Aịzaya 13:1-22

  • Ihe Chineke kpebiri ime Babịlọn (1-22)

    • Ụbọchị Jehova dị nso (6)

    • Ndị Midia ga-emeri ndị Babịlọn (17)

    • O nweghị ihe ga-eme ka mmadụ biri na Babịlọn ọzọ (20)

13  Ihe Chineke kpebiri ime Babịlọn,+ nke Aịzaya+ nwa Emọz nụrụ mgbe ọ hụrụ ọhụụ:   “Gwunyenụ ihe ga-agbara ndị mmadụ àmà+ n’ugwu bụ́ nkume nkume, nke na-enweghị ihe kpuchiri ya. Kpọọnụ ha. Feerenụ ha aka,Ka ha bata n’ọnụ ụzọ nke ndị a ma ama.   Enyela m ndị m họpụtara* iwu.+ Akpọkọọla m ndị agha m, ndị ji nganga na-enwe aṅụrị,Ka m si n’aka ha gosi na iwe ji m.   Geenụ ntị! E nwere ndị nọ n’ugwu. Ha na-eme mkpọtụ ka ndị dị ọtụtụ. Geenụ ntị! Alaeze dị iche iche na-eme mkpọtụ. Mba ndị a kpọkọtara na-emekwa mkpọtụ.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha na-akpọkọta ndị agha ka ha gaa agha.+   Jehova ji ngwá agha ọ ga-eji gosi na iwe ji yaSi ebe dị anya na-abịa.+ O si na nsọtụ eluigwe na-abịaIbibi ụwa niile.+   Besienụ ákwá ike, n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso. N’ụbọchị ahụ, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-ebibi ihe niile dị n’ala unu.+   Ọ bụ ya mere aka niile ga-eji akụda,Obi awụnyekwa mmadụ ọ bụla n’afọ.+   Obi erughị ndị mmadụ ala.+ Ihe ọdụdọ na-adọ ha. Ahụ́ na-egbukwa ha mgbuKa nwaanyị na-amụ nwa. Ha kporopụrụ anya na-ele ibe ha. Ihu ha achagharịakwala n’ihi nhụsianya.   Ụbọchị Jehova na-abịa,Ọ ga-adị egwu n’ihi na ọ ga-eji iwe na ọnụma bịa. Ihe a ga-eme ala a n’ụbọchị ahụ ga-eju ndị mmadụ anya.+ A ga-ebibikwa ndị mmehie nọ n’ala a. 10  Kpakpando ndị dị n’eluigwe, ma ndị nke a na-akpọ ìgwè kpakpando Kisịl,*+Agaghị enye ìhè ha na-enye. Anyanwụ ga-agbakwa ọchịchịrị mgbe ọ na-awa,Ọnwa agaghịkwa enye ìhè ọ na-enye. 11  M ga-akwụ ndị bi n’ụwa ụgwọ ihe ọjọọ ha na-eme,+Kwụọkwa ndị ajọ omume ụgwọ mmehie ha. M ga-eme ka ndị mpako kwụsị ịkpa nganga,M ga-ewedakwa ndị mpako na-achị n’aka ike ala.+ 12  M ga-eme ka mmadụ efu dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,+Meekwa ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo kacha mma.*+ 13  N’ụbọchị mụnwa, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ga-ewe ezigbo iwe,M ga-eme ka eluigwe maa jijiji,+Meekwa ka ụwa mee mkpatụ, si na ntọala ya pụọ. 14  Onye ọ bụla ga-agbakwuru ndị nke ya,Onye ọ bụla ga-agbala n’ala ya,+Dị ka nne mgbada a na-achụ ọsọ, nakwa dị ka ìgwè atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. 15  A ga-amagbu onye ọ bụla a hụrụ,Jirikwa mma agha gbuo onye ọ bụla a nwụdere.+ 16  A ga-anọ n’ihu ha kụgbuo ụmụ ha.+ A ga-akwakọrọ ihe niile dị n’ụlọ ha. A ga-edinakwa ndị nwunye ha n’ike. 17  M ga-eme ka ndị Midia lụso ha agha.+ Ndị Midia ejighị ọlaọcha kpọrọ ihe. Ha enweghịkwa mmasị ọ bụla n’ọlaedo. 18  Ha ga-eji ụta ha gbajaa ụmụ okorobịa.*+ Ha agaghị emere ụmụ ndị Babịlọn ebere. Ha agaghịkwa emewe ụmụ ha ihe lee anya n’azụ. 19  Babịlọn, nke bụ́ alaeze kacha dị ebube,*+Ọmarịcha obodo ndị Kaldia* ji akpa nganga,+Ga-adị otú Sọdọm na Gọmọra dị mgbe Chineke bibiri ha.+ 20  O nweghị ihe ga-eme ka mmadụ biri na ya ọzọ. Ọ gaghịkwa abụ ebe a ga-ebi ebi n’ọgbọ niile.+ E nweghị onye Arab ga-ama ụlọikwuu ya ebe ahụ. E nweghịkwa onye na-azụ atụrụ ga-ahapụ atụrụ ya ka ha nọrọ ebe ahụ zuo ike. 21  Anụ ọhịa ndị na-ebi n’ọzara ga-amakpu ebe ahụ. Ikwiikwii ga-ejupụta n’ụlọ ha. Enyí nnụnụ ga-ebikwa ebe ahụ,+Ewu ọhịa* ga na-awụgharịkwa ebe ahụ. 22  Anụ dị iche iche ga-anọ n’ụlọ elu ndị dị na ya na-eti mkpu. Nkịta ọhịa ga na-anọkwa n’ọmarịcha obí eze ndị dị na ya. Oge ihe ndị a ga-eme ya dị nso, a gaghịkwa agbatịkwuru ya ụbọchị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ndị m doro nsọ.”
O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Ọrayọn nakwa ndị ọzọ gbara ya gburugburu.
Ma ọ bụ “ọlaedo Ofa.”
Ya bụ, ụmụ okorobịa Babịlọn.
Ndị Kaldia bụ ndị Babịlọn.
Ma ọ bụ “ihe e ji chọọ alaeze niile mma.”
O nwere ike ịbụ, “Ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu.”