Samuel nke Mbụ 4:1-22
4 Samuel nọ na-agwa ndị Izrel niile ihe Chineke kwuru.
Ndị Izrel wee gaa ịlụso ndị Filistia agha. Ha makwara ụlọikwuu ha n’ebe dị nso n’Ebeniza, ndị Filistia amaa ụlọikwuu nke ha n’Efek.
2 Ndị Filistia haziri onwe ha n’usoro ịlụso ndị Izrel agha, ma agha ahụ bịara siere ndị Izrel ike. Ndị Filistia wee merie ha, gbuo ihe dị ka puku ụmụ nwoke anọ (4,000) n’ọgbọ agha, n’ọhịa.
3 Mgbe ndị Izrel laghachiri ebe ha mara ụlọikwuu, ndị okenye Izrel sịrị: “Gịnị mere Jehova ji hapụ ndị Filistia ha emerie anyị taa?*+ Ka anyị gaa Shaịlo buru igbe ọgbụgba ndụ Jehova,+ bute ya ebe a anyị nọ, ka ọ zọpụta anyị n’aka ndị iro anyị.”
4 Ha wee ziga ndị mmadụ Shaịlo, ha esi ebe ahụ bute igbe ọgbụgba ndụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, onye nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob.+ Ụmụ Ịlaị abụọ, bụ́ Họfnaị na Finihas,+ nọkwa ebe ahụ igbe ọgbụgba ndụ nke ezi Chineke dị.
5 Ozugbo e bubatara igbe ọgbụgba ndụ Jehova ebe ha mara ụlọikwuu, ndị Izrel niile malitere iti ezigbo mkpu, nke mere ka ala maa jijiji.
6 Mgbe ndị Filistia nụrụ mkpu ahụ ha na-eti, ha sịrị: “Gịnị mere ndị Hibru ji na-eti ụdị mkpu a n’ebe ha mara ụlọikwuu?” Ha mechara mata na e bubatala Igbe Jehova n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.
7 Ụjọ wee jide ndị Filistia, ha asị: “Chineke abatala ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.”+ Ha sịkwara: “Anyị efuola, n’ihi na ụdị ihe a emetụbeghị.
8 Nke anyị na-eme agwụla! Ònye ga-azọpụta anyị n’aka Chineke a dị ebube? Ọ bụ ya bụ Chineke ahụ si ụzọ dị iche iche gbuo ndị Ijipt n’ala ịkpa.+
9 Ma, unu ndị Filistia, obi sie unu ike, meekwanụ ka ndị dimkpa, ka unu ghara ịgbawara ndị Hibru ohu otú ha na-agbara unu.+ Meenụ ka ndị dimkpa, lụọkwanụ agha.”
10 Ndị Filistia wee lụso ndị Izrel agha, merie ha,+ onye ọ bụla n’ime ha agbalaga n’ụlọikwuu ya. Ndị e gburu karịrị akarị. E gburu puku ndị agha Izrel iri atọ (30,000) na-eji ụkwụ aga.
11 E bukwaara Igbe Chineke, ụmụ Ịlaị abụọ, bụ́ Họfnaị na Finihas, nwụkwara.+
12 N’ụbọchị ahụ, otu nwoke onye ebo Benjamin ji ọsọ si n’ọgbọ agha gbapụta, gbarute Shaịlo. Ọ dọwara uwe ya adọwa, kpokwasịkwa ájá n’isi ya.+
13 Mgbe o rutere, Ịlaị nọ ọdụ n’oche dị n’akụkụ ụzọ, na-elepụ anya, n’ihi na obi na-akụ ya kpum kpum maka Igbe ezi Chineke.+ Nwoke ahụ wee banye n’obodo kọọ ihe merenụ, obodo ahụ niile amalite ibe ákwá.
14 Mgbe Ịlaị nụrụ mkpu ákwá a, ọ jụrụ, sị: “Gịnị bụ isi mkpọtụ a m na-anụ?” Nwoke ahụ wee mee ngwa, banye kọọrọ Ịlaị ihe merenụ.
15 (Ịlaị dị afọ iri itoolu na asatọ. Anya ya anaghịzi emegharị emegharị. Ọ naghịkwa ahụ ụzọ.)+
16 Nwoke ahụ wee sị Ịlaị: “Ọ bụ m bụ onye si n’ọgbọ agha lọta. Esi m n’ọgbọ agha gbalata taa.” Ya asị ya: “Nwa m, gịnị mere?”
17 Onye ahụ nke bịara ịkọ ihe merenụ asị ya: “Ndị Izrel agbaarala ndị Filistia ọsọ. A sụọkwala ndị Izrel akwụ.+ Ụmụ gị abụọ, bụ́ Họfnaị na Finihas, anwụọla.+ E burukwala Igbe ezi Chineke.”+
18 Ozugbo ọ kpọtara Igbe ezi Chineke aha, Ịlaị esi n’oche ya dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá dalaa azụ, olu ya agbajie, ya anwụọ, n’ihi na o meela agadi, o bukwara ibu. O kpere Izrel ikpe afọ iri anọ.
19 Nwunye nwa ya, bụ́ nwunye Finihas, dị ime ọmụmụ. Mgbe ọ nụrụ na e burula Igbe ezi Chineke nakwa na nna di ya na di ya anwụọla, o hulatara, ime ebido ime ya na mberede, ya amụọ nwa.
20 Mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, ụmụ nwaanyị ndị guzo ya n’akụkụ sịrị ya: “Atụla egwu, n’ihi na ị mụọla nwa nwoke.” Ma, ọ tụpụghị ọnụ. Ọ nụghịkwa ihe ha kwuru.
21 Ma ọ gụrụ nwa ahụ Ịkabọd,*+ sị: “Ebube esila n’Izrel pụọ gaa mba ọzọ.”+ O kwuru ihe a n’ihi Igbe ezi Chineke e buuru nakwa n’ihi ihe mere nna di ya na di ya.+
22 Ọ sịkwara: “Ebube esila n’Izrel pụọ gaa mba ọzọ, n’ihi na e burula Igbe ezi Chineke.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Gịnị mere Jehova ji merie anyị taa n’ihu ndị Filistia?”
^ O nwere ike ịbụ, “n’etiti.”
^ Ịkabọd pụtara “Olee Ebe Ebube Dị?”