Samuel nke Mbụ 31:1-13

  • Mgbe Sọl na ụmụ ya atọ nwụrụ (1-13)

31  Ndị Filistia nọ na-alụso ndị Izrel agha,+ gbuokwa ọtụtụ n’ime ha n’Ugwu Gilboa.+ Ndị Izrel fọrọnụ gbara ọsọ.  Ndị Filistia wee chụsie Sọl na ụmụ ya ọsọ ike, chụkwute ha, gbuokwa Jonatan,+ Abinadab, na Malkaị-shua, ụmụ Sọl.+  Agha ahụ wee siere Sọl ike, ndị na-agba ụta emechaakwa hụ ya ma gbaa ya ụta merụrụ ya ezigbote ahụ́.+  Sọl wee sị onye na-eburu ya ngwá agha: “Mịrị mma agha gị maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù+ ghara ịbịa mesie m ike ma were mma agha ha magbuo m.” Ma obi ekweghị onye na-eburu ya ngwá agha ime ihe a ọ gwara ya, n’ihi na ezigbo ụjọ ji ya. Sọl wee mịrị mma agha dakwasị na ya.+  Mgbe onye na-eburu ya ngwá agha hụrụ na ọ nwụọla,+ yanwa dakwasịkwara ná mma agha nke ya, nwụọkwa.  Otú a ka Sọl, ụmụ ya atọ, onye na-eburu ya ngwá agha, nakwa ndị ohu ya niile si nwụọ n’ụbọchị ahụ.+  Mgbe ndị Izrel ndị nọ na ndagwurugwu nakwa n’akụkụ Osimiri Jọdan hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, nakwa na Sọl na ụmụ ya anwụọla, ha malitere ịhapụ obodo ndị ahụ gbaa ọsọ.+ Ndị Filistia mechakwara bịa bichie ebe ndị ahụ.  N’echi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụsị ndị e gburu egbu ihe ha yi, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya atọ ka ha tọgbọ n’Ugwu Gilboa.+  Ha wee gbupụ ya isi, yipụ ya uwe agha* ya, ziekwa ozi+ ka a gaa n’ala ndị Filistia niile nakwa n’ụlọ arụsị ha+ gwa ndị obodo ha ihe merenụ. 10  Ha dowekwara ngwá agha ya n’ụlọ arụsị Ashtọret, kedokwa ozu ya ná mgbidi Bet-shan.+ 11  Mgbe ndị Jebesh-gilied+ nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl, 12  ndị agha ha niile ejiri abalị ụbọchị ahụ niile gaa bupụta ozu Sọl na ozu ụmụ ya ná mgbidi Bet-shan. Ha bu ozu ha lọta Jebesh, suokwa ha ọkụ ebe ahụ. 13  Ha chịkwaara ọkpụkpụ ha+ gaa lie n’okpuru osisi tamarisk dị na Jebesh.+ Ha bukwara ọnụ ụbọchị asaa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ekike agha.”