Abụ Ọma 5:1-12
Maka onye na-eduzi Nihilọt.* Abụ Devid.
5 Jehova, biko, gee ntị n’ihe m na-ekwu.+
Nụrụ ude m na-asụ.
2 Eze m na Chineke m, biko, ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka,N’ihi na ọ bụ gị ka m na-arịọ.
3 Jehova, biko, ị ga-anụ olu m n’ụtụtụ.+
N’ụtụtụ, m ga-akọrọ gị ihe na-echegbu m,+ m ga-atụsikwa anya ike ka ị za m.
4 N’ihi na ị bụghị Chineke nke ajọ omume na-atọ ụtọ.+
E nweghị onye na-eme ihe ọjọọ ị ga-ahapụ ka gị na ya biri.+
5 E nweghị onye na-etu ọnụ ga-eguzo n’ihu gị.
Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.+
6 Ị ga-ebibi ndị na-agha ụgha.+
Jehova, ị kpọrọ ndị tigbuo zọgbuo na ndị na-aghọ aghụghọ* asị.+
7 Ma m ga-abata n’ụlọ gị+ n’ihi ịhụnanya gị* nke dị ukwuu.+
M ga-eche ihu n’ụlọ nsọ gị kpọọ isiala n’ihi na m na-akwanyere gị ezigbo ùgwù.+
8 Jehova, ị bụ onye ezi omume. Biko, duo m n’ihi ndị iro m.
Mee ka m nwee ike ịga n’ụzọ gị n’enweghị ihe ga-eme ka m daa.+
9 N’ihi na e nweghị ihe ha na-ekwu e nwere ike ịtụkwasị obi.
Ihe juru ha n’obi bụ naanị ịkpọ asị.
Ọnụ* ha dị ka ili ghe oghe.
Ha na-eto mmadụ otuto elu ọnụ.+
10 Ma, Chineke, ị ga-ekwu na ikpe mara ha.
Atụmatụ ha ga-akpatara ha ọdachi.+
Ka a chụpụ ha n’ihi na ihe ọjọọ ha na-eme dị ọtụtụ,N’ihi na ha enupụrụla gị isi.
11 Ma ndị niile na-agbaba n’ime gị ga-aṅụrị ọṅụ.+
Ha ga na-eti mkpu ọṅụ mgbe niile.
Ị ga-echebe ha,Ndị ji aha gị kpọrọ ihe ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi gị.
12 N’ihi na gịnwa bụ́ Jehova ga-agọzi onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume.
Ị ga-eji amara* gị gbaa ya gburugburu ka ebe e ji ọta ukwu gbaa mmadụ gburugburu.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “onye na-awụfu ọbara ma na-aghọ aghụghọ.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
^ Na Hibru, “Akpịrị.”
^ Ma ọ bụ “ihu ọma.”