Ọnụ Ọgụgụ 7:1-89
-
Onyinye ndị e wetara mgbe a na-enyefe Chineke ụlọikwuu (1-89)
7 N’ụbọchị Mosis machara ụlọikwuu ahụ,+ o tere ya mmanụ+ ma mee ka ọ dị nsọ, ya na ngwongwo ya niile, ebe ịchụàjà ahụ, na arịa ya niile.+ Mgbe o techara ihe ndị a mmanụ ma mee ka ha dị nsọ,+
2 ndị isi ndị Izrel,+ bụ́ ndị isi ọnụmara ha niile, nyere onyinye. Ọ bụ ndị a, bụ́ ndị isi ebo dị iche iche, hụrụ maka ideba aha ndị mmadụ n’akwụkwọ.
3 Ha wetara onyinye ha n’ihu Jehova, ya bụ, ụgbọala isii anụmanụ na-adọkpụ ndị e kpuchiri elu ha ekpuchi na oké ehi iri na abụọ. Mmadụ abụọ abụọ n’ime ndị isi ahụ wetara otu ụgbọala, otu onye isi ọ bụla eweta otu oké ehi. Ha wetara ha n’ihu ụlọikwuu ahụ.
4 Jehova gwara Mosis, sị:
5 “Nara ha ihe ndị a n’ihi na a ga-eji ha na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute. Ị ga-ewere ha nye ndị Livaị. Ị ga-esi na ha nye onye nke ọ bụla ihe ọ ga-eji na-arụ ọrụ e nyere ya.”
6 Mosis wee nara ụgbọala ndị ahụ anụmanụ na-adọkpụ na ehi ndị ahụ ma nye ha ndị Livaị.
7 O nyere ụmụ Geshọn ụgbọala abụọ na ehi anọ ha ga-eji na-arụ ọrụ e nyere ha.+
8 O nyekwara ụmụ Meraraị ụgbọala anọ na ehi asatọ ha ga-eji na-arụ ọrụ e nyere ha. Ọ bụ Ịtama nwa Erọn onye nchụàjà ka o nyefere ha.+
9 Ma e nweghị nke o nyere ụmụ Kohat n’ihi na ọrụ ha gbasara ebe nsọ.+ Ọ bụkwa n’ubu ha ka ha na-ebu ihe ndị dị nsọ.+
10 Ndị isi ahụ nyere onyinye ọzọ mgbe a na-enyefe+ Chineke ebe ịchụàjà ahụ, ya bụ, n’ụbọchị e tere ya mmanụ. Mgbe ndị isi ahụ wetara onyinye ha n’ihu ebe ịchụàjà,
11 Jehova gwara Mosis, sị: “Onyeisi nke ọ bụla ga-eweta onyinye ọ chọrọ inye maka inyefe Chineke ebe ịchụàjà ahụ, otu onyeisi weta taa, onyeisi ọzọ eweta echi.”
12 Onye nyere onyinye ya n’ụbọchị nke mbụ bụ Nashọn+ nwa Aminadab, onye si n’ebo Juda.
13 Onyinye o nyere bụ otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel* na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ*+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
14 O nyekwara otu iko* ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens* juru n’ime ya;
15 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
16 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
17 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Nashọn nwa Aminadab+ nyere.
18 N’ụbọchị nke abụọ, Netanel+ nwa Zua, onyeisi ebo Ịsaka, nyere onyinye nke ya.
19 Onyinye o nyere bụ otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’ịdị arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
20 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
21 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
22 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
23 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Netanel nwa Zua nyere.
24 N’ụbọchị nke atọ, Elayab+ nwa Hilọn, onyeisi ụmụ Zebulọn,
25 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
26 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
27 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
28 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
29 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Elayab+ nwa Hilọn nyere.
30 N’ụbọchị nke anọ, Elaịzọ+ nwa Shedeọ, onyeisi ụmụ Ruben,
31 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
32 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
33 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
34 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
35 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Elaịzọ+ nwa Shedeọ nyere.
36 N’ụbọchị nke ise, Shelumiel+ nwa Zurishadaị, onyeisi ụmụ Simiọn,
37 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
38 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
39 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
40 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
41 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Shelumiel+ nwa Zurishadaị nyere.
42 N’ụbọchị nke isii, Elayasaf+ nwa Duel, onyeisi ụmụ Gad,
43 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
44 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
45 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
46 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
47 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Elayasaf+ nwa Duel nyere.
48 N’ụbọchị nke asaa, Elishama+ nwa Amaịhọd, onyeisi ụmụ Ifrem,
49 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
50 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
51 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
52 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
53 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Elishama+ nwa Amaịhọd nyere.
54 N’ụbọchị nke asatọ, Gameliel+ nwa Pedazọ, onyeisi ụmụ Manase,
55 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
56 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
57 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
58 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
59 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Gameliel+ nwa Pedazọ nyere.
60 N’ụbọchị nke itoolu, Abidan+ nwa Gidionaị, onyeisi+ ụmụ Benjamin,
61 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
62 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
63 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
64 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
65 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Abidan+ nwa Gidionaị nyere.
66 N’ụbọchị nke iri, Ahayiza+ nwa Amishadaị, onyeisi ụmụ Dan,
67 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
68 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
69 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
70 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
71 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Ahayiza+ nwa Amishadaị nyere.
72 N’ụbọchị nke iri na otu, Pegiel+ nwa Ọkran, onyeisi ụmụ Asha
73 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka ọka.+
74 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
75 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
76 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
77 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Pegiel+ nwa Ọkran nyere.
78 N’ụbọchị nke iri na abụọ, Ahaịra+ nwa Inan, onyeisi ụmụ Naftalaị,
79 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+
80 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya;
81 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+
82 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+
83 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Ahaịra+ nwa Inan nyere.
84 Ihe ndị a bụ onyinye ndị isi ndị Izrel nyere maka inyefe+ Chineke ebe ịchụàjà ahụ mgbe e tere ya mmanụ: efere ọlaọcha iri na abụọ, ọkwá ọlaọcha iri na abụọ, iko ọlaedo iri na abụọ;+
85 efere ọlaọcha nke ọ bụla dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ, ọkwá nke ọ bụla dị shekel iri asaa n’arọ, ọlaọcha niile ahụ dị puku shekel abụọ na narị anọ (2,400), ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha.
86 Iko ọlaedo iri na abụọ ndị insens juru n’ime ha dị shekel iri shekel iri n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ tụọ ha. Ọlaedo niile ahụ dị otu narị shekel na iri abụọ (120).
87 Anụ niile a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ dị oké ehi iri na abụọ, ebule iri na abụọ, ụmụ ebule iri na abụọ ndị gbara otu afọ otu afọ na àjà ọka ha na ha na-agakọ, nakwa ụmụ ewu iri na abụọ a ga-eji chụọ àjà mmehie.
88 Anụ niile a ga-eji chụọ àjà udo dị oké ehi iri abụọ na anọ, ebule iri isii, mkpi iri isii, na ụmụ ebule iri isii ndị gbara otu afọ otu afọ. Ọ bụ ihe ndị a bụ onyinye e nyere mgbe a na-enyefe+ Chineke ebe ịchụàjà ahụ, mgbe e techara ya mmanụ.+
89 Mgbe ọ bụla Mosis banyere n’ụlọikwuu nzute ka ya na Chineke* kwuo okwu,+ ọ na-anụ olu si n’elu okwuchi+ igbe ọgbụgba ndụ,* n’agbata cherob abụọ ahụ,+ na-akpanyere ya ụka. Chineke na-agwa ya okwu.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”
^ Ma ọ bụ “obere efere.”
^ Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
^ Na Hibru, “ya.”
^ Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”