Ọnụ Ọgụgụ 12:1-16

  • Miriam na Erọn kwujọrọ Mosis (1-3)

    • Mosis dị umeala n’obi karịa mmadụ niile (3)

  • Jehova gbachiteere Mosis (4-8)

  • Ekpenta pụtara Miriam n’ahụ́ (9-16)

12  Miriam na Erọn malitere ikwujọ Mosis n’ihi nwaanyị onye Kush ọ lụrụ, maka na nwaanyị ọ lụrụ bụ onye Kush.+  Ha nọ na-asị: “Ọ̀ bụ naanị Mosis ka Jehova sirila n’ọnụ ya kwuo okwu? Ó sibeghịkwa n’ọnụ anyị kwuo okwu?”+ Jehova nọkwa na-ege ntị.+  Nwoke a bụ́ Mosis dị umeala n’obi karịa mmadụ niile+ nọ n’ụwa.  Jehova gwara Mosis na Erọn na Miriam na mberede, sị: “Unu atọ, gaanụ n’ụlọikwuu nzute.” Ha atọ wee gaa.  Jehova gbadataziri n’ogidi ígwé ojii,+ guzo n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ. O wee kpọọ Erọn na Miriam, ha abụọ agaa nso.  O wee sị ha: “Biko, nụrụnụ okwu m. Ọ bụrụ na e nwere onye amụma Jehova n’ime unu, m ga-esi n’ọhụụ mee ka ọ mata m.+ M ga-agwakwa ya okwu ná nrọ.+  Ma, emeghị m otú ahụ n’ebe Mosis ohu m nọ. Ọ bụ ya ka a na-enyefe ụlọ m niile.*+  M na-agwa ya okwu ihu na ihu,*+ otú doro anya. Anaghị m agwa ya okwu n’ilu. Jehova na-apụtakwa n’ihu ya. Gịnịzi mere na egwu atụghị unu ikwujọ Mosis ohu m?”  Jehova wee wesa ha ezigbo iwe. Ọ pụkwara n’ebe ha nọ. 10  Ígwé ojii ahụ si n’elu ụlọikwuu ahụ pụọ, ma lee, ekpenta pụtara Miriam n’ahụ́, ahụ́ ya achawa ezigbo ọcha.+ Erọn wee lee Miriam anya, ya ahụ na Miriam bụzi onye ekpenta.+ 11  Erọn gwara Mosis ozugbo, sị: “Onyenwe m, m na-arịọ gị, biko, gbaghara anyị mmehie a. Anyị zuzuru nzuzu n’ihe a anyị mere. 12  Biko, ekwela ka ọ dịrị ka onye nwụrụ anwụ, onye ebe ụfọdụ n’ahụ́ ya richara ericha mgbe a mụrụ ya.” 13  Mosis wee malite ịrịọ Jehova, sị: “Biko, Chineke, gwọọ ya, bikonụ.”+ 14  Jehova gwara Mosis, sị: “Ọ bụrụ na nna ya agbụọ ya asọ mmiri n’ihu, ọ̀ bụ na ihere onwe ya agaghị eme ya ruo ụbọchị asaa? Ka e si n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ ya ka ọ nọrọ iche ruo ụbọchị asaa.+ E mechaa, e nwere ike ịkpọbata ya.” 15  E wee si n’ebe ha mara ụlọikwuu kpọpụ Miriam iche ruo ụbọchị asaa.+ Ndị Izrel akwagaghị ebe ọzọ ruo mgbe a kpọbatara Miriam. 16  Ndị Izrel wee si na Hazirọt kwalie.+ Ha malitere ịma ụlọikwuu n’ala ịkpa Peran.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “N’ụlọ m niile, ọ na-egosi na e kwesịrị ịtụkwasị ya obi.”
Na Hibru, “ọnụ na ọnụ.”