Ọnụ Ọgụgụ 20:1-29
20 N’ọnwa nke mbụ, nzukọ Izrel niile batara n’ala ịkpa Zin, ha wee biri na Kedesh.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka Miriam+ nwụrụ, e liekwa ya.
2 Ma e nweghị mmiri nzukọ ahụ ga-aṅụ.+ Ha wee zukọta na-akatọ Mosis na Erọn.
3 Ha nọ na-esesa Mosis okwu,+ sị: “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnne anyị nwụrụ n’ihu Jehova.
4 Gịnị mere unu ji kpọta ọgbakọ Jehova n’ala ịkpa a ka anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ n’ebe a?+
5 Gịnịkwa mere unu ji duru anyị pụta n’Ijipt ka unu kpọbata anyị n’ebe ọjọọ a?+ Ọ bụghị ebe a na-agha mkpụrụ. Osisi fig na vaịn na pomigranet anaghị eme na ya. Mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa.”+
6 Mosis na Erọn wee si n’ihu ọgbakọ ahụ bịa n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, gbuo ikpere n’ala ma kpudo ihu n’ala, ebube Jehova malitekwara ịpụta n’ihu ha.+
7 Jehova wee gwa Mosis, sị:
8 “Were mkpara a, gị na Erọn nwanne gị kpọkọta nzukọ a. Gwanụ nnukwu nkume a okwu n’ihu ha ka ọ gbapụta mmiri. Ị ga-eme ka mmiri si ná nnukwu nkume a gbapụtara ha. Ị ga-enyekwa nzukọ a na anụ ụlọ ha mmiri ka ha ṅụọ.”+
9 Mosis wee were mkpara ahụ n’ihu Jehova,+ otú o nyere ya n’iwu.
10 Mosis na Erọn kpọkọtaziri ọgbakọ ahụ n’ihu nnukwu nkume ahụ. Mosis wee sị ha: “Unu ndị nnupụisi, geenụ ntị! Ànyị ga-esi ná nnukwu nkume a mee ka mmiri gbapụtara unu?”+
11 Mosis wee welie aka kụọ mkpara ya ná nnukwu nkume ahụ ugboro abụọ, nnukwu mmiri amalite ịgbapụta. Nzukọ ahụ na anụ ụlọ ha maliteziri ịṅụ mmiri.+
12 Jehova mechara gwa Mosis na Erọn, sị: “Ebe ọ bụ na unu egosighị na unu nwere okwukwe n’ebe m nọ ma mee ka m dị nsọ n’ihu ndị Izrel, unu agaghị akpọrọ ọgbakọ a banye n’ala m ga-enye ha.”+
13 Mmiri a bụ mmiri Meriba,*+ bụ́ ebe ndị Izrel sesara Jehova okwu, o wee gosi ha na ya dị nsọ.*
14 Mosis wee si na Kedesh zigara eze Ịdọm ndị ozi,+ sị: “Ihe a bụ ihe nwanne gị Izrel+ kwuru, ‘Ị ma nsogbu niile bịaarala anyị.
15 Nna nna anyị hà gara Ijipt,+ anyị wee bie n’Ijipt ọtụtụ afọ.*+ Ndị Ijipt megbukwara anyị na nna nna anyị hà.+
16 N’ikpeazụ, anyị besaara Jehova ákwá,+ ya anụ olu anyị wee zite otu mmụọ ozi+ ma kpọpụta anyị n’Ijipt. Anyị nọ ugbu a na Kedesh, bụ́ obodo dị n’ókè ala gị.
17 Biko, ka anyị si n’ala gị gafere. Anyị agaghị esi n’ebe ị kụrụ ihe ma ọ bụ n’ubi vaịn gị gafere, anyị agaghịkwa aṅụ mmiri si n’olulu mmiri gị. Ọ bụ n’Okporo Ụzọ Eze* ka anyị ga-esi gafere. Anyị agaghị abanye n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe ruo mgbe anyị gafere ala gị.’”+
18 Ma eze Ịdọm sịrị ya: “Esila n’ala anyị gafere. I si na ya gafere, m ga-apụta jiri mma agha lụso gị agha.”
19 Ndị Izrel wee sị ya: “Anyị ga-esi n’okporo ụzọ awara awara gafee. Ọ bụrụ na anyị na anụ ụlọ anyị aṅụọ mmiri gị, anyị ga-akwụ ụgwọ ya.+ E nweghị ihe ọzọ anyị chọrọ ma ọ́ bụghị ka anyị jiri ụkwụ gafere.”+
20 Ma ọ sịrị: “Agafela.”+ Eze Ịdọm wee pụta ka ọ lụso ha agha, ya na ọtụtụ ndị nakwa ndị agha siri ike.
21 Eze Ịdọm ekweghị ka Izrel si n’ala ya gafere. N’ihi ya, Izrel tụgharịrị hapụ ya.+
22 Ndị Izrel, ya bụ, nzukọ Izrel niile, si na Kedesh pụọ ma bịarute n’Ugwu Họọ.+
23 Jehova wee gwa Mosis na Erọn okwu n’Ugwu Họọ, n’akụkụ ókè nke ala Ịdọm, sị:
24 “Erọn ga-anwụ, a ga-elikwa ya otú e liri ndị nna nna ya.+ Ọ gaghị aba n’ala m ga-enye ndị Izrel n’ihi na unu abụọ nupụrụ isi n’iwu m nyere banyere mmiri Meriba.+
25 Kpọrọ Erọn na Elieza nwa ya, kpọgote ha n’Ugwu Họọ.
26 Yipụ Erọn uwe ya,+ chịrịkwa ha yiwe Elieza+ nwa ya. Erọn ga-anwụ n’ebe ahụ.”
27 Mosis mere nnọọ ihe Jehova nyere n’iwu. Ha wee gbagoro n’Ugwu Họọ n’ihu nzukọ ahụ niile.
28 Mosis yipụrụ Erọn uwe ya ma chịrị ha yiwe Elieza nwa ya. Erọn nwụziri n’ebe ahụ n’elu ugwu ahụ.+ Mosis na Elieza wee si n’ugwu ahụ gbadata.
29 Mgbe nzukọ ahụ niile hụrụ na Erọn anwụọla, ụlọ Izrel niile beere Erọn ákwá ụbọchị iri atọ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Meriba pụtara “Esemokwu.”
^ Ma ọ bụ “e wee doo ya nsọ n’ihu ha.”
^ Na Hibru, “ụbọchị.”
^ Ya bụ, okporo ụzọ awara awara.