Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 23:1-32
23 Mgbe Devid mere agadi, ya afọkwa obere oge ka ọ nwụọ, o mere Solomọn nwa ya eze Izrel.+
2 Ọ kpọkọtakwara ndị isi ndị Izrel niile, ndị nchụàjà,+ na ndị Livaị.+
3 A gụkwara ndị Livaị ọnụ malite ná ndị gbara afọ iri atọ gbagowe.+ Ụmụ nwoke niile dị puku iri atọ na puku asatọ (38,000).
4 Puku iri abụọ na puku anọ (24,000) n’ime ha na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova, puku isii (6,000) bụkwa ndị isi na ndị ikpe.+
5 Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá dị puku mmadụ anọ (4,000).+ E nwekwara puku mmadụ anọ (4,000) ndị na-eji ngwá egwú eto+ Jehova. Ngwá egwú ha bụ ndị ahụ Devid kwuru banyere ha, sị, “Emere m ha ka e jiri ha na-eto Chineke.”
6 Devid wee hazie* ụmụ Livaị n’ìgwè n’ìgwè,+ ya bụ, Geshọn, Kohat, na Meraraị.+
7 Ụmụ Geshọn bụ Ledan na Shimiaị.
8 Ụmụ Ledan bụ Jehayel, bụ́ onyeisi, Zitam, na Joel.+ Ha dị atọ.
9 Ụmụ Shimiaị bụ Shelomọt, Heziel, na Heran. Ha dị atọ. Ọ bụ ha bụ ndị isi ezinụlọ Ledan.
10 Ụmụ Shimiaị bụ Jehat, Zaịna,* Jiọsh, na Beraya. Mmadụ anọ a bụ ụmụ Shimiaị.
11 Jehat bụ onyeisi ha, Zaịza abụrụ onye nke abụọ. Ma, ebe ọ bụ na Jiọsh na Beraya amụghị ọtụtụ ụmụ, a gụkọtara ha abụọ ka otu ọnụmara. Ha na-arụkwa otu ọrụ.
12 Ụmụ Kohat bụ Amram, Izha,+ Hebrọn na Ọziel.+ Ha dị anọ.
13 Ụmụ Amram bụ Erọn+ na Mosis.+ Ma, e doro Erọn na ụmụ ya ndị nwoke iche+ ka ha na-edo Ebe Kacha Nsọ nsọ. Ọ bụkwa ha ga na-achụrụ Jehova àjà, na-ejere ya ozi, na-agọzikwa ndị mmadụ n’aha ya mgbe niile.+
14 Ma a na-agụnye ụmụ Mosis bụ́ onye nke ezi Chineke n’ebo Livaị.
15 Ụmụ Mosis bụ Geshọm+ na Eliiza.+
16 N’ụmụ Geshọm, Shebuel+ bụ onyeisi.
17 N’ụmụ Eliiza, Rehabaya+ bụ onyeisi. Eliiza amụghị ụmụ ọzọ, ma ụmụ Rehabaya dị nnọọ ọtụtụ.
18 N’ụmụ Izha,+ Shelomit+ bụ onyeisi.
19 N’ụmụ Hebrọn, Jeraya bụ onyeisi. Amaraya bụ onye nke abụọ. Jahazayel bụ onye nke atọ. Jekamiam+ bụ onye nke anọ.
20 N’ụmụ Ọziel,+ Maịka bụ onyeisi, Ịs-shaya abụrụ onye nke abụọ.
21 Ụmụ Meraraị bụ Malaị na Mushaị.+ Ụmụ Malaị bụ Elieza na Kish.
22 Elieza nwụrụ n’amụtaghị nwoke ọ bụla. Naanị ụmụ nwaanyị ka ọ mụrụ. Ụmụ Kish bụ́ ndị ikwu* ha wee lụrụ ha.
23 Ụmụ Mushaị bụ Malaị, Ịda, na Jeremọt. Ha dị atọ.
24 Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Livaị ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara, ha na ndị isi ha. A gụrụ ndị Livaị ọnụ, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe, deekwa aha ha ka ọ bụrụ ha ga na-eje ozi a na-eje n’ụlọ Jehova.
25 Devid sịrị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel emeela ka ndị ya zuru ike.+ Ọ ga-ebikwa na Jeruselem ruo mgbe ebighị ebi.+
26 Ndị Livaị agaghịkwa na-ebugharị ụlọikwuu ahụ ma ọ bụ arịa ndị dị na ya e ji ejere Chineke ozi.”+
27 A gụrụ ndị Livaị ọnụ, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe. Ihe a so n’ihe ikpeazụ Devid kwuru ka e mee.
28 Ọrụ ha bụ inyere ụmụ Erọn aka+ n’ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova, ma n’ogige ya+ ma n’ebe a na-anọ eri ihe ma n’ido ihe ọ bụla dị nsọ ọcha, nakwa n’ọrụ ọ bụla gbasara ozi a na-eje n’ụlọ ezi Chineke.
29 Ha na-enyekwara ha aka na-ahụ maka achịcha a na-enye Chineke,+ ntụ ọka e gwere nke ọma maka ịchụ àjà ọka, achịcha na-ekoghị eko dị fere fere,+ keeki e mere n’ite dị mbadamba, na ntụ ọka a gwọrọ agwọ.+ Ha na-enyekwa aka atụ̀ ihe niile a na-atụ atụ̀ iji mata ole ha dị na otú ha hà.
30 Ha na-anọkwa ebe ahụ n’ụtụtụ ọ bụla+ nakwa ná mgbede ọ bụla na-ekele Jehova, na-etokwa ya.+
31 Ha na-enyekwa aka mgbe ọ bụla a na-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ n’Ụbọchị Izu Ike,+ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ nakwa n’oge ememme dị iche iche.+ Ha na-enye aka mgbe niile a na-achụrụ Jehova àjà a otú iwu kwuru ka e si na-eme ya.
32 Ha na-arụkwa ọrụ n’ụlọikwuu nzute nakwa n’ebe nsọ. Ha na-enyekwara ụmụ Erọn, bụ́ ụmụnne ha, aka n’ozi a na-eje n’ụlọ Jehova.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “kee.”
^ A kpọrọ ya “Zaịza” n’amaokwu nke iri na otu.
^ Na Hibru, “ụmụnne.”