Samuel nke Mbụ 10:1-27

  • E tere Sọl mmanụ ka ọ bụrụ eze (1-16)

  • A kpọpụtara Sọl, gwa ndị Izrel na ọ bụ ya ga-abụ eze ha (17-27)

10  Samuel wee were karama mmanụ wụọ Sọl mmanụ n’isi.+ O susukwara ya ọnụ,* sị ya: “N’eziokwu, Jehova eteela gị mmanụ ka ọ bụrụ gị ga na-edu+ ndị ya.+  Ị hapụ m taa lawa, ị ga-ahụ ụmụ nwoke abụọ n’akụkụ ili Rechel+ dị na Zelza n’ala ebo Benjamin. Ha ga-asị gị, ‘A chọtala jakị ndị ahụ ị gara ịchọ. Nna gị anaghịzi eche gbasara jakị ndị ahụ.+ Ọ na-echegbuzi onwe ya ugbu a maka gị. Ọ nọkwa na-asị: “Gịnị ka m ga-eme ebe ọ bụ na nwa m nwoke alọtabeghị?”’  Hapụ ha gawa. Ị garuo ebe nnukwu osisi dị na Tebọ, ị ga-ahụ ụmụ nwoke atọ na-aga Betel ife ezi Chineke.+ Otu kpụ ewu atọ, ọzọ ji achịcha atọ, ọzọ bu nnukwu ite mmanya.  Ha ga-ajụ gị otú i mere, nyekwa gị achịcha abụọ. Nara ha achịcha ndị ahụ.  E mechaa, gị agaa n’ugwu nke ezi Chineke, ebe ndị agha Filistia na-anọ eche nche. I ruo n’obodo ahụ, ị ga-ahụ ndị amụma si n’ebe dị elu na-agbadata. Ha na-ebu amụma. Ị ga-ahụkwa ndị nọ n’ihu ha na-akpọ ụbọ akwara na une, na-akụ ịgbà, na-afụkwa ọjà.  Mmụọ Jehova ga-enye gị ike,+ gị esoro ha buwe amụma. Ọ ga-adịkwa ka ị̀ gbanwere bụrụ onye ọzọ.+  Ọ bụrụ na ihe ndị a emee, mee ihe i nwere ike ime ka ị rụchaa ọrụ gị, n’ihi na ezi Chineke nọnyeere gị.  Buru m ụzọ gaa Gilgal.+ M ga-abịakwutekwa gị ebe ahụ ka m chụọ àjà a na-esu ọkụ na àjà udo. Ị ga-eche m ụbọchị asaa, tupu mụ abịakwute gị. M rute, m ga-agwa gị ihe ị ga-eme.”  Ozugbo Sọl hapụrụ Samuel pụwa, Chineke malitere ime ka Sọl na-akpa àgwà ka onye ọzọ. Ihe niile ahụ a gwara ya mezukwara n’ụbọchị ahụ. 10  Sọl na onye na-ejere ya ozi wee si ebe ahụ gaa n’ugwu, ndị amụma abịa zute ya. Ozugbo ahụ, mmụọ Chineke nyere ya ike,+ ya esoro ha buwe amụma.+ 11  Mgbe ndị niile mabu ya hụrụ ka o so ndị amụma na-ebu amụma, ha gwara ibe ha, sị: “Gịnị na-eme nwa Kish? Sọl ò sokwu ná ndị amụma?” 12  Otu nwoke onye ebe ahụ wee sị: “Ole ndị bụ nna ndị amụma ndị nke ọzọ?” Ọ bụ ya mere e ji asị:* “Sọl ò sokwu ná ndị amụma?”+ 13  Mgbe o buchara amụma, ọ gara n’ebe dị elu. 14  Mgbe e mechara, nwanne nna Sọl jụrụ ya na onye na-ejere ya ozi, sị: “Ebee ka unu gara?” Ya asị: “Anyị gara ịchọ jakị ndị ahụ furu efu,+ ma, anyị ahụghị ha ebe ndị anyị chọrọ ha, anyị agazie hụ Samuel.” 15  Nwanne nna Sọl asị ya: “Biko, kọọrọ m ihe Samuel gwara unu.” 16  Sọl asị nwanne nna ya: “Ọ gwara anyị na a chọtala jakị ndị ahụ.” Ma ọ gwaghị ya na Samuel kwuru na ọ ga-abụ eze. 17  Samuel wee kpọkọta ndị Izrel n’ihu Jehova na Mizpa.+ 18  Ọ gwara ha, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel sịrị: ‘Ọ bụ m si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel. Ọ bụkwa m napụtara unu n’aka ndị Ijipt+ nakwa n’aka alaeze niile nọ na-akpagbu unu. 19  Ma, unu jụrụ Chineke unu taa,+ onye zọpụtara unu n’ihe ọjọọ niile nọ na-eme unu nakwa n’ahụhụ niile unu nọ na-ata. Unu sịrị: “Họpụtara anyị eze ga na-achị anyị.” Ugbu a, guzonụ n’ihu Jehova n’ebo n’ebo nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara.’”* 20  Samuel gwaziri ebo niile n’Izrel ka ha na-abịa nso+ n’ebo n’ebo, ha ana-abịa, Chineke ahọrọ ebo Benjamin.+ 21  Ọ gwakwara ebo Benjamin ka ha bịa nso n’ezinụlọ n’ezinụlọ, ha abịa, Chineke ahọrọ ezinụlọ Mata. N’ikpeazụ, Chineke họọrọ Sọl nwa Kish.+ Ma, mgbe ha chọwara ya, ha ahụghị ya. 22  N’ihi ya, ha jụrụ Jehova, sị:+ “Nwoke ahụ ò rutela ebe a?” Jehova asị ha: “Leenụ ya ebe ọ gara zoo n’ebe ahụ ngwongwo juru.” 23  Ha wee jiri ọsọ gaa kpọpụta ya ebe ahụ. Mgbe o guzooro n’etiti ndị Izrel, ọ kacha mmadụ niile ogologo. Ndị na-esote ya n’ogologo na-eru ya n’ubu.+ 24  Samuel wee gwa ndị Izrel niile, sị: “Lekwanụ onye Jehova họọrọ.+ O nweghị onye dị ka ya n’ime mmadụ niile.” Mmadụ niile wee malite iti mkpu, sị: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!” 25  Samuel gwaziri ndị Izrel ihe ruuru eze,+ deekwa ya n’akwụkwọ ma dowe ya n’ụlọikwuu Jehova. Ọ gwakwara ndị Izrel niile ka ha lawa, onye ọ bụla n’ime ha alawa n’ụlọ ya. 26  Sọl lawakwara n’ụlọ ya dị na Gibia. Ndị dike Jehova metụrụ aka n’obi wee soro ya. 27  Ma ụmụ nwoke ndị na-abaghị uru ọ bụla sịrị: “Olee otú onye a ga-esi zọpụta anyị?”+ Ha ledara ya anya. Ha ewetaghịkwaara ya onyinye ọ bụla.+ Ma ọ gbachiri ha nkịtị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.
Ma ọ bụ “e ji atụ ilu, sị.”
Ma ọ bụ “n’ìgwè n’ìgwè, nke ga-adị otu puku mmadụ otu puku mmadụ.”