Abụ Ọma 44:1-26
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ụmụ Kora.+ Maskil.*
44 Chineke, anyị ejirila ntị anyị nụ,Nna nna anyị hà akọọrọla anyị+Ihe ndị i mere n’oge ha,N’oge dị anya gara aga.
2 I ji ike* gị chụpụ mba dị iche iche,+I wee mee ka nna nna anyị hà bichie ha.+
I meriri mba dị iche iche, chụpụkwa ha.+
3 Ọ bụghị mma agha ha ka ha ji nweta ala ahụ,+Ọ bụghịkwa ike ha mere ka ha merie.+
Kama ọ bụ aka gị siri ike na ike* gị+ nakwa amara* gị,N’ihi na ị hụrụ ha n’anya.+
4 Chineke, ị bụ Eze m.+
Nye iwu ka Jekọb merie.
5 Anyị ga-achụghachi ndị iro anyị n’ihi ike ị na-enye anyị.+
Anyị ga-eji aha gị merie ndị na-alụso anyị ọgụ.+
6 N’ihi na atụkwasịghị m obi n’ụta m,Mma agha m enweghịkwa ike ịzọpụta m.+
7 Ọ bụ gị zọpụtara anyị n’aka ndị iro anyị,+Ọ bụkwa gị menyere ndị kpọrọ anyị asị ihere.
8 Anyị ga-eto Chineke mgbe niile,Anyị ga-ajakwa aha gị mma ruo mgbe ebighị ebi. (Sila)
9 Ma ugbu a, ị jụla anyị ma mee ka ihere mee anyị,Ị naghịkwa anọnyere ndị agha anyị ma ha gaa agha.
10 Ị na-eme ka anyị na-agbaghachi azụ ma anyị hụ ndị iro anyị.+
Ndị kpọrọ anyị asị na-anara anyị ihe ọ bụla ha chọrọ.
11 Ị na-enyefe anyị n’aka ha ka ha dọrie anyị otú e si adọri atụrụ.
Ị chụsaala anyị ná mba dị iche iche.+
12 Ị na-ere ndị gị ezigbo ọnụ ala.+
E nweghị uru ị na-erite n’ego ole ị na-ere ha.
13 I meela ka ndị agbata obi anyị na-akparị anyị,Meekwa ka ndị niile gbara anyị gburugburu na-akwa anyị emo ma na-achị anyị ọchị.
14 I meela ka mba dị iche iche jiri anyị na-eme ihe ọchị,*+Meekwa ka ndị dị iche iche na-efufe isi ma ha hụ anyị.
15 Ihere na-eme m mgbe niile.
Ihere onwe m emegbuola m,
16 N’ihi otú ha si na-akparị anyị ma na-akatọ anyị,N’ihi onye iro anyị nke na-emegwara anyị ihe anyị mere.
17 Ihe a niile emeela anyị, ma anyị echefubeghị gị,Anyị emebighịkwa ọgbụgba ndụ anyị na gị gbara.+
18 Obi anyị apụbeghị n’ebe ị nọ.
Anyị ahapụghị ụzọ gị gawa ebe ọzọ.
19 Ma ị sụọla anyị akwụ n’ebe nkịta ọhịa na-ebi.
I jirila oké ọchịchịrị kpuchie anyị.
20 Ọ bụrụ na anyị echefuola aha Chineke anyịMa ọ bụ gbasaa aka anyị kpeere chi ọzọ,
21 Chineke ọ́ gaghị achọpụta?
Ọ ma ihe niile dị mmadụ n’obi.+
22 Ọ bụ n’ihi gị ka e ji na-egbu anyị mgbe niile.
E werela anyị ka atụrụ a ga-egbu egbu.+
23 Jehova, gịnị mere o ji dị ka ị̀ na-ehi ụra? Biko, bilie nyere anyị aka.+
Teta. Ajụla anyị ruo mgbe ebighị ebi.+
24 Gịnị mere na i nyereghị anyị aka?*
Gịnị mere i ji chefuo ahụhụ anyị na-ata na mmegbu a na-emegbu anyị?
25 A kwatuola anyị n’ala.
Anyị madoro afọ n’ala.+
26 Bilie nyere anyị aka.+
Napụta anyị n’ihi ịhụnanya gị.*+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “aka.”
^ Na Hibru, “aka nri gị na ogwe aka.”
^ Na Hibru, “ìhè si n’ihu.”
^ Na Hibru, “jiri anyị na-atụ ilu.”
^ Na Hibru, “i ji zooro anyị ihu gị?”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”