Abụ Ọma 59:1-17
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Alala M n’Iyi” kpọọ ya. Abụ Devid. Miktam.* Ọ bụrụ abụ a mgbe Sọl dunyere ndị mmadụ ka ha gaa na-eche ụlọ Devid* nche, ka ha gbuo ya.+
59 Chineke m, biko, napụta m n’aka ndị iro m.+
Chebe m ka ndị na-abịa ịlụso m ọgụ ghara inweta m.+
2 Napụta m n’aka ndị na-eme ihe ọjọọ,Zọpụtakwa m n’aka ndị tigbuo zọgbuo.
3 Lee, ha ezoola na-eche m.*+
Jehova, ndị dị ike na-alụso m ọgụ,Ma ọ bụghị maka na m nupụrụ isi ma ọ bụ maka na m mehiere.+
4 N’agbanyeghị na e nweghị ihe ọjọọ m mere, ha na-eji ọsọ aga ejikere ịlụso m ọgụ.
Biko, za òkù m na-akpọ gị ma hụrụ ihe ha na-eme.
5 N’ihi na ọ bụ gị, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ Chineke Izrel.+
Bilie lebara mba niile anya.
Emerela ndị ọjọọ ọ bụla na-agba mmadụ mgba okpuru ebere.+ (Sila)
6 Ha na-abịaghachi ná mgbede ọ bụla.+
Ha na-agbọ ụja ka nkịta,+ zorokwa ezoro na-agagharị n’obodo.+
7 Okwu ọjọọ na-adapụsị ha n’ọnụ.
Ọnụ ha dị ka mma agha,+N’ihi na ha na-asị: “Ònye na-anụkwanụ ihe anyị na-ekwu?”+
8 Ma Jehova, ị ga-achị ha ọchị.+
Ị ga-akwa mba niile emo.+
9 Chineke m, ị bụ ike m. M ga na-atụ anya gị,+N’ihi na ị bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m.+
10 Chineke, onye hụrụ m n’anya, ga-agbatara m ọsọ enyemaka.+
Chineke ga-eme ka m na-ele ndị iro m anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+
11 Egbula ha ozugbo, ka ndị m ghara ichefu.
Jiri ike gị mee ka ha kpagharịwa.
Jehova, ọta anyị, biko, mee ka ha daa.+
12 Ka mpako ha tinye ha ná nsogbu+N’ihi ihe ọjọọ si ha n’ọnụ apụta, bụ́ okwu niile ha na-ekwuNakwa n’ihi ọnụ ha na-abụ ndị mmadụ na aghụghọ ha na-aghọ.
13 Jiri iwe laa ha n’iyi.+
Laa ha n’iyi, ka ha gharazie ịnọ.
Mee ka ha mara na ọ bụ Chineke na-achị Jekọb, na-achịkwa ebe niile n’ụwa.+ (Sila)
14 Ka ha bịaghachi ná mgbede.
Ka ha gbọwa ụja ka nkịta ma zoro ezoro na-agagharị n’obodo.+
15 Ka ha gagharịwa na-achọ ihe ha ga-eri.+
Ekwela ka afọ ju ha ma ọ bụ ka ha hụ ebe ha ga-ehi ụra.
16 Ma m ga-abụ abụ gbasara otú i si dị ike.+
N’ụtụtụ, m ga-eji obi ụtọ kọọ gbasara ịhụnanya gị.
N’ihi na ị bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m+Nakwa ebe m na-agbaba n’oge m nọ ná nsogbu.+
17 Chineke m, ị bụ ike m. M ga-abụku gị abụ otuto,+N’ihi na ị bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m, Chineke onye hụrụ m n’anya.+