Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 18:1-34
18 Jehoshafat nwere akụnụba. A na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù.+ Ma, ya na Ehab gọrọ ọgọ.+
2 Ka afọ ole na ole gachara, Jehoshafat gara Sameria+ ka ọ hụ Ehab. Mgbe o ruru, Ehab chụrụ ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi n’àjà maka ya na ndị ya na ha so. Ọ rịọsikwara ya ike ka o soro ya gaa lụso ndị Remọt-gilied agha.+
3 Ehab eze Izrel jụkwara Jehoshafat eze Juda, sị: “Ị̀ ga-eso m gaa Remọt-gilied?” Ya asị ya: “Mụ na gị bụ otu. Ndị m na ndị gị bụkwa otu. Anyị ga-eso gị gaa agha.”
4 Ma, Jehoshafat sịrị eze Izrel: “Biko, burugodị ụzọ jụta ihe Jehova chọrọ ka e mee.”+
5 Eze Izrel wee kpọkọọ narị ndị amụma anọ (400), jụọ ha, sị: “Ọ̀ bụ anyị gaa lụso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ anyị agala?” Ha asị ya: “Gawa, ezi Chineke ga-enyefe ya n’aka eze.”
6 Ma Jehoshafat jụrụ ya, sị: “Ọ̀ bụ na e nweghị onye amụma Jehova ebe a?+ Ka anyị si n’aka ya jụọkwa Chineke ase.”+
7 Eze Izrel asị Jehoshafat: “A ka nwere otu nwoke+ anyị ga-esi n’aka ya jụọ Jehova ase. Ma akpọrọ m ya asị, n’ihi na o nweghị mgbe ọ na-eburu m amụma ihe ọma, kama, ọ na-eburu m amụma ihe ọjọọ mgbe niile.+ Ọ bụ Mịkaya nwa Imla.” Ma, Jehoshafat sịrị ya: “Eze, ekwula otú ahụ.”
8 Eze Izrel wee kpọọ otu onye na-eje ozi n’obí ya, sị ya: “Gaa ọsọ ọsọ kpọta Mịkaya nwa Imla.”+
9 N’oge ahụ, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda yicha uwe ndị eze, nọrọkwa ọdụ n’ocheeze ha. Ha nọ n’ebe a na-azọcha ọka, nke dị n’ọnụ ụzọ ámá Sameria. Ndị amụma niile ahụ nọkwa n’ihu ha na-ebu amụma.
10 Zedekaya nwa Keneana chịkwa mpi ndị o ji ígwè rụọ bịakwute Ehab ma sị ya: “Jehova kwuru, sị, ‘Ị ga-eji mpi ndị a na-egbu ndị Siria ruo mgbe i gbuchara ha.’”
11 Ndị amụma niile ahụ nọkwa na-ebu otu ihe ahụ n’amụma, na-asị: “Gawa Remọt-gilied. Ị ga-emeri.+ Jehova ga-enyefe ya n’aka eze.”
12 Onye ahụ gara ịkpọ Mịkaya gwara ya, sị: “Ndị amụma niile na-agwa eze ihe dị mma. Biko, gwa ya ihe dị mma,+ ka ihe ị ga-agwa ya na nke hanwa gwara ya bụrụ otu.”+
13 Ma Mịkaya sịrị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na ọ bụ ihe Chineke m kwuru ka m ga-ekwu.”+
14 Ọ bịakwuteziri eze, eze asị ya: “Mịkaya, ọ̀ bụ anyị gaa lụso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ anyị agala?” Mịkaya asị ya ozugbo ahụ: “Gaanụ, unu ga-emeri. A ga-enyefekwa ya n’aka unu.”
15 Eze asị ya: “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi n’aha Jehova na ị gaghị agwa m ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị naanị eziokwu?”
16 Ya asịzie ya: “M na-ahụ ka a chụsasịrị ndị Izrel niile n’ugwu, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ Jehova asị: ‘O nweghị ndị nwe ndị a. Ka onye ọ bụla n’ime ha laghachi n’ụlọ ya n’udo.’”
17 Eze Izrel asịzie Jehoshafat: “Ọ̀ kwa m gwara gị agwa na ọ gaghị eburu m amụma ihe ọma, kama, naanị amụma ihe ọjọọ?”+
18 Mịkaya asị: “Nụrụnụ ihe Jehova chọrọ ka m gwa unu: M hụrụ ka Jehova nọ ọdụ n’ocheeze ya+ nakwa ka ìgwè ndị mmụọ ozi niile nọ n’eluigwe+ guzo n’aka nri ya nakwa n’aka ekpe ya.+
19 Jehova asị, ‘Ònye ga-arafu Ehab eze Izrel, ka o wee gaa nwụọ na Remọt-gilied?’ Ha ebido na-ekwu ihe dị iche iche. Otu onye kwuo otu ihe, onye ọzọ ekwuo ihe ọzọ.
20 Otu mmụọ ozi*+ mechara bịa guzo n’ihu Jehova, sị, ‘M ga-arafu ya.’ Jehova asị ya, ‘Olee otú ị ga-esi arafu ya?’
21 Ya asị, ‘M ga-aga mee ka ndị amụma ya niile ghaara ya ụgha.’ Chineke asị ya, ‘Ị ga-arafu ya, ije gị ga-enwekwa isi. Gaa rafuo ya.’
22 Ugbu a, Jehova emeela ka ndị amụma gị ndị a ghaara gị ụgha.+ Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ekpebiela na ihe ọjọọ ga-eme gị.”
23 Zedekaya+ nwa Keneana wee bịaruo Mịkaya+ nso ma maa ya ụra,+ sị: “Olee nnọọ otú mmụọ Jehova si hapụ m gaa gwawa gị okwu?”+
24 Mịkaya asị ya: “Ụbọchị ị ga-ama otú o si hapụ gị bụ ụbọchị ị ga-agbaba n’ime ime ụlọ gị zoo.”
25 Eze Izrel asị: “Kpọrọnụ Mịkaya kpọgara Emọn bụ́ onyeisi obodo nakwa Joash nwa eze.
26 Gwakwanụ ha, sị, ‘Eze kwuru, sị: “Tụbanụ onye a n’ụlọ mkpọrọ,+ na-enyekwanụ ya obere nri na obere mmiri ruo mgbe m lọtara n’udo.”’”
27 Ma Mịkaya sịrị: “Ị lọta n’udo, mara na Jehova agwaghị m okwu.”+ O kwukwara, sị: “Unu niile, burunụ ihe a m kwuru n’obi.”
28 Eze Izrel na Jehoshafat eze Juda wee gawa Remọt-gilied.+
29 Eze Izrel wee sị Jehoshafat: “M ga-ejigharị ejiji banye n’ọgbọ agha, ma gịnwa ga-eyiri uwe eze nke gị.” Eze Izrel wee jigharịa ejiji, ha abanye n’ọgbọ agha.
30 Ma, eze Siria gwara ndị isi na-agba ụgbọ ịnyịnya ya, sị: “Unu alụsola onye ọ bụla ọgụ, ma onye ukwu ma onye nta, ma e wezụga eze Izrel.”
31 Ozugbo ndị isi na-agba ụgbọ ịnyịnya ahụ hụrụ Jehoshafat, ha kwuru n’obi ha, sị: “Ọ bụ eze Izrel.” Ha wee tụgharịa ka ha lụso Jehoshafat agha, ya amalite iti mkpu ka e nyere ya aka,+ Jehova Chineke enyere ya aka ozugbo, mee ka ha kwụsị ịchụ ya.
32 Ozugbo ndị isi ahụ na-agba ụgbọ ịnyịnya hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụ ya.
33 Ma, e nwere otu nwoke gbara ụta n’ebughị onye ọ bụla n’obi, ma ọ gbatara ya eze Izrel n’ebe e jikọrọ uwe agha ya. Eze asị onye na-anya ụgbọ ịnyịnya ya: “Tụgharịa, bupụ m n’ọgbọ agha a, n’ihi na e merụọla m ezigbo ahụ́.”+
34 Agha ahụ bịara sie ezigbo ike n’ụbọchị ahụ, nke na a kwụwara eze Izrel ọtọ n’ụgbọ ịnyịnya ahụ chee ya ihu n’ebe ndị Siria nọ ruo mgbede. Ma, ọ nwụrụ mgbe anyanwụ dara.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Otu mmụọ.”