Abụ Ọma 39:1-13
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. Nke Jedutọn.*+ Abụ Devid.
39 M sịrị: “M ga-akpachara anyaKa m ghara ikwu ihe ọjọọ.+
M ga-eji ihe kechie ọnụ m+Mgbe ọ bụla onye ajọ omume nọ n’ebe m nọ.”
2 M gbara nkịtị n’ekwughị okwu.+
Ekwughịdị m ihe dị mma.
Ma, ahụ́ nọ na-egbusi m mgbu ike.
3 Obi nọ na-ere m ọkụ.
Ka m nọ na-atụgharị uche,* ọkụ ahụ ka nọ na-ere.
M kwuziri, sị:
4 “Jehova, biko, nyere m aka ka m mara ihe ga-emecha mee m,Nakwa mgbe m ga-anọru ndụ,+Ka m wee mara otú ndụ m dịruru mkpirikpi.
5 N’eziokwu, i meela ka ụbọchị ndụ m dị naanị ole na ole.*+
Oge m dịrịla ndụ enweghị ihe ọ bụ n’anya gị.+
Mmadụ ọ bụla bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ, a sịgodị na o chere na e nweghị ihe nwere ike ime ya.+ (Sila)
6 N’eziokwu, mmadụ ọ bụla na-ejegharị ka onyinyo.
Ọ na-arụgbu onwe ya n’ọrụ* na nkịtị.
Ọ na-akpakọ akụ̀ n’amaghị onye ga-eri ya.+
7 Jehova, gịnịzi ka m ga-elewe anya ya?
Ọ bụ naanị gị bụ olileanya m nwere.
8 Napụta m ná mmehie m niile.+
Ekwela ka onye nzuzu jiri m mere ihe ọchị.
9 M gbara nkịtị.
Enweghị m ike imeghe ọnụ m,+N’ihi na ọ bụ gị mere ihe a.+
10 Atazila m ahụhụ ị na-ata m.
Ike agwụla m n’ihi ihe ị na-eti m.
11 Ị na-ata mmadụ ahụhụ mmehie o mere iji dọọ ya aka ná ntị.+
Ị na-emebisị ihe ndị bara ezigbo uru o nwere otú egu* si emebisị ihe.
N’eziokwu, mmadụ ọ bụla bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ.+ (Sila)
12 Jehova, biko, nụrụ ekpere m.
Ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.+
Elegharala ákwá m na-ebe anya.
N’ihi na abụ m onye mbịarambịa n’ebe ị nọ.+
Abụ m onye njem na-agafe agafe, otú nna nna m hà niile bụ.+
13 Elezila m anya n’iwe, ka obi dịtụ m ụtọ
Tupu mụ anwụọ, nke m agaa.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “na-asụ ude.”
^ Na Hibru, “hara ka uhiè ọbụ aka.”
^ Na Hibru, “Ọ na-eme mkpọtụ.”
^ N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.