Abụ Ọma 55:1-23

  • Ekpere ọbụ abụ kpere mgbe a gbara ya mgba okpuru

    • Ezigbo enyi ya kparịrị ya (12-14)

    • “Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị” (22)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Maskil.* Abụ Devid. 55  Chineke, biko, ṅaa ntị n’ekpere m.+ Elegharala arịrịọ m na-arịọ ka i meere m ebere anya.*+   Biko, gee m ntị ma za m.+ Ihe m na-eche na-eme ka obi ghara izu m ike.+ Isi na-agba m ghara ghara   N’ihi ihe onye iro m na-ekwuNakwa n’ihi nsogbu onye ajọ omume na-enye m. N’ihi na ha na-ekonye m nsogbu n’isi,Ha bukwaara m iwe n’obi.+   Obi agbawaala m,+Ụjọ ọnwụ na-atụsikwa m ike.+   Ezigbo egwu ejidela m,M na-amakwa jijiji.   M nọ na-asị: “A sị nnọọ na m nwere nku ka nduru,M gaara efepụ gaa biri n’ebe obi ga-eru m ala.   M gaara efega n’ebe dị anya.+ M gaara aga biri n’ala ịkpa.+ (Sila)   M gaara agbaba n’ebe m ga-anọZere nsogbu ndị yiri oké ifufe nke na-efesi ike.”   Jehova, biko, megharịa ha anya, kụghasịakwa atụmatụ ha,*+N’ihi na ahụla m na ihe juru n’obodo a bụ tigbuo zọgbuo na esemokwu. 10  Ha na-aga elu mgbidi obodo a gburugburu n’ehihie nakwa n’abalị. Ihe ọjọọ na nsogbu juru n’obodo a.+ 11  Ihe ọjọọ na-eme n’ebe niile n’obodo a. E nweghị mgbe a na-anaghị emegbu ndị mmadụ ma na-aghọ ha aghụghọ n’ámá ya.+ 12  Ọ bụghị onye iro na-akparị m.+ A sị na ọ bụ ya, m gaara edi ya. Ọ bụghị onye iro na-emegide m. A sị na ọ bụ ya, m gaara ezo ka ọ ghara ịhụ m. 13  Kama ọ bụ gị, onye dị ka m,*+Enyi mụ m ma nke ọma.+ 14  Mụ na gị bụbu ezigbo enyi. Anyị na ìgwè mmadụ na-esobu abanye n’ụlọ Chineke. 15  Ka e bibie ha.+ Ka ha banye n’ili* ná ndụ. N’ihi na ihe ọjọọ juru n’ebe ha bi, jukwa ha n’obi. 16  Ma, m ga-akpọku Chineke,Jehova ga-azọpụtakwa m.+ 17  Ma ná mgbede ma n’ụtụtụ ma n’ehihie, obi anaghị ezu m ike, m na-asụkwa ude,+Ọ na-anụkwa olu m.+ 18  Ọ ga-anapụta m,* meekwa ka ndị na-emegide m kwụsị ịlụso m ọgụ,N’ihi na ọtụtụ ìgwè mmadụ na-alụso m ọgụ.+ 19  Chineke, onye nọ n’ocheeze kemgbe oge ochie,+Ga-anụ olu m ma lebara ha anya.+ (Sila) Ndị na-anaghị atụ egwu Chineke+Agaghị ekwe agbanwe. 20  Ọ* lụsola ndị ya na ha dị ná mma ọgụ.+ O mezughị nkwa o kwere.*+ 21  Okwu ya dị nro karịa bọta,+Ma ihe dị ya n’obi bụ ọgụ na mgba. Okwu ya dị nro karịa mmanụ,Ma ha yiri mma agha a mịpụtara amịpụta.+  22  Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị.+ Ọ ga-enyere gị aka.+ E nweghị mgbe ọ ga-ahapụ onye ezi omume ka ọ daa.*+ 23  Ma Chineke, ị ga-eme ka ndị ahụ ikpe ọbara mara na ndị na-aghọ aghụghọ banye n’ili.+ Ha agaghị anọru ọkara ndụ ha.+ Ma m ga-atụkwasị gị obi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ezorola m onwe gị mgbe m na-arịọ gị ka i nyere m aka.”
Na Hibru, “kewaa ire ha.”
Ma ọ bụ “nwoke mụ na ya hà.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “ọgbụgba ndụ ya.”
Ya bụ, enyi ahụ e kwuru okwu ya n’amaokwu 13 na 14.
Ma ọ bụ “maa jijiji.”