ọ bụ “ndị na-edu.”