Aịzaya 40:1-31
40 Chineke unu kwuru, sị: “Kasienụ ndị m obi. Kasienụ ha obi.”+
2 “Gwanụ ndị bi na Jeruselem okwu ga-eru ha n’obi.*
Gwanụ ha na oge ha ga-akwụsị ịta ahụhụ eruolaNakwa na a kwụchaala ụgwọ mmehie ha.+
N’ihi na Jehova ataala ha ahụhụ niile ha kwesịrị ịta maka mmehie ha niile.”+
3 E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị:
“Dozienụ ụzọ Jehova!+
Sinụ n’ọzara waara Chineke anyị okporo ụzọ kwụ ọtọ.+
4 Meenụ ka ndagwurugwu niile dị elu,Meekwanụ ka ugwu ukwu niile na ugwu nta niile dị larịị.
Ala dị ndakoro ndakoro ga-adị larịị.
Ala na-adịghị larịị ga-adịkwa larịị.+
5 A ga-eme ka a mara na Jehova dị ebube.+
Mmadụ* niile ga-ahụkwa ya,+N’ihi na Jehova ji ọnụ ya kwuo ya.”
6 Gee ntị! E nwere onye sị: “Maa ọkwa!”
Onye ọzọ ajụọ ya, sị: “Gịnị ka m ga-ama n’ọkwa?”
“Mmadụ* niile bụ ahịhịa ndụ.
Ịhụnanya ha niile dị ka ifuru ahịhịa.+
7 Ahịhịa ndụ na-akpọnwụ akpọnwụ,Okooko ya na-achanwụkwa achanwụ,+N’ihi na Jehova na-ekusa ya ume.+
N’eziokwu, ndị mmadụ bụ ahịhịa ndụ.
8 Ahịhịa ndụ na-akpọnwụ akpọnwụ,Okooko ya na-achanwụkwa achanwụ,Ma, okwu Chineke anyị na-adịru mgbe ebighị ebi.”+
9 Nwaanyị nke na-ezi Zayọn ozi ọma,+Gbagoo n’ugwu dị elu.
Nwaanyị nke na-ezi Jeruselem ozi ọma,Jiri ike gị tie mkpu.
Tie mkpu. Atụla egwu.
Gwa obodo ndị dị na Juda, sị: “Leenụ Chineke unu.”+
10 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-abịa gosi ike ya.
Aka ya ka ọ ga-eji na-achị.+
Ọ dị njikere ịkwụ ndị ya ụgwọ ọrụ.
Ihe ọ ga-akwụ ha dịkwa n’ihu ya.+
11 Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya otú onye na-azụ atụrụ si azụ atụrụ.+
Ọ ga-eji aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya.
Ọ ga-ekuru ha n’obi ya.
Ọ ga-eji nwayọọ na-edu ndị nke ka na-enye ụmụ ha ara.+
12 Ònye ka ọbụ aka ya nwere ike ịba mmiri niile dị n’oké osimiri?+
Ònyekwa ji ọbụ aka* ya tụọ eluigwe?
Ònye wụnyere ájá dị n’ala n’ihe e ji atụ̀ ihe+Ma ọ bụ jiri ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ugwu ukwu,Jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ugwu nta?
13 Ònye tụrụ mmụọ Jehova ka ọ mata otú ọ hà?*
Ònyekwa ga-adụli Chineke ọdụ, kụziekwara ya ihe?+
14 Ònye ka ọ gakwuuru ka ọ ghọta ihe?
Ònye na-akụziri ya otú e si ekpe ikpe ziri ezi?
Ònye na-akụziri ya ihe?
Ònye na-agwa ya otú e si aghọta ihe nke ọma?+
15 Ọ na-ewere mba niile ka mmiri si na bọket tapụ.
Ọ na-ewerekwa ha ka uzuzu dị n’elu ihe e ji atụ̀ ihe.+
Ọ na-abọli agwaetiti elu ka uzuzu.
16 Ọ bụrụgodị na mmadụ egbutuo osisi niile dị na Lebanọn, dowe ha n’elu ebe ịchụàjà ka o tinye ha ọkụ,Onye ahụ ejirikwa anụ ọhịa niile dị ebe ahụ chụọ àjà a na-esu ọkụ, ihe o kwesịrị inye Chineke ezubeghị.
17 Mba niile dị ka ihe na-adịghị adị n’anya ya.+
Ọ na-ewere ha ka ihe na-enweghị ihe ha bụ na ihe efu.+
18 Ònye ka unu ga-eji tụnyere Chineke?+
Oleekwa ihe unu ga-asị na o yiri?+
19 Omenkà na-akpụ arụsị.
Onye na-eji ígwè akpụ ihe na-ejikwa ọlaedo machie ya,+Jirikwa ọlaọcha kpụọ ihe a ga-eji chọọ ya mma.
20 Mmadụ na-ahọrọ otu osisi ọ ga-eji pịa arụsị.+
Ọ na-ahọrọ osisi na-agaghị ere ure.
Ọ na-achọta omenkà bụ́ aka ochieKa ọ pịara ya arụsị na-agaghị na-ete kweke kweke.+
21 Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe a?
Ọ̀ bụ na unu anụbeghị ihe a?
Ọ̀ bụ na a kọbereghị unu ya kemgbe ụwa?
Ọ̀ bụ na unu aghọtaghị ihe a n’agbanyeghị na o doro anya kemgbe a tọrọ ntọala ụwa?+
22 Chineke bi n’ebe dị elu karịa ụwa dị gburugburu,+Nke ndị bi na ya dị ka ụkpara.
Ọ na-agbasa eluigwe ka ákwà dị fere fere,Na-agbasakwa ya ka ụlọikwuu a ga-ebi ebi.+
23 Ọ na-eweda ndị isi ala,Na-emekwa ka ndị ikpe* nọ n’ụwa bụrụ ndị na-enweghị ihe ha bụ.
24 Ha dị ka mkpụrụ a ka kụrụ akụ.
Ha dịkwa ka mkpụrụ a ka ghara agha.
Úkwù ha agbanyebeghị mgbọrọgwụ n’ala.
Ikuku fee ha, ha akpọnwụọ,Ifufe na-ebufukwa ha ka ahịhịa ọka.+
25 Onye Nsọ kwuru, sị: “Ònye ka unu ga-eji tụnyere m? Ònye ka mụ na ya hà?”
26 “Leenụ anya n’eluigwe hụ ihe ndị a.
Ònye kere ha?+
Ọ bụ Chineke, onye na-edu ha n’ìgwè, na-agụkwa ha ọnụ.
Ọ na-akpọ ha niile aha n’otu n’otu.+
O nweghị otu n’ime ha ọ na-achọ achọ,N’ihi na ike ya dị egwu, ume ya enweghịkwa atụ.+
27 Jekọb, gịnị mere i ji ekwu ihe a? Izrel, gịnị mere i ji na-asị,‘Jehova anaghị ahụ otú ihe si dịrị m,Chineke leghaara mmegbu a na-emegbu m anya’?+
28 Ị́ matabeghị ihe a? Ị́ nụbeghị ihe a?
Jehova, onye kere ihe niile dị n’ụwa, bụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi.*+
Ọ naghị ada mbà, ike anaghịkwa agwụ ya.+
O nweghị onye ga-amatali otú ọ na-aghọtaru ihe.+
29 Ọ na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike.
Ọ na-emekwa ka ume ju onye na-enweghị ume obi.+
30 Ụmụaka ndị nwoke ga-ada mbà. Ike ga-agwụkwa ha.
Ụmụ okorobịa ga na-adajọgharị, na-adarukwa ala.
31 Ma, ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike.
Ha ga-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo.+
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha.
Ha ga-eje ije, ma ha agaghị ada mbà.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Na-agụgụnụ ndị bi na Jeruselem obi.”
^ Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
^ Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ònye ghọtara otú mmụọ Jehova si arụ ọrụ.”
^ Ma ọ bụ “ndị ọchịchị.”
^ Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”